Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ tụlee ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite na February 24, 2003. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu January 6 ruo February 24, 2003. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.
NKÀ OKWU
1. Eziokwu Ka Ọ̀ Bụ Ụgha: Isi ihe na-eme ka a gụzie ihe agụzie bụ ijide n’aka na ihe a gụpụtara daziri adazi, ọ bụrụgodị na ọ dịtụ iche n’ihe e dere ede. Kọwaa. [be p. 83]
2. Mejuo Oghere Ndị Na-esonụ: Iji gụzie ihe agụzie, mmadụ aghaghị ․․․․․․․․, ․․․․․․․․, ․․․․․․․․ gụpụtakwa ya agụpụta. [be p. 85]
3. Gịnị mere o ji dị mkpa ikwu okwu n’ụzọ doro anya? (1 Kọr. 14:8, 9) [be p. 86]
4. Olee ụfọdụ ihe ndị pụrụ ime ka okwu ghara ido anya, gịnịkwa ka anyị pụrụ ime iji kwuo okwu n’ụzọ doro anya karị? [be p. 87-88]
5. Olee okwu ụfọdụ e ji mee ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’ime ọnwa abụọ gara aga bụ́ ndị i chere na ha dị gị mkpa ịmụ ịkpọzi ha akpọzi? [be p. 92]
IHE OMUME NKE 1
6. Eziokwu Ka Ọ̀ Bụ Ụgha: Anya anyị pụrụ inyere anyị aka ige ntị. Kọwaa. [be p. 14]
7. Mejuo Oghere Ndị Na-esonụ: Ahụmahụ Pọl nwere n’ụzọ Damaskọs gosipụtara n’ụzọ obi abụọ na-adịghị ya na ․․․․․․․․ bụ ․․․․․․․․ ma ọ bụ ․․․․․․․․ ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ onye ga-achị n’Alaeze ahụ e kwere ná nkwa, n’ọdịnihu. [w01 4/1 p. 5 para. 5]
8. Mejuo Oghere Ndị Na-esonụ: Pọl ritere uru site n’ozi ọma ahụ n’ihi na o ji ․․․․․․․․ gbahapụ ihe nọ na-adọpụ ya site n’ebe Chineke nọ, o jikwa ․․․․․․․․ chụsoo ihe mgbaru ọsọ ndị ha na nzube Chineke kwekọrọ. [w01 4/1 p. 6 para. 4]
9. Olee otú ihe atụ Hana, Mak, na Ịlaịja pụrụ isi nyere anyị aka ịnagide nkụda mmụọ? Olee otú anyị pụrụ isi jiri ihe atụ ndị a nyere ndị ọzọ aka? [w01 2/1 p. 20-23]
10. Olee otú nghọta banyere egwuregwu ndị oge ochie si eme ka a ghọta nnọọ amaokwu ụfọdụ nke Bible? Oleekwa otú ihe ọmụma a kwesịrị isi metụta ndụ anyị? [w01 1/1 p. 28-31]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Eziokwu Ka Ọ̀ Bụ Ụgha: Ebe ọ bụ na e guzobere Alaeze Chineke n’eluigwe na 1914, o kwesịghịzi ekwesị ikpe ekpere, sị, “Ka alaeze gị bịa.” (Mat. 6:10) Kọwaa. [be p. 279; w96 6/1 p. 31]
12. Eziokwu Ka Ọ̀ Bụ Ụgha: Okwu Jizọs ndị e dekọrọ na Matiu 11:24 pụtara na a ga-esi n’ọnwụ kpọlite ndị ahụ Jehova ji ọkụ bibie na Sọdọm na Gọmọra. Kọwaa.
13. Họrọ Azịza Ndị Ziri Ezi: Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, nke Jizọs kpọtụrụ aha na Matiu 24:45-47 bụ (a) Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova; (b) ìgwè Ndị Kraịst nile e tere mmanụ nọ n’elu ala n’oge ọ bụla; (ch) Jizọs Kraịst n’onwe ya. Ohu a na-enye “ezinụlọ” ahụ, bụ́ nke na-anọchite anya (a) ndị e tere mmanụ n’otu n’otu; (b) atụrụ ọzọ ahụ; (ch) ndị nile na-agụ akwụkwọ Ndị Kraịst; nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị. Nna ukwu ahụ mere ohu ahụ onye na-elekọta ihe nile o nwere n’afọ (a) 1914; (b) 33 O.A.; (ch) 1919.
14. Họrọ Azịza Ndị Ziri Ezi: Ụgbụ ahụ e kwuru banyere ya n’ihe atụ Jizọs nke dị na Matiu 13:47-50 agụnyewo ma ọgbakọ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ ma (a) Alaeze Mezaịa nke Chineke; (b) ndị enyi ha bụ́ atụrụ ọzọ ahụ; (ch) Krisendọm.
15. Dị ka okwu Jizọs ndị e dekọrọ na Matiu 5:24 si kwuo, gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị chọpụta na i mejọwo onye ofufe ibe gị? [g96 2/8 p. 24-25]