Ndị Nwere Nkwarụ—Ma Bụrụ Ndị Na-arụpụta Ihe
1 Ọ bụrụ na i so n’ọtụtụ Ndịàmà Jehova nwere nkwarụ, ị ka pụrụ ịdị na-arụpụta ihe n’ozi. N’ezie, ọnọdụ gị pụrụ ime ka i nwee ohere pụrụ iche iji gbaa àmà ma gbaa ndị ọzọ ume.
2 Ịgba Àmà: Ọtụtụ ndị nwere nkwarụ na-ekere òkè zuru ezu n’ozi ahụ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwanyị nke ahụ́ a wara ya mere ka ọ ghara inwe ike ịga ije na ikwu okwu nke ọma, chọpụtara na ya pụrụ ikere òkè n’ọrụ ikesa magazin ma ọ bụrụ na di ya adọba ụgbọala ha n’ebe ọtụtụ mmadụ si agafe. N’otu oge, o nyefere magazin 80 n’ime nanị awa abụọ! Ọnọdụ pụrụ iche ị nọ na ya pụkwara ime ka i zute ndị gaara esiri gị ike izute ma a sị na ị nọghị n’ọnọdụ ahụ. Ọ bụrụ otú ahụ, were ha dị ka ókèala pụrụ iche i nwere.
3 Ọrụ nkwusa gị pụrụ ịdị nnọọ irè! Ka ndị ọzọ na-ahụ mkpebi siri ike i mere na mmetụta dị mma eziokwu Bible nweworo ná ndụ gị, ha pụrụ inwe mmasị n’ozi Alaeze ahụ. Ọzọkwa, mgbe i zutere ndị nọ ná nsogbu, ahụmahụ i nwere ná ndụ pụrụ ịkwadebe gị inye ha nkasi obi sitere n’Okwu Chineke.—2 Kọr. 1:4.
4 Wusikwuo Ndị Ọzọ Ike: Ọ̀ bụ na i nwetaghị agbamume site n’akụkọ ndụ Laurel Nisbet, bụ́ onye e tinyere n’ígwè na-enye aka iku ume ruo afọ 37, n’agbanyeghị nke ahụ, ya enyere mmadụ 17 aka ịbịaru ezi ihe ọmụma nke eziokwu Bible? N’otu aka ahụ, ihe nlereanya gị pụrụ ịkpali ndị kwere ekwe ibe gị ịgbasi mbọ ike n’ozi Jehova.—w01-IB 9/15, peeji nke 17, para. nke 10.
5 Ọ bụrụgodị na ọnọdụ gị na-egbochi gị ịga ozi ubi ruo ókè ị gaara enwe mmasị ịga, ị ka pụrụ iwusikwu ndị ọzọ ike. Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “Amụtawo m na ọbụna onye nwere nkwarụ dị oké njọ pụrụ inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ dị ukwuu. Mụ na nwunye m enyewo ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ anyị nkwado n’ụzọ ụfọdụ. N’ihi ọnọdụ anyị, anyị na-anọ ya mgbe ọ bụla ha chọrọ anyị.” Otú ọ dị, n’ihi nkwarụ i nwere, o kwere nghọta na ọ bụghị mgbe nile ka ị ga-enwe ike ime ihe ruo ókè ọ na-anụru gị ọkụ n’obi. N’agbanyeghị nke ahụ, site n’inweta enyemaka ụfọdụ, ị pụrụ inwe ike ịdị na-ekerechi òkè anya n’ozi. Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ka e nyere gị aka n’ụzọ ụfọdụ, alala azụ ime ka ndị okenye ma ọ bụ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị pụrụ inyere gị aka, mara.
6 Jehova na-ahụ ihe nile ị na-eme iji na-ejere ya ozi, ọ na-enwekwa obi ụtọ n’ozi i ji mkpụrụ obi gị dum na-ejere ya. (Ọma 139:1-4) Ka ị na-adabere n’ebe ọ nọ, ọ pụrụ inye gị ike iji na-eje ozi nwere nzube ma na-arụpụta ihe na ya.—2 Kọr. 12:7-10.