IHE ỌMỤMỤ NKE 3
Ịkpọzi Okwu Akpọzi
Ọ BỤGHỊ Ndị Kraịst nile gụrụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ụwa ruo ọtụtụ afọ. A kọwara ọbụna ndịozi bụ́ Pita na Jọn dị ka “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) Otú o sina dị, ọ dị mkpa izere ịdọpụ uche n’eziokwu Bible ị na-ekwu site n’ịkpọhie okwu.
Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche. E nweghị otu ụkpụrụ ịkpọ okwu nke na-achị asụsụ nile. A na-eji mkpụrụ akwụkwọ abịchịị ede ọtụtụ asụsụ. E wezụga mkpụrụ akwụkwọ abịchịị nke Latin, e nwere mkpụrụ akwụkwọ abịchịị ndị dị ka nke Arabic, Cyrillic, Grik, na Hibru. Kama iji mkpụrụ akwụkwọ eme ihe, a na-eji ihe odide ndị ọtụtụ akara pụrụ imejupụta eme ihe n’asụsụ Chinese a na-ede ede. Ihe odide ndị a na-anọchitekarị anya otu okwu ma ọ bụ akụkụ nke otu okwu. Ọ bụ ezie na asụsụ Japanese na Korean na-eji ihe odide Chinese eme ihe, a pụrụ iji ihe odide ndị ahụ mee ihe maka ụda ndị dị nnọọ iche, ha nwekwara ike ha agaghị apụta otu ihe ahụ.
N’asụsụ ndị e ji mkpụrụ akwụkwọ abịchịị ede, ịkpọ okwu otú o kwesịrị na-achọ iji ụda kwesịrị ekwesị eme ihe maka mkpụrụ akwụkwọ ma ọ bụ ìgwè mkpụrụ akwụkwọ ọ bụla. Mgbe asụsụ dị otú ahụ nwere ụkpụrụ ndị na-adịghị agbanwe agbanwe, dị ka ọ dị n’asụsụ Grik, Spanish, na Zulu, ịkpọ okwu n’ụzọ kwesịrị ekwesị adịghị esi oké ike. Otú ọ dị, okwu ndị si mba ọzọ bata n’asụsụ pụrụ ime ka a na-akpọ okwu ụfọdụ n’ụzọ e si akpọ ya n’ebe okwu ndị ahụ sitere. N’ihi ya, a pụrụ inwe ihe karịrị otu ụzọ e si akpọ otu mkpụrụ akwụkwọ ma ọ bụ ìgwè mkpụrụ akwụkwọ ma ọ bụ, mgbe ụfọdụ, a ghara ịkpọ ya akpọ ma ọlị. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka i buru ndị a na-akpọ n’ụdị dị iche n’isi, jirikwa ha na-eme ihe mgbe mgbe ná mkparịta ụka gị. N’asụsụ Chinese, ịkpọ okwu otú kwesịrị ekwesị na-achọ iburu ọtụtụ puku ihe odide n’isi. N’asụsụ ụfọdụ, ihe okwu pụtara na-agbanwe mgbe a gbanwere ụda ya. Elebaraghị akụkụ dị otú a nke asụsụ anya nke ọma pụrụ ime ka e nye echiche na-ezighị ezi.
Ọ bụrụ na ọ bụ nkeji okwu mejupụtara okwu ndị dị n’asụsụ, ọ dị mkpa ka ọ bụrụ nkeji okwu kwesịrị ekwesị ka a ga-emesi ike karị. Ọtụtụ asụsụ ndị nwere ụdị okwu ndị a nwere nkeji na-enwe usoro imesi okwu ike nke na-adịkebeghị agbanwe agbanwe. N’ebe ụkpụrụ a nke imesi nkeji okwu ike na-agaghị adaba, a pụrụ idenye akara ụda olu n’okwu ahụ e dere ede. Nke a na-enye aka ime ka ọ dịtụ mfe ịkpọ okwu n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ụkpụrụ e nwere na-agbanwe agbanwe, ọ na-esi ike karị. Imeta ya nke ọma na-achọ iburu ọtụtụ ihe n’isi.
N’asụsụ ụfọdụ, akara ụda olu bụ otu ihe dị mkpa e kwesịrị ichebara echiche. Ha na-agụnye akara a na-edenye n’elu na n’okpuru mkpụrụ akwụkwọ ụfọdụ, dị ka: è, é, ọ, ṅ, ị̀, í. A pụrụ ide akara ụda olu ede, ma ọ bụ a pụrụ ịtụ anya ka onye na-agụ ihe na-etinye ha na-adabere n’ihe ndị gbara okwu ahụ gburugburu. Ọ bụrụ na ọ bụ onye na-agụ ihe ga-etinye ha, o yikarịrị ka ọ ga-adị mkpa iji nlezianya mee nkwadebe mgbe e kenyere gị ịgụ ihe n’ihu ọha.
N’ihe banyere ịkpọ okwu, e nwere ọnyà ụfọdụ a ga-ezere. Iji nlezianya gabigara ókè na-akpọ okwu pụrụ ime ka o yie ka ị na-agbanwe otú i si ekwu okwu, ọbụna yie ka ị dị mpako. A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere ịkpọ okwu n’ụzọ ọtụtụ ndị na-esikwaghị akpọ ya. Nanị mmetụta ọ ga-enwe bụ ịdọrọ uche gaa n’ebe ọkà okwu nọ. N’aka nke ọzọ, ọ dị mma izere akụkụ nke ọzọ gabigara ókè nke bụ́ ejighị nlezianya na-ekwu okwu ma na-akpọ okwu. A tụlewo ụfọdụ n’ime ihe ndị a n’isiokwu bụ́ “E Kwuru Okwu n’Ụzọ Doro Anya.”
Ụzọ a nakweere isi na-akpọ okwu n’otu asụsụ pụrụ ịdị iche site ná mba ruo ná mba, ọbụna site n’otu akụkụ gaa n’ọzọ ná mba ahụ. Onye si mba ọzọ pụrụ ịsụ asụsụ a na-asụ n’obodo ọ bịara n’ụda olu dị iche. Akwụkwọ ọkọwa okwu dị iche iche pụrụ idepụta ihe karịrị otu ụzọ ziri ezi e si akpọ otu okwu. Karịsịa ma ọ bụrụ na ohere mmadụ nwere ịga ụlọ akwụkwọ ụwa dị nnọọ obere ma ọ bụ ọ bụrụ na asụsụ ọ na-asụ ugbu a abụghị asụsụ ala nna ya, ọ ga-erite uru dị ukwuu site n’ige ndị na-asụ asụsụ obodo ahụ nke ọma ntị wee na-agbaso otú ha sị akpọ okwu. Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị kwesịrị ikwu okwu n’ụzọ ga-eme ka ozi anyị nwee ùgwù nakwa n’ụzọ ndị bi n’ógbè anyị ga-aghọta ngwa ngwa.
Ná mkparịta ụka ị na-enwe kwa ụbọchị, ọ na-akasịkarị mma iji okwu ndị ị maara nke ọma na-eme ihe. N’ọnọdụ dị otú o kwesịrị, ịkpọ okwu agaghị abụ nsogbu ná mkparịta ụka nkịtị. Otú ọ dị, mgbe ị na-agụpụta ihe, ị pụrụ ịhụ okwu ụfọdụ ị na-adịghị eji eme ihe kwa ụbọchị. Ndịàmà Jehova na-agụpụtakwa ihe agụpụta ọtụtụ mgbe. Anyị na-agụrụ ndị mmadụ Bible mgbe anyị na-agbara ha àmà. A na-agwa ụmụnna nwoke ụfọdụ ka ha gụpụta paragraf dị iche iche mgbe a na-enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ma ọ bụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ọ dị mkpa na anyị na-agụzi ihe agụzi nakwa na anyị adịghị adọpụ uche n’ihe a na-ekwu site n’ịkpọhie okwu.
Ọ̀ na-esiri gị ike ịkpọ ahaaka ụfọdụ dị na Bible? N’asụsụ Bekee, akara imesi okwu ike na-esochi nkeji okwu e kwesịrị imesi ike karị. Ọ bụrụ na ọ bụ ụdaume bụ ihe ikpeazụ dị ná nkeji okwu nke nwere akara imesi okwu ike, mgbe ahụ a na-adọ ụdaume ahụ adọ ma a na-akpọ ya. Ọ bụrụ na ọ bụ mgbochiume bụ ihe ikpeazụ dị ná nkeji okwu, mgbe ahụ a dịghị adọ ụdaume nke dị ná nkeji okwu ahụ adọ. Mgbe ụdaume abụọ bụ́ a na i bịakọtara ọnụ, dị ka na Morʹde·cai na Siʹnai, a na-akpọ ai dị ka e si akpọ aị n’Igbo. N’asụsụ Bekee kwa, e wezụga n’aha ahụ bụ́ Rachel, a na-akpọ mkpụrụ akwụkwọ gbara mkpị bụ́ ch n’ụda k, dị ka na Mel·chizʹe·dek, nke a na-akpọ Melkizedek n’Igbo.
Ụzọ Isi Meziwanye Ihe. Ọtụtụ ndị bụ́ ndị nwere nsogbu n’ịkpọ okwu amaghị na ha nwere ya. Ọ bụrụ na onye nlekọta ụlọ akwụkwọ unu ekwuo akụkụ ụfọdụ nke ịkpọ okwu gị bụ́ ndị chọrọ nlebara anya, nwee ekele maka obiọma ya. Ozugbo ị matara ihe bụ́ nsogbu, olee otú ị pụrụ isi meziwanye ihe?
Nke mbụ, mgbe e kenyere gị ihe omume ịgụpụta ihe, wepụta oge gụọ ya ugboro ugboro. Kanye ihe n’okwu ndị siiri gị ike ịkpọ. Ọ bụrụ na i nwere ezigbo akwụkwọ ọkọwa okwu nke na-egosi otú e si akpọ okwu, jiri ya mee ihe. Akwụkwọ ọkọwa okwu ga-egosi otú a ga-esi kpọọ ụdaume n’okwu ọ bụla. Mgbe ụfọdụ, a pụrụ inwe ihe karịrị otu ụzọ nke isi kpọọ okwu, na-adabere n’akara ụdaume e ji mee ihe. Okwu ọ bụla i lere, kpọpụta ya ugboro ugboro tupu i mechie akwụkwọ ọkọwa okwu ahụ.
Ụzọ nke abụọ a pụrụ isi meziwanye ụzọ e si akpọ okwu bụ ịgụ ihe ka onye ọzọ nụ—onye na-akpọ okwu nke ọma—na ịgwa ya ka ọ gbazie gị n’ebe ndị ị kpọhiere.
Ụzọ nke atọ nke isi meziwanye otú e si akpọ okwu bụ ige ndị bụ́ ezigbo ndị ọkà okwu ntị nke ọma. Ọ bụrụ na e nwere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ma ọ bụ magazin Ụlọ Nche na Teta! ndị dị na kaseeti a na-ege ege, jiri ha mee ihe nke ọma. Ka ị na-ege ha, rịba ama okwu ndị a na-akpọ n’ụzọ dị iche n’otú ị ga-esi kpọọ ha. Detuo ha, ma mụgharịa ha. Ka oge na-aga, ịkpọhie okwu agaghịzi na-emebisị okwu gị, nke a ga-emekwa ka ikwu okwu gị ka nnọọ mma.