Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enweelarị akwụkwọ a, a pụrụ inyefe Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! April na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ndị pụrụ ịgụnye ndị bịara Ememe Ncheta ma ọ bụ ihe omume ndị ọzọ nke ọchịchị Chineke bụ́ ndị na-adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, lekwasị anya n’inyefe akwụkwọ Fee Chineke Ofufe. E kwesịrị ịgbalịsi ike ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi, karịsịa ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị amụworị akwụkwọ Ihe Ọmụma na broshuọ Na-achọ.
June: Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee broshuọ Na-achọ. Mgbe i ji broshuọ ahụ na-eme ihe, lekwasị anya n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi.
◼ Alaka ụlọ ọrụ adịghị ahụ maka ọda akwụkwọ nke ndị nkwusa n’otu n’otu. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa maka ịma ọkwa kwa ọnwa tupu e zigara alaka ụlọ ọrụ ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị nile nwere mmasị inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị bụ́ ndị a na-emere ọda pụrụ iche.