Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/01 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite December 10
  • Izu Na-amalite December 17
  • Izu Na-amalite December 24
  • Izu Na-amalite December 31
  • Izu Na-amalite January 7
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 12/01 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite December 10

Abụ nke 205

13 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ To the Ends of the Earth ná nkwadebe maka ntụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke December 24. N’iji aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe, mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi chee (1) Ụlọ Nche nke December 15 na (2) Teta! nke January 8 n’ihu mmadụ.

12 min: “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit.” Okwu. Maa ọkwa ụbọchị mgbakọ sekit na-esonụ. Mmadụ nile kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche iji kpọọ ndị ha na-amụrụ Bible òkù ka ha bịa. Gbaa ndị nkwusa a na-emebeghị baptism ume ichesi echiche ike banyere igosipụta nrara ha raara onwe ha nye Jehova ná mgbakọ na-esonụ. Gbaa mmadụ nile ume ịga nnọkọ abụọ ahụ n’ụbọchị nke ọ bụla.

20 min: “Ngọzi Ndị Na-esite n’Igosi Ekele Maka Ịhụnanya Jehova—Akụkụ nke 2.”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 2-6, kpọọ ọgbakọ ịkọ ahụmahụ ndị na-agba ume bụ́ ndị ha nweworo mgbe ha na-agba àmà mberede, site n’ide akwụkwọ ozi, nakwa site na telifon. Mee ndokwa tupu oge eruo ka e jiri otu ma ọ bụ abụọ n’ime ha mee ihe ngosi.

Abụ nke 222 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 17

Abụ nke 211

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Kọwapụta ndokwa pụrụ iche e mere maka ozi ubi na December 25 na January 1.

22 min: “Na-ekwuzi Okwu Chineke Ekwuzi.”b Gbakwụnye ihe ngosi dị irè nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke dị na paragraf nke 4. Meekwa ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ dị irè nke e jiworo mee ihe n’ógbè unu iji gbaa ndị ọnọdụ ụwa ugbu a na-ewute ume ma ọ bụ iji kasie ha obi. A pụrụ ịkọ otu ahụmahụ dị nkenke. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe mere ha ji chee na iji Bible na-eme ihe ga-eme ka àmà a gbara dị irè karị.

13 min: “Enweghị M Mmasị ná Ndịàmà Jehova.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee, nke dabeere n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 9-10. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enwechaghị mmasị ige ntị n’ihi na anyị bụ Ndịàmà Jehova, gịnị ka anyị pụrụ ikwu? Mee ndokwa tupu oge eruo ka ndị nkwusa kwuo n’okwu nke aka ha nzaghachi ndị a tụrụ aro ha. Mee ihe ngosi otú a pụrụ isi jiri nzaghachi nke ikpeazụ tọọ ntọala maka nkwurịta okwu mgbe a ga-eje nletaghachi.

Abụ nke 225 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 24

Abụ nke 218

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na January na akwụkwọ ndị ọgbakọ nwere. N’iji aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe, mee ihe ngosi abụọ dị mkpirikpi nke ụzọ iche magazin n’ihu mmadụ, a ga-eji Ụlọ Nche nke January 1 mee otu ma jiri Teta! nke January 8 mee nke ọzọ. Mee ka onye ntorobịa mee otu n’ime ha.

10 min: “Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka Afọ 2002.” Okwu onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Gbaa mmadụ nile ume ịdị uchu n’ime ihe omume ha.

25 min: “Ịgba Àmà—Ruo Nsọtụ Nile nke Ụwa.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Gbaa mmadụ nile ume ichesi echiche ike banyere ihe ha pụrụ imekwu iji jiri ozi ọma ahụ gakwuru ndị ọzọ, n’ógbè ha ma ọ bụ n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Zoo aka n’Ozi Alaeze Anyị nke July 2001, peeji nke 4. Na February, anyị ga-atụle vidio bụ́ Noah—He Walked With God. N’ọnọdụ ya, tụlee “Ndị Nlereanya Ọma—Ị̀ Na-erite Uru n’Aka Ha?” Okwu okenye ga-ekwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke July 1, 2000, peeji nke 19-21.

Abụ nke 24 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 31

Abụ nke 140

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka December. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu ga-agbanwe oge nzukọ ya maka afọ ọhụrụ, jiri obiọma gbaa onye ọ bụla ume ịdị na-abịachi anya n’oge ọhụrụ ndị ahụ. Hụ na ndị nile nwere mmasị na onye ọ bụla na-adịghị ejekwa ozi maara banyere mgbanwe ndị ahụ.

15 min: Na-enye Ndị Okenye Nsọpụrụ Ruuru Ha. Ndị ohu na-eje ozi abụọ ma ọ bụ atọ atụlee Ụlọ Nche nke June 1, 1999, peeji nke 18-19. Ha ekwuo banyere ọtụtụ ọrụ ndị okenye na-aghaghị ịrụ, gụnyere ọrụ ego, ibu ọrụ ezinụlọ, na ọrụ ọchịchị Chineke. Tụlee ụzọ mmadụ nile pụrụ isi na-agba ha ume, na-ebelata ibu ha, na-agbasokwa nduzi ha. Ndị ohu na-eje ozi ahụ ekweta na ndị okenye na-eje ozi bara uru ma bụrụ ndị e kwesịrị ‘ịsọpụrụ gabiga ókè nke ukwuu.’—1 Tesa. 5:12, 13.

22 min: “Zụlite Ikike Nghọta Gị.”c Okenye eduzie ntụleghachi na-ekpo ọkụ nke usoro ihe omume mgbakọ pụrụ iche gara aga.

Abụ nke 195 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 7

Abụ nke 20

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

20 min: Jiri Ndụ Gị Mee Ihe Kasị Mma. Ndị òtù ezinụlọ atụlee Ụlọ Nche nke August 15, 1998, peeji nke 8-9. Nna chọrọ ka ezinụlọ ahụ gbasoo ụzọ nke ga-ewetara ha ọṅụ kama iwetara ha mmechuihu. Ha atụlee ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ dị n’isiokwu ahụ bụ́ nke na-egosi otú ha pụrụ isi nọgide na-enwe obi ụtọ, na-elekwasị anya ná mkpa nke inwe nghọta, ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ, na ịtụkwasị Jehova obi. Ha ekwuo mgbanwe ndị dị irè ha pụrụ ime dị ka ezinụlọ.

15 min: Ileru Ụlọ Nzukọ Alaeze Anyị Anya. Okwu okenye ga-ekwu. Rịba ama ọnọdụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nọ na ya. Olee atụmatụ ndị a na-eme maka idebe ebe nile ọcha tupu oge Ememe Ncheta? Olee ihe ndị ọ dị mkpa ka a rụzie tupu mgbe ahụ? Kọwaa otú ọgbakọ pụrụ isi nye aka. Mesie ike mkpa ọ dị ịhụ na ebe anyị na-anọ efe ofufe na-egosipụta ịma mma na ịdị ùgwù anyị ji mara Jehova.—Ọma 84:1.

Abụ nke 126 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya