Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
IHE ỊRỊBA AMA: Ozi Alaeze Anyị ga-enwe usoro ihe omume Nzukọ Ije Ozi maka izu ọ bụla n’oge mgbakọ. Ọgbakọ dị iche iche pụrụ ime mgbanwe dị ka o si dị mkpa iji nye ohere maka ịga Mgbakọ Distrikti “Nye Chineke Otuto.” N’ebe o kwesịrị ekwesị, jirinụ minit 15 ná Nzukọ Ije Ozi ikpeazụ unu ga-enwe tupu unu agawa mgbakọ tụleghachi ndụmọdụ ndị dị mkpa, ndị sitere n’ihe ntinye nke ọnwa a, bụ́ ndị metụtara ọgbakọ unu. N’ọnwa February 2004, a ga-eme ndokwa iji otu Nzukọ Ije Ozi dum tụleghachi isi ihe ndị e kwuru ná mgbakọ. Iji kwadebe maka ntụle ahụ, anyị nile pụrụ idetu ihe ndị dị mkpa ná mgbakọ ahụ, tinyere isi ihe ụfọdụ kpọmkwem ndị anyị ga-achọ iji mee ihe ná ndụ anyị nakwa n’ozi ubi. Mgbe ahụ anyị pụrụ ịgba ndị ọzọ ume site n’ịkọwa otú anyị siworo jiri aro ndị ahụ mee ihe kemgbe anyị gasịrị mgbakọ ahụ.
Izu Na-amalite September 8
Abụ nke 10
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ kwekọrọ n’ọnọdụ ndị e nwere n’ókèala ọgbakọ unu nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke September 15 na Teta! nke October 8. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe nwa akwụkwọ ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna na-agbara onye nkụzi àmà.
10 min: Akwụkwọ Ozi Si n’Alaka Ụlọ Ọrụ. Mkparịta ụka n’etiti onye bụworo onye nkwusa ruo ogologo oge, ọ ga-akasị mma ma ọ bụrụ okenye, na onye nkwusa na-anọrubeghị ogologo oge ka ya. Onye ahụ na-abụbeghị onye nkwusa ruo ogologo oge ka ya ajụọ onye nkwusa ahụ nwere ahụmahụ ma ọ̀ hụwo akwụkwọ ozi ahụ si n’alaka ụlọ ọrụ nke dị n’Ozi Alaeze Anyị. Onye nkwusa ahụ nweworo ahụmahụ akọwaa na akwụkwọ ozi ahụ si n’alaka ụlọ ọrụ na-apụtabu n’Ozi Alaeze Anyị n’afọ ndị 1960 na 1970. Ha atụlezie akwụkwọ ozi ahụ bụ́ nke dị na peeji nke mbụ, na-eme ka isi ihe ndị dị na ya pụta ìhè.
25 min: “Ndị Ntorobịa—Tọọnụ Ezi Ntọala Maka Ọdịnihu.”a Ọ bụ onye okenye ga-eme ya, na-eji ajụjụ ndị e depụtara eme ihe. Mgbe a na-atụle paragraf nke 5, mee ka ọṅụ na ngọzi ndị a na-enweta n’ozi oge nile pụta ìhè.
Abụ nke 170 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 15
Abụ nke 199
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi maka ọkara nke mbụ nke ọnwa September. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Ịgbakọta Ọnụ Iji Nye Jehova Otuto.”b Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Gbaa mmadụ nile ume ịnọ ya ná nnọkọ nke ọ bụla, site n’ụtụtụ Friday ruo n’ehihie Sunday. Mesie ike mkpa ọ dị itinye ihe anyị ga-amụta n’ọrụ kama ịnụ nanị ọnụnụ. Tụlee ihe ịrịba ama ahụ dị n’elu banyere ihe e mere atụmatụ ime n’otu n’ime Nzukọ Ije Ozi nke February 2004, bụ́ mgbe a ga-atụleghachi isi ihe ndị e kwuru ná mgbakọ distrikti. Gbaa mmadụ nile ume idetu ihe ná mgbakọ ahụ.
20 min: “Yikwasịnụ Onwe Unu Ịdị Umeala n’Obi.”c Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha si daba adaba n’ihe a na-atụle.
Abụ nke 58 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 22
Abụ nke 7
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. N’iji aro a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke October 1.
10 min: Gịnị Ka Anyị Rụzuru n’Afọ Gara Aga? Onye nlekọta ije ozi atụleghachi ihe ndị pụtara ìhè n’akụkọ ozi ubi nke ọgbakọ maka afọ ije ozi 2003. Jaa ọgbakọ mma maka ezi ihe ndị a rụzuru.
10 min: “Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Onwe Onye Maka Afọ Ije Ozi Ọhụrụ.”d Iji gosi ọganihu e nwere, ị pụrụ ịjụ ma ọ̀ dị ụfọdụ ndị malitere ịza ajụjụ, ndị malitere iduzi ọmụmụ Bible, ndị malitere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ na nke mbụ ya, ma ọ bụ ndị malitere ọrụ ọsụ ụzọ oge nile n’ime afọ ije ozi gara aga.
15 min: “Bụrụ Ihe Nlereanya n’Ezi Ọrụ.”e Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Mesie ike mkpa ọ dị ịgbaso ndokwa maka ebe obibi bụ́ ndị e meworo maka abamuru anyị. Kọwaa ihe mere o ji dị oké mkpa ka onye ọ bụla kpaa ezi àgwà.
Abụ nke 30 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 29
Abụ nke 194
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi maka ọkara nke abụọ nke ọnwa September. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe n’October.
10 min: “Ịmụ Akwụkwọ Fee Chineke Ofufe.” Okwu onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ga-ekwu. Dọrọ uche gaa n’usoro ọmụmụ ihe. Mgbe a na-atụle paragraf nke anọ, gbakwụnye ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 28, paragraf nke 1, na peeji nke 70.
15 min: “Ndị Nwere Nkwarụ—Ma Bụrụ Ndị Na-arụpụta Ihe.”f Kwuo okwu banyere ụzọ ndị ọzọ pụrụ isi nye aka, bụ́ nke dabeere na Teta! (Bekee) nke August 22, 1990, peeji nke 22-23, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “What Can Be Done?” (Gịnị Ka A Pụrụ Ime?)
15 min: “Uwe A Haziri nke Ọma Na-egosi na Anyị Na-asọpụrụ Chineke.”g Ọ bụ onye okenye ga-eme ya. Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Mee ka otu nwanna nwoke maara agụ ihe nke ọma gụpụta paragraf nke ọ bụla n’olu dara ụda.
Abụ nke 132 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 6
Abụ nke 170
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. N’ọnwa a, anyị na-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible. Tụlee n’ụzọ dị nkenke Ozi Alaeze Anyị nke May 2002, peeji nke 1, paragraf nke 1.
15 min: “Jide n’Aka na I Butere Ihe Ndị Mbụ Ụzọ!” Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke September 1, 1998, peeji nke 19-21. Kwuo ụbọchị ndị a ga-eme ihe omume ọchịchị Chineke ndị e mere atụmatụ maka ha n’ọnwa ndị na-abịa n’ihu, gbaakwa mmadụ nile ume ịkanye ụbọchị ndị a na kalenda ha. Jụọ ndị na-ege ntị ihe ndị ha na-eme iji hụ na ha ritere uru ná ndokwa ime mmụọ ndị e mere.
20 min: Iguzogide Nrụgide Ndị Ọgbọ. Gbaa onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, bụ́ onye a zụlitere n’ezinụlọ Ndị Kraịst, ajụjụ ọnụ. Zoo aka n’isi ihe ndị a họtara n’Ụlọ Nche nke February 15, 2003. Nrụgide dị aṅaa ka nwanna nwoke ahụ nwetara n’ụlọ akwụkwọ? (p. 24 para. 2; p. 25 para. 4-5) Ndị ọzọ hà nwere mmetụta na-adịghị mma n’ahụ́ ya? (p. 26 para. 4-6) Ọ̀ ka na-enwe nrụgide ugbu a o merela okenye? Gịnị nyewooro ya aka iguzogide nrụgide nke iso ndị ọzọ na-eme otú ha si eme? N’okwu mmechi dị mkpirikpi bụ́ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke August 1, 1999, peeji nke 24-25, mee ka abamuru nke inwe mkpakọrịta dị mma pụta ìhè.
Abụ nke 26 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
f Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
g Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.