Ọrụ nke Chọrọ Ịdị Umeala n’Obi
1 Okwu Chineke na-adụ anyị ọdụ ka anyị “na-adị umeala n’obi, ghara ịkwụghachi ihe ọjọọ maka ihe ọjọọ, . . . kama, n’ụzọ dị iche, na-agọzi agọzi.” (1 Pita 3:8, 9) N’ezie, ndụmọdụ ahụ metụtakwara ọrụ ime nkwusa. N’ezie, ozi Ndị Kraịst pụrụ ịbụ ule nke ịdị umeala n’obi anyị.
2 Ịdị umeala n’obi bụ àgwà nke na-enyere anyị aka ịtachi obi n’ọnọdụ ndị na-adịghị mma. Mgbe anyị na-eme nkwusa, anyị na-ejekwuru ndị anyị na-amabughị, n’echereghị ka ha kpọọ anyị, na-eburu n’uche na ụfọdụ ga-emeghachi omume n’ụzọ na-adịghị mma. Ịnọgide na-eme nkwusa n’agbanyeghị mmeso dị otú ahụ chọrọ ịdị umeala n’obi. N’otu ókèala nke siri nnọọ ike ime nkwusa, ụmụnna nwanyị abụọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ nọ na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ kwa ụbọchị ruo afọ abụọ n’enweghị onye ọ bụla nabatara ha iso ha kwurịta okwu! Otú ọ dị, ha tachiri obi, taakwa e nwere ọgbakọ abụọ n’ógbè ahụ.
3 Ime Ihe Banyere Àgwà Ọjọọ: Ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka iṅomi Jizọs mgbe ndị ọzọ mesoro anyị omume n’ụzọ na-adịghị mma ma ọ bụ n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù. (1 Pita 2:21-23) A kparịrị otu nwanna nwanyị n’otu ụlọ, nwunye nwoke ahụ bu ụzọ kparịa ya, e mesịakwa di ya, bụ́ onye nyere ya iwu ka o si n’ebe obibi ha pụọ. Nanị ihe nwanna nwanyị ahụ mere bụ ịmụmụ ọnụ ọchị ma gwa ha na ya nwere olileanya ịgwa ha okwu n’oge ọzọ. Nke a masịrị di na nwunye ahụ nke na ha gere Onyeàmà ọzọ bịara n’ụlọ ha ntị ma nakwere òkù a kpọrọ ha ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nwanna nwanyị mbụ ahụ ha chụpụrụ gakwara kelee ha ma gbakwuoro ha àmà. Anyị onwe anyị kwa pụrụ ime ka obi nke ndị na-achọghị ige ntị dajụọ site n’igosi “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi.”—1 Pita 3:15; Ilu 25:15.
4 Zere Mpako: Ihe ọmụma Bible anyị nwere abụghị ihe mere anyị ga-eji na-eleda ndị mmadụ anya, ma ọ bụ jiri okwu ndị na-eweda mmadụ ala na-ezo aka n’ebe ha nọ. (Jọn 7:49) Kama nke ahụ, Okwu Chineke na-adụ anyị ọdụ ka anyị “[ghara] ikwu okwu ọjọọ banyere onye ọ bụla.” (Taị. 3:2) Mgbe anyị nwere obi dị nwayọọ, dị ka Jizọs nwere, anyị ga-eme ka ndị ọzọ nwee ume ọhụrụ. (Mat. 11:28, 29) Ime ihe n’ụzọ ịdị umeala n’obi na-eme ka ozi anyị bụrụ nke na-adọrọkwu adọrọ.
5 Ee, ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka ịtachi obi n’ókèala siri ike. Ọ pụrụ ime ka obi nke ndị na-achọghị ige ntị dajụọ, ma na-adọta ndị ọzọ n’ebe ozi Alaeze ahụ dị. Karịsịa, ọ na-atọ Jehova ụtọ, bụ́ onye “na-egosi ndị dị umeala obiọma na-erughịrị mmadụ.”—1 Pita 5:5.