Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ tụlee ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’April 26, 2004. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu March 1 ruo April 26, 2004. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Mgbe anyị na-ekwu okwu, n’ihi gịnị ka o ji ka mma iji ihe ndepụta kwuo okwu kama ide ihe nile n’akwụkwọ ma gụọ ya agụọ? [be-IB p. 166 para. 3]
2. N’ịkwadebe maka ozi ubi, olee otú anyị pụrụ isi hazie echiche anyị iji buru isi ihe ndị anyị chọrọ ikwu n’isi? [be-IB p. 167 para. 3]
3. N’iji Ọrụ 13:16-41 na Ọrụ 17:2, 3 eme ihe, kọwaa otú Pọl si ‘gosi n’ụzọ ezi uche dị na ya na Jizọs bụ Kraịst ahụ.’ (Ọrụ 9:22) [be-IB p. 170 para. 2]
4. Olee uru ndị dị n’ikwu okwu n’agụghị ya agụ? [be-IB p. 175 para. 1-4]
5. Olee nsogbu ndị ikwu okwu n’agụghị ya agụ pụrụ ịkpata, gịnịkwa pụrụ inyere anyị aka izere ha? [be-IB p. 175 para. 5–p. 176 para. 3]
IHE OMUME NKE 1
6. Dị ka ihe ndekọ dị na Jenesis 32:24-32 si kwuo, gịnị ka Jekọb dị afọ 97 mere iji nweta ngọzi Jehova, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị? [w02-IB 8/1 p. 29-31]
7. Gịnị bụ “izuzu,” oleekwa otú ọ pụrụ isi gbochie anyị inwewe echiche na-ezighị ezi na inwe mwute n’ụzọ na-enweghị isi? (Ilu 1:4) [w02-IB 8/15 p. 21-22]
8. Olee otú ndị ọkà okwu ihu ọha pụrụ isi mee ka Akwụkwọ Nsọ bụrụ ebe okwu ha dabeere? [be-IB p. 52 para. 6–p. 53 para. 5]
9. N’ime ka ihe ndepụta okwu ghọọ nkọwa Akwụkwọ Nsọ nke jupụtara n’ihe ọmụma, mkpebi ndị dị aṅaa ka ọkà okwu ga-eme? [be-IB p. 54 para. 2-4]
10. N’ihi gịnị ka Jehova ji jiri mana zụọ ụmụ Izrel n’ọzara site n’izu ruo n’izu, sitekwa n’ọnwa ruo n’ọnwa, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a? (Deut. 8:16) [w02-IB 9/1 p. 30 para. 4-5]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Dị ka e gosipụtara na Jenesis 37:12-17, olee myirịta anyị na-ahụ n’etiti ụzọ Josef gbasoro na nke Jizọs? [w88-IB 4/1 p. 29 para. 12]
12. Dị ka a pụrụ ịhụ n’ihe ndekọ dị na Jenesis 42:25-35, Josef si aṅaa gosi ọmịiko nke yiri ọmịiko Jizọs na-egosi? [w88-IB 5/1 p. 23 para. 10; p. 25 para. 17]
13. Olee otú ndokwa nke òtù ohu ahụ na-eme taa si kwekọọ ná nri e kesara n’oge Josef? (Jen. 47:21-25)
14. Site n’ikwu, sị, “Abụ m ihe m bụ,” gịnị ka Jehova na-ekpughe banyere aha ya? (Ọpụ. 3:14, 15)
15. Ihe ize ndụ abụọ dị aṅaa dị n’ime mkpesa ka e zoro aka na ha n’Ọpụpụ 16:2, 3? [w93-IB 3/15 p. 20-21]