Yikwasịnụ Onwe Unu Ịdị Umeala n’Obi
1 Otu nwa okoro bụ́ onye ọzụzụ atụrụ atụkwasị Jehova obi ma merie onye agha bụ́ dike. (1 Sam. 17:45-47) Otu nwoke bụ́ ọgaranya ejiri ndidi nagide ọdachi. (Job 1:20-22; 2:9, 10) Ọkpara Chineke ewegara Nna ya otuto nile ọ na-enweta n’ihi ozizi ya. (Jọn 7:15-18; 8:28) Na nke ọ bụla n’ime ihe atụ ndị a, ịdị umeala n’obi keere òkè bụ́ isi. N’otu aka ahụ taa, ịdị umeala n’obi dị oké mkpa n’ọnọdụ ndị anyị na-eche ihu.—Kọl. 3:12.
2 Mgbe Anyị Na-eme Nkwusa: Dị ka ndị ozi bụ́ Ndị Kraịst, anyị na-eji obi umeala ekwusara ụdị mmadụ nile ozi ọma, n’enweghị echiche na-ezighị ezi banyere ha n’ihi agbụrụ ha, ọdịbendị ha, ma ọ bụ ebe a zụlitere ha. (1 Kọr. 9:22, 23) Ọ bụrụ na ụfọdụ ndị enweghị nsọpụrụ ma ọ bụ jiri mpako na-ajụ ozi Alaeze ahụ, anyị adịghị emeso ha ihe otú ha si emeso anyị, kama anyị na-eji ndidi anọgide na-achọ ndị kwesịrị ekwesị. (Mat. 10:11, 14) Kama ịnwa iji amamihe ma ọ bụ agụmakwụkwọ anyị na-eme ka ndị ọzọ nwee mmasị, anyị na-adọrọ uche ha gaa n’Okwu Chineke, na-amata na ọ ga-eme ka ha kwenye karịa ihe ọ bụla anyị pụrụ ikwu. (1 Kọr. 2:1-5; Hib. 4:12) N’iṅomi Jizọs, anyị na-enye Jehova otuto nile.—Mak 10:17, 18.
3 N’ọgbakọ: Ndị Kraịst aghaghịkwa ‘iwere ịdị nwayọọ n’obi kee onwe ha n’ebe ibe ha nọ.’ (1 Pita 5:5) Ọ bụrụ na anyị ewere ndị ọzọ dị ka ndị ka anyị mma, anyị ga na-achọ ụzọ ndị anyị ga-esi na-ejere ụmụnna anyị ozi kama ịtụ anya ka ha na-ejere anyị ozi. (Jọn 13:12-17; Fil. 2:3, 4) Anyị agaghị eche na anyị akarịala ịrụ ọrụ ndị dị ka ihicha Ụlọ Nzukọ Alaeze.
4 Ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka ‘ịnagiderịta ibe anyị n’ịhụnanya’ ma si otú ahụ na-akwalite udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ. (Efe. 4:1-3) Ọ na-enyere anyị aka ịnọ n’okpuru ndị a họpụtara idu ndu. (Hib. 13:17) Ọ na-akpali anyị ịnabata ndụmọdụ ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị ọ bụla a pụrụ inye anyị. (Ọma 141:5) Ịdị umeala n’obi na-akwalikwa anyị ịdabere n’ebe Jehova nọ mgbe anyị na-ahụ maka ihe ùgwù ọ bụla anyị pụrụ inweta n’ọgbakọ. (1 Pita 4:11) Dị ka Devid, anyị na-aghọta na inwe ihe ịga nke ọma na-adabere ná ngọzi Chineke, ọ bụghị n’ike mmadụ.—1 Sam. 17:37.
5 N’ihu Chineke Anyị: Karịsịa, ọ dị mkpa ka anyị ‘wedaa onwe anyị ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke.’ (1 Pita 5:6) Ọ bụrụ na anyị aghaghị ịgba mgba megide ọnọdụ ndị tara akpụ, anyị pụrụ ịtụsi anya ike maka ahụ́ iru ala nke Alaeze ahụ ga-eweta. Ma anyị na-eji obi umeala na-enwe ndidi, na-echere ka Jehova mezuo nkwa ya n’oge ọ kara aka. (Jes. 5:7-11) Dị ka ọ dịịrị n’ebe Job, bụ́ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe, nọ, ihe dị anyị mkpa karịsịa bụ ka “aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi.”—Job 1:21.
6 Daniel onye amụma ‘wedara onwe ya n’ala n’ihu Chineke ya,’ e jikwa ihu ọma Chineke na ọtụtụ ihe ùgwù ndị magburu onwe ha gọzie ya. (Dan. 10:11, 12) N’otu aka ahụ, ka anyị yikwasị onwe anyị ịdị umeala n’obi, na-amara na “ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, nsọpụrụ, na ndụ.”—Ilu 22:4.