Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’April na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ndị pụrụ ịgụnye ndị bịara Ememe Ncheta ma ọ bụ ihe omume ndị ọzọ nke ọchịchị Chineke bụ́ ndị na-adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, lekwasị anya n’inyefe akwụkwọ Fee Chineke Ofufe. E kwesịrị ịgbalịsi ike ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi, karịsịa ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị amụworị akwụkwọ Ihe Ọmụma na broshuọ Na-achọ.
June:: Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee broshuọ Na-achọ. Mgbe i ji broshuọ ahụ eme ihe, lekwasị anya n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi.
July na August:: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32: Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị Ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? Ndịàmà Jehova Olee Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere? na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs.
◼ Na May 29, 2004, a ga-emechi ihe owuwu Betel. N’ihi ya, biko unu abịala maka ime njem nlegharị anya ma ọ bụ inweta akwụkwọ n’ụbọchị a.
◼ Ọ dị mkpa ka alaka ụlọ ọrụ na-enwe ihe ndekọ kasị ọhụrụ nke adres na nọmba telifon nke ndị isi oche ndị nlekọta na nke ndị odeakwụkwọ nile. Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe mgbe ọ bụla, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị idejupụta fọm bụ́ Presiding Overseer/Secretary Change of Address (S-29), bịanye aka na ya, ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ ozugbo. Nke a na-agụnye mgbanwe ọ bụla e nwere na nọmba ógbè ndị a na-apị tupu a pịa nọmba telifon.
◼ Ndị odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịdị na-enwe mgbe nile ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke fọm Application for Regular Pioneer Service (S-205) na Application for Auxiliary Pioneer Service (S-205b). A pụrụ iji Literature Request Form (S-14) tụọ ọda ha. Nwee, ma ọ dịkarịa ala, nke ga-ezu ruo otu afọ. Nyochagharịa akwụkwọ ndejupụta dum e tinyere maka ịsụ ụzọ oge nile iji jide n’aka na e denyezuru ihe nile, tinyere ụbọchị e mere onye ahụ baptizim.