Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/04 p. 3
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 1/04 p. 3

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na January: Akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu 1988 nke ọgbakọ pụrụ inwe. Ọ bụrụ na unu enweghị nke ọ bụla n’ime ndị a, biko chọpụtanụ ma ọgbakọ ndị dị unu nso hà nwere akwụkwọ ndị ahụ meworo ochie karị, ndị unu pụrụ iji mee ihe. Ọgbakọ ndị na-enweghị akwụkwọ ndị meworo ochie karị pụrụ inyefe Mankind’s Search for God. February: Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na unu enweghị akwụkwọ a, unu pụrụ iji Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! mee ihe n’ọnọdụ ya. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. Ọ bụrụ na ndị mmadụ e nweelarị akwụkwọ a, a pụrụ inyefe Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! April: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, gụnye ndị bịara Ememe Ncheta na ihe omume ndị ọzọ nke ọchịchị Chineke bụ́ ndị na-adịghị eso ọgbakọ akpachi anya. Lekwasị anya n’inyefe akwụkwọ Fee Chineke Ofufe. E kwesịrị ịgbalịsi ike ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi, karịsịa ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị amụworị akwụkwọ Ihe Ọmụma na broshuọ Na-achọ.

◼ Malite n’izu nke March 15, 2004, anyị ga-amụ Bịaruo Jehova Nso n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.

◼ Malite na February, n’agafeghịkwa March 7, isiokwu nke okwu ihu ọha ọhụrụ ndị nlekọta sekit ga na-ekwu ga-abụ “Ụkpụrụ Ònye Ka Ị Na-eji Akpọrọ Ihe?”

◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa ndị kwesịrị ekwesị iji mee Ememe Ncheta nke afọ a na Sunday, April 4, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na okwu pụrụ ịmalite n’oge karị, mbugharị nke ihe nnọchianya ndị ahụ ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Ebe ọ na-adịghị nzukọ ọzọ a ga-enwe n’ụbọchị ahụ ma e wezụga nzukọ maka ozi ubi, e kwesịrị ime nhazigharị ndị kwesịrị ekwesị ka e duzie Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’oge ọzọ. Ọ ga-adị mkpa ka ndị nlekọta sekit megharịa usoro ihe omume ha maka nzukọ n’izu ahụ dị ka ọnọdụ ọgbakọ si dị. Ọ bụ ezie na ọ ga-adị mma ka ọgbakọ ọ bụla mee Ememe Ncheta nke ya, ọ pụrụ ịbụ na nke a agaghị ekwe omume mgbe nile. N’ebe ihe karịrị otu ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ma eleghị anya otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ihe owuwu ọzọ ha ga-eji mee ihe n’uhuruchi ahụ. N’ebe o kwere omume, anyị na-atụ aro ka e nwee minit 40 ma ọ dịkarịa ala mgbe e mesịrị ihe omume tupu a malite ihe omume ọzọ ka mmadụ nile wee nwee ike irite uru zuru ezu n’ememe ahụ. E kwesịkwara ichebara ọnọdụ ngagharị na ndọwa nke ụgbọala echiche, gụnyere ibusa na iburu ndị mmadụ. Òtù ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-akasị mma n’ógbè ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya