Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite January 13
Abụ nke 69
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke January 15 na Teta! nke February 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke February 8 jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya.
15 min: Tụlee “Usoro Ihe Omume Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze Na-aga n’Ihu.”
15 min: “Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Anyị.”a Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 3, gbaa otu onye toruworo ogo mmadụ nke na-akatabeghị ahụ́ ma ọ bụ otu onye nọ n’afọ iri na ụma e mere baptizim ajụjụ ọnụ ná mkpirikpi. Olee ihe ịma aka ndị o cheworo ihu kemgbe e mechara ya baptizim? Gịnị nyeere ya aka imeri ihe ịma aka ndị ahụ? Olee otú o siworo rite uru site n’ịrara ndụ ya nye Jehova?
Abụ nke 22 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 20
Abụ nke 44
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: Ị̀ Na-enyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị? Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Gbaa mmadụ nile ume iji Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2003 na-eme ihe nke ọma. Tụlee ihe e kwuru n’okwu mmalite, peeji nke 3-4. Tụọ aro otú ezinụlọ pụrụ isi na-atụlekọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị ọnụ. Iji gosi uru ndị dị n’ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị kwa ụbọchị, tụlee ihe atụ abụọ ma ọ bụ atọ nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị na nkọwa ha bụ́ ndị a ga-atụle n’ọnwa na-esonụ. Meekwa ihe ngosi dị mkpirikpi ebe di na nwunye na-atụlekọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke taa na nkọwa ya ọnụ.
22 min: “Kụziere Ndị Ọzọ Asụsụ ahụ Dị Ọcha.”b Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 6, mee ka otu onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi nke ụzọ isi malite ọmụmụ Bible n’ọnụ ụzọ ụlọ mgbe a gara nletaghachi, na-eji otu n’ime ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002, peeji nke 4, eme ihe. Gụnye ntụle nke otu paragraf site na broshuọ Na-achọ. Mee ka onye nkwusa ahụ mechie ọmụmụ ihe ahụ site n’ịjụ otu ajụjụ na paragraf nke na-esonụ ma mee ndokwa ịza ya mgbe ọzọ ọ ga-abịa. Gbaa mmadụ nile ume ịtụle ma ọ̀ dị onye ọ bụla n’ime ndị ha na-akpọtụrụ nke pụrụ ịdị njikere isi otú a na-amụ Bible.
Abụ nke 68 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 27
Abụ nke 92
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke February 1 na Teta! nke February 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke February 8 jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, mee ka onye nkwusa ahụ mechie site n’inyefe onye nwe ụlọ traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible?—inyefe ya onye na-anaraghị magazin ndị ahụ na onye naara ha. Kọwaa ná mkpirikpi otú anyị pụrụ isi laghachi na nke ndị anyị nyere magazin mgbe anyị hapụụrụ ha traktị ahụ.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke August 2002, peeji nke 4, paragraf nke 10.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
15 min: Jiri Akwụkwọ Ihe Ọmụma Na-amalite Ọmụmụ Ihe. N’ọnwa February anyị ga-achọ ime mgbalị pụrụ iche iji malite ọmụmụ Bible ebe obibi. Gbaa otu onye nkwusa ajụjụ ọnụ bụ́ onye malitere otu ọmụmụ ihe na nso nso a n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, na-akọwa otú o si nwee ike ime nke a. Chetara onye ọ bụla “Aro Dị Iche Iche Maka Ụzọ Isi Na-eche Akwụkwọ Ihe Ọmụma n’Ihu Mmadụ” nke dị na peeji nke 5 n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002, meekwa ihe ngosi nke otu ma ọ bụ abụọ n’ime aro ndị ahụ.
Abụ nke 148 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 3
Abụ nke 9
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee Igbe Ajụjụ. Gbaa ndị nkwusa ume ka ha jiri fọm Please Follow Up (S-43) mee ihe mgbe ha zutere ndị na-asụ asụsụ ọzọ. N’ozuzu ya, e kwesịrị iji fọm ahụ mee ihe maka nzube a ọ bụrụgodị na onye ahụ egosighị mmasị n’ozi Alaeze ahụ.
12 min: Ṅomie Okwukwe Ha. Gbaa otu onye okenye ajụjụ ọnụ bụ́ onye jiworo ịdị umeala n’obi na ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ. (Hib. 13:7) Olee otú o si nata eziokwu? Olee ihe mgbochi ndị o meriri iji were nguzo ya? Ndokwa ime mmụọ ma ọ bụ agbamume dịgasị aṅaa nyeere ya aka inwe ọganihu? Gịnị ka o mere iji ruo eru ịbụ onye nlekọta n’ọgbakọ? (1 Tim. 3:1) Gịnị nyewooro ya aka ịhazi ibu ọrụ ya n’ọgbakọ na ọrụ ego ya nakwa ọrụ ndị dịịrị ya n’ezinụlọ? (1 Tim. 5:8) Olee ihe ọ na-eche banyere ihe ùgwù nke inyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka?
18 min: “Ọrụ nke Chọrọ Ịdị Umeala n’Obi.”c Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, gwa ndị na-ege ntị ka ha tụọ aro otú a pụrụ isi meghachi omume ma ọ bụrụ na otu onye n’ókèala agbalịa ịkwa anyị emo ma ọ bụ ịkpaso anyị àgwà ọjọọ, ịrụ ụka, ma ọ bụ wee iwe. Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, webata ihe ndị e kwuru n’Insight, Mpịakọta nke 1, peeji nke 1160, paragraf nke 3.
Abụ nke 133 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.