Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze Na-aga n’Ihu na Nigeria
1. Olee ọrụ a na-arụ n’oge anyị a nke a pụrụ iji tụnyere nke oge Hagaị?
1 “Dị ike, unu ndị nile nke ala nke a, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, rụọnụ ọrụ: n’ihi na Mụ onwe m nọnyeere unu, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta.” (Hag. 2:4) Mgbe mba Izrel si ná ndọrọ n’agha na Babịlọn lọta, e ji okwu ndị a na-enye ume ọhụrụ gbaa ha ume n’owuwu ha na-ewu ụlọ nsọ ha. Ha nwere ọtụtụ ihe owuwu ha ga-ewu, bụ́ ndị ha na-agaraghị ewucha ma ọ bụrụ na Jehova akwadoghị ha. N’otu aka ahụ taa, anyị nwere ọrụ dị ukwuu nke iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’okpuru nduzi Jehova.
2. Olee ihe na-egosi na a na-enwe ọganihu n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria?
2 Afọ anọ agaalarị kemgbe a malitere ndokwa ọhụrụ nke iji Ìgwè Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ihe. È nweela ọganihu? Anyị pụrụ iji olu dara ụda zaa EE! Kemgbe Ìgwè Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke mbụ malitere ọrụ ná mmalite afọ ije ozi 2000, e wuchaala ihe karịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze 600. Lee ka nke ahụ si akpali anyị itiku Jehova mkpu otuto!—Lee chaatị dị na peeji a.
3. Olee otú ụfọdụ ndị siworo meghachi omume n’usoro ihe owuwu a? (Gụnye igbe bụ́ “Okwu Ekele Maka Owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria.”)
3 Ndị mmadụ na-ahụ ọrụ a dị ukwuu a na-arụ. Otu onye na-abụghị Onyeàmà n’Ebonyi State dere, sị: “Ọ ga-amasị m ịja ọgbakọ unu dị ná mba a nakwa n’ụwa nile mma maka ịkwado na iwu ọmarịcha ụlọ dị otú a n’obodo nta anyị. [Nke a] na-egosi na ndị òtù unu adịghị akpa ókè n’ihe banyere agbụrụ na ọkwá.” Otu onye na-enyocha ihe owuwu na Lagos kwuru sị, “Anyị nwere mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ maka ịgbalị ime ka ihe owuwu ha bụrụ nke iwu kwadoro site n’inweta akwụkwọ ikike iwu ihe owuwu. . . . Ọ na-egosi na ha bụ ndị na-eji nlezianya eme ihe, bụrụkwa ndị na-erube isi n’iwu.” Na Delta State, mmụọ dị mma nke ụmụnna na-ewu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze gosipụtara dọọrọ mmasị nke otu nwa agbọghọ nke na ọ rịọrọ ka e duziere ya ọmụmụ Bible. Tupu e wuchaa ihe owuwu ahụ nke were izu isii, ọ ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.
4. Olee otú alaka ụlọ ọrụ na-esi achọpụta ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu maka Ụlọ Nzukọ Alaeze?
4 Ihe Ndị E Meworo Iji Gboo Mkpa E Nwere: Ọ bụ ezie na anyị nwere ihe mere anyị ga-eji ṅụrịa ọṅụ n’ihe ndị a rụzuworo, o doro anya na a ka nwere ọtụtụ ọrụ a ga-arụ na Nigeria. Atụmatụ e mere na-egosi na anyị nwere ihe dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze 1,300 anyị kwesịrị iwu, bụ́ ndị anyị na-ewubeghị. Tụkwasị na nke ahụ, mmụba anyị na-enwe kwa afọ n’ọgbakọ ga-achọ ka a na-ewu ihe dị ka ụlọ nzukọ ọhụrụ 80 kwa afọ. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eme nnyocha iji chọpụta ebe ndị e kwesịrị ibu ụzọ wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe nke ahụ gasịrị, alaka ụlọ ọrụ na-edepụta aha ebe ndị ahụ, bụ́ nke ụmụnna na-anọchite anya Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dị n’alaka ụlọ ọrụ ga-agbaso iji kwadebe maka ihe owuwu. Ụmụnna a na-enyere ọgbakọ aka n’ihe banyere ikwe ọnụ ala, ịchọpụta ego ole ihe owuwu dị n’ala ahụ ruru, inweta akwụkwọ iwu kwadoro, na ịchọpụta ma ọgbakọ ò kwesịrị inwetakwu enyemaka iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze.
5. Olee ihe ndị e meworo iji gboo mkpa e nwere?
5 Iji gboo mkpa a dị ukwuu e nwere maka Ụlọ Nzukọ Alaeze, a na-eji ụkpụrụ ihe owuwu a na-agbaso eme ihe n’ụzọ kwekọrọ ná ntụziaka dị n’akwụkwọ bụ́ Kingdom Hall Construction Guidelines (Akwụkwọ Ntụziaka Banyere Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze) nke Òtù Na-achị Isi nyere. Ụkpụrụ ihe owuwu a na-agụnye iji ihe ndị e ji ewu ụlọ n’ógbè ahụ, bụ́ ndị ga-eme ka ihe owuwu ahụ dị mfe nrụzi, na-eme ihe. N’ihi ego dị nta e nwere, ọ dịwokwa mkpa ịkpara ndị ga-enweta enyemaka na ụdị enyemaka ha pụrụ inweta ókè. N’ihi nke a, ka ọ dị ugbu a, ọgbakọ ndị nwere ihe na-erughị ndị nkwusa 30 agaghị enweta enyemaka iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ezie na alaka ụlọ ọrụ nwere obi ụtọ inyere ọgbakọ ndị nọ nnọọ ná mkpa aka n’ụzọ ego, ndị na-enweta enyemaka dị otú ahụ aghaghị ịhụ maka mmefu ụfọdụ n’onwe ha. Mmefu ndị dị otú ahụ na-agụnye ịzụta ala, inweta akwụkwọ ndekọ banyere ihe owuwu, na mmefu ụfọdụ ha ga-eme mgbe a na-ewu ya.
6. Olee ibu ọrụ ọgbakọ nwere mgbe a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze?
6 N’ozuzu ya, ibu ọrụ ọgbakọ nwere tupu a malite ihe owuwu na mgbe ọ malitesịrị amụbawo, obi dịkwa anyị ụtọ ịhụ mmeghachi omume dị mma n’ihe banyere nke a. (Neh. 4:6) Ọgbakọ nwere ibu ọrụ nke ime ihe nile ha nwere ike ime iji kere òkè n’ihe owuwu ha. Ìgwè Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-agwa ndị okenye ndị ọrụ afọ ofufo ole a chọrọ nakwa ụdị ọrụ ha ga-arụ. Ọgbakọ pụrụ ịchọ enyemaka nke ndị ọrụ afọ ofufo n’ọgbakọ ndị dị ha nso. (Gal. 6:2) Ikekwe, ị nọghị n’ọnọdụ ga-enye gị ohere ikere òkè n’ụzọ zuru ezu n’ihe owuwu ahụ, ma ị̀ pụrụ inye aka n’ụzọ ndị ọzọ? Dị ka ihe atụ, ị̀ pụrụ inye aka n’ịkwadebe nri, n’iche nche, n’inweta akwụkwọ ikike, ma ọ bụkwanụ n’inye ndị so n’Ìgwè Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe obibi? Ebe ọ bụ na anyị nile “nwere onyinye dịgasị iche iche dị ka obiọma na-erughịrị mmadụ nke e nyere anyị si dị,” ka anyị nọgide na-eji ha eme ihe n’ụzọ zuru ezu.—Rom 12:4, 6.
7. (a) Olee ụzọ dị mkpa anyị pụrụ isi nye aka n’ihe owuwu a nke na-achọ ihe dị ukwuu n’aka ọgbakọ? (b) Olee ebe e si enweta ụkpụrụ na nduzi ndị a na-agbaso?
7 Iji Iguzosi Ike n’Ihe Na-akwado Ndokwa Ahụ: E nwere ọtụtụ ụzọ ndị nkwusa nile pụrụ isi tụnye ụtụ n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze a dị mkpa bụ́ nke na-achọ ihe dị ukwuu n’aka ọgbakọ. Otu ụzọ bụ site n’ikwenyere ụmụnna na-anọchite anya Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dị n’alaka ụlọ ọrụ mgbe ha na-akwadebe ihe owuwu ahụ ma ọ bụ mgbe a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịchọ ka a rụọrọ anyị ụdị oche dị iche ma ọ bụ ka a chọọ ụlọ nzukọ anyị mma n’ụzọ dị iche ma ọ bụkwanụ ka o buo ibu karị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị aghọta na ụmụnna a na-arụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ ná ntụziaka nzukọ a nyere, ọ ga-enyere anyị aka ime ihe ha kwuru ma ghara ime ihe megidere ntụziaka ndị a. (1 Kọr. 14:40) Ọzọkwa, ụmụnna a bụ́ ndị ha na Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dị n’alaka na-arụkọ ọrụ anatawo ọzụzụ na ntụziaka banyere otú e si akwụ ụgwọ mmefu ndị e mere na otú e si ahụ maka ihe ndekọ ego, ha ga-azakwa ajụjụ n’ihu alaka ụlọ ọrụ n’ihe banyere nke a. Anyị kwesịrị iji ikwesị ntụkwasị obi na-akwado ụkpụrụ na ntụziaka ndị ụmụnna a họpụtara ahọpụta, bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’okpuru nduzi nke Òtù Na-achị Isi, na-agbaso.—Mat. 24:45-47; 2 Tim. 2:2.
8. (a) Olee ihe ọgbakọ pụrụ ime iji kwadebe maka ihe owuwu? (b) Olee àgwà ọgbakọ kwesịrị igosipụta n’ebe nkwa e kwere dị, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji bụrụ ihe na-egosi ịhụnanya?
8 Ka ọ dị ugbu a, ego dịnụ e ji ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-ebelata ọnụ ọgụgụ ụlọ nzukọ ndị a pụrụ iwu. N’ihi nke a, alaka ụlọ ọrụ na-edebe ọgbakọ ndị pụrụ iji ego ha zụta ala n’ọnọdụ mbụ. N’ihi ya, ọgbakọ kwesịrị inye onyinye zuru ezu iji zụta ala n’onwe ha. (Luk 14:28-30) Ọtụtụ ọgbakọ ekpebiwo ịdị na-ezite onyinye n’alaka ụlọ ọrụ kwa ọnwa maka ihe owuwu ha ga-ewu n’ọdịnihu, ma ọ bụ nanị iji kwadoo Ụtụ Ego Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụwa nile. Iji ikwesị ntụkwasị obi na-akwụ ihe e kweworo ná nkwa na ihe e kwekọrịtara bụ ụzọ dị mkpa isi kwadoo owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze. (Mat. 5:37) Ọ na-egosikwa ịhụnanya Ndị Kraịst; na-egosi na anyị chọrọ ka ọgbakọ ndị ọzọ nweta enyemaka dị otú ahụ iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ha.—Fil. 2:4.
9. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị inweta ikike tupu a malite iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọbụna ma a sị na ọgbakọ ji ego ha na-ewu ya?
9 Ọgbakọ ndị pụrụ iji ego ha gaa n’ihu n’ihe owuwu ha pụru ime otú ahụ mgbe alaka ụlọ ọrụ nyesịrị ha ikike ime otú ahụ. A gwawo ndị okenye otú ha pụrụ isi kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ ma nweta nkwado na ntụziaka tupu ha amalite ihe owuwu dị otú ahụ nakwa ma ọ bụrụ na ha achọọ ịzụ ala. Ọ bụ ezie na a na-agba ndị mmadụ ume n’otu n’otu iji mmesapụ aka na-enye onyinye maka owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, ọ dịghị onye kwesịrị iche na iji ego ha wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ga-eme ka ha hapụ ụkpụrụ ndị e setịpụrụ maka ọdịdị ya na ịchọ ya mma. Ọ dị mkpa iburu n’uche na usoro ihe owuwu a buru ibu, nke ahụ ga-emekwa ka anyị nwee afọ ojuju n’ụkpụrụ nzukọ a setịpụrụ.—2 Kọr. 8:14.
10. (a) Olee otú e si egosipụta afọ ojuju? (b) Olee ibu ọrụ anyị nwere n’ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị?
10 Inwe afọ ojuju ga-eme ka anyị nwee ekele maka ebe anyị na-anọ efe ofufe, bụ́ nke e wuru n’ụzọ dị mfe. (1 Tim. 6:8) N’ihi ya, ọgbakọ ndị nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị e wuchaworo ewucha ekwesịghị ịchọ ịmalite ihe owuwu ọhụrụ, dị ka ịgba ogige, iwu ụlọ onye na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ bụ iwugharị Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otú ọ dị, a pụrụ ime ya ma ọ bụrụ na ọnọdụ ụfọdụ emee ka ọ dị mkpa nakwa ma e buru ụzọ nweta ikike site n’alaka ụlọ ọrụ. Ọ ga-aka mma ka ọgbakọ ndị a lekwasị anya n’ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ na ogige ya. Ọ bụrụgodị na ebe unu na-ezukọ ugbu a abụghị Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, ọ dị mkpa ka unu na-elekọta ya ma na-enye onyinye iji mee nke a. Ọ dịghị ihe ọ bụla mere a ga-eji kwe ka ebe a na-anọ enwe nzukọ—na-agbanyeghị ókè ọ dịruru mfe—mebie kpam kpam. (2 Ihe 24:13; 29:3) A gwawo ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ka ha jụọ ndị okenye ọgbakọ ná nleta ha na-eme ugboro abụọ n’afọ otú ha si elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ha iji jide n’aka na ha na-eme ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
11. Olee otú Abụ Ọma 32:8 pụrụ isi metụta owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị?
11 Nduzi Ọchịchị Chineke Na-eweta Ngọzi: Jehova na-emesi anyị obi ike n’Abụ Ọma 32:8, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.” Olee otú nke a si metụta owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị? Anyị na-achọ mgbe nile ịgbaso ntụziaka Jehova. Dị nnọọ ka Jehova nyere ntụziaka maka owuwu nke ụlọ nsọ ahụ, ọ na-enye anyị ntụziaka site ná nzukọ ya iji rụzuo ọrụ ihe owuwu taa. N’ihi ya, anyị ekwesịghị igosipụta mmụọ nnwere onwe.—Hib. 13:17.
12. Olee otú anyị nile pụrụ isi kere òkè n’ihe owuwu a dị mkpa?
12 Nye ihe ka ọtụtụ n’ime anyị, ikere òkè n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-abụ ahụmahụ ha ga-enwe otu ugboro ná ndụ ha. N’ezie, anyị kwesịrị ime ihe nile anyị nwere ike ime, si otú a na-egosi ịhụnanya na ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ. Anyị nile pụrụ ikere òkè site n’ịkwado ya n’ụzọ ego, na-anakwere ma na-agbaso ụkpụrụ ndị e setịpụrụ, na-egosi mmụọ afọ ofufo, ma na-agbaso ndokwa ọchịchị Chineke. Anyị kwesịkwara ịnakwere ibu ọrụ anyị nwere n’ihe banyere owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, ka anyị na-ekwenyere n’ụzọ zuru ezu Ìgwè Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke e kenyere iduzi ọrụ ahụ. Mgbe ahụ, dị nnọọ ka ụlọ nsọ ahụ e nwere n’ụbọchị Hagaị, Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ga-ejupụta n’ihe a na-achọsi ike nke mba nile ka ndị nwere obi eziokwu na-anọgide na-abịa iji mụta banyere Jehova. N’ezie, Jehova “na-eme ka ọrụ ya nile,” gụnyere owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze, “kwenyekọọ maka ọdịmma nke ndị hụrụ [ya] n’anya.”—Rom 8:28.
Igbe dị na peeji nke 6]
Okwu Ekele Maka Owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria
● “Anyị nile nwere nnọọ ekele maka ndokwa a nke iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị ekpebiwokwa ịkwado ndokwa nile e meworo.”—Imo State
● “N’ezie, ọ dị ka ọ bụ ná nrọ na ihe anyị nọworo na-ekpe ekpere maka ya eri ọtụtụ afọ pụrụ ikwe mee site ná ndokwa ‘òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche’ mere.”—Lagos State
● “Ana m edetara unu akwụkwọ ozi a iji kwupụta ekele dị ukwuu m nwere maka [usoro ihe owuwu] a magburu onwe ya nke unu ji na-ahụ na e buliri ebe a na-anọ efe Jehova ofufe elu nke ukwuu karịa ebe ndị ọzọ a na-anọ efe ofufe.”—Enugu State
● “Anyị na-edetara unu akwụkwọ ozi a iji gosipụta ekele anyị nwere n’ebe Òtù Na-achị Isi nọ maka iwukwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụwa nile, bụ́ nke kwesịrị ịja mma.”—Osun State
● “N’oge gara aga, anyị bụ otu n’ime ọgbakọ ndị dị na Nigeria bụ́ ndị na-enweghị Ụlọ Nzukọ Alaeze; taa anyị nwere ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze e tere ágbá nke ọma.”—Ebonyi State
[Chaatị dị na peeji nke 3]
Ọnụ ọgụgụ Ụlọ Nzukọ Alaeze e wuru na Nigeria n’agbata afọ ije ozi 2000 na 2003
2000 2001 2002 2003
102 125 171 236