Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/04 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite May 10
  • Izu Na-amalite May 17
  • Izu Na-amalite May 24
  • Izu Na-amalite May 31
  • Izu Na-amalite June 7
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 5/04 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite May 10

Abụ nke 193

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa May. Ọ bụrụ na aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 kwekọrọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala ọgbakọ unu, jiri ha mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke May 15 na Teta! nke June 8. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ nke iche ihe n’ihu mee ihe. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke June 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche nke isi merie okwu na-egbochi nkwurịta okwu, bụ́ “Enwere m okpukpe nke m.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 10-11.

15 min: Igbe Ajụjụ. Okwu okenye ga-ekwu.

20 min: ‘Na-agbasapụnụ.’a Gbakwụnye okwu ndị dị n’akwụkwọ Fee Chineke Ofufe, peeji nke 150, paragraf nke 14.

Abụ nke 18 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 17

Abụ nke 188

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: “Gosipụta Ekele Gị.”b Dị ka oge nyere ohere ya, kpọọ ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, mee ka otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka na nso nso a kwuo banyere ngọzi ndị ha nwetara site n’ime otú ahụ.

20 min: Anyị Na-elekọta Ibe Anyị. (1 Kọr. 12:25, 26) Okwu na mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’akwụkwọ Ozi Anyị, peeji nke 157-159, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Nchegbu Maka Ibe Anyị.” N’agbanyeghị na ndị Jehova bi n’akụkụ nile nke ụwa, anyị dị nnọọ n’otu. Anyị nile kwesịrị ikpe ekpere maka ụmụnna anyị kwa ụbọchị. Anyị na-adịkwa ngwa n’inye aka n’ụzọ ihe onwunwe mgbe e nwere mkpa ndị dị ngwa. Gụọ ma kwuo okwu n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ isi, ma gbakwụnye otu ma ọ bụ ahụmahụ abụọ e nwetara ná mbipụta anyị.

Abụ nke 100 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 24

Abụ nke 128

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Mee ihe ngosi banyere otú a pụrụ isi chee Ụlọ Nche nke June 1 na Teta! nke June 8 n’ihu ndị mmadụ. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke June 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. Mee ka ihe ngosi nke ọ bụla kwekọọ n’ọnọdụ ga-amasị onye na-aga otu n’ime chọọchị ndị dị n’ógbè unu.

10 min: “Olu Ụtọ Ndị Na-enye Ume Ọhụrụ.” Okwu na mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Gbakwụnye okwu ndị dị na 2002 Yearbook, peeji nke 175, nakwa Ụlọ Nche nke February 1, 1997, peeji nke 27, paragraf nke 1-2.

25 min: “Mgbakọ Distirikti ‘Soro Chineke Na-eje Ije’ nke Ndịàmà Jehova nke 2004.” Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ya. Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 1, gụọ akwụkwọ ozi nke April 1, 2004 nke e ji kenye ọgbakọ unu mgbakọ ha ga-aga. Mgbe a na-atụle paragraf nke 2, dọrọ uche gaa n’igbe dị na peeji nke 3. Gbaa mmadụ nile ume ime ndokwa maka mgbakọ ngwa ngwa o kwere mee.

Abụ nke 138 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 31

Abụ nke 26

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa May.

17 min: Ndụ—Onyinye nke E Kwesịrị Iwere n’Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa. Okwu nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke dabeere na broshuọ Na-achọ, peeji nke 24-25. Gbakwụnye okwu ndị dị na Teta! nke October 8, 1993, peeji nke 10-11. Olee otú ị ga-esi akọwa echiche Jehova banyere isikwopụ afọ ime nye onye na-eche na nwanyị nweere onwe ya ime mkpebi banyere ihe ndị metụtara ahụ́ ya? Kọọ ahụmahụ nke dị n’Ụlọ Nche nke January 1, 2000, peeji nke 4, paragraf nke 4-5.

20 min: “Inyefe Akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ.” N’ọnwa June, anyị ga na-enyefe akwụkwọ a. Mee ka isi ihe ndị a kọwara na peeji nke 7, paragraf nke 1-3, nke akwụkwọ ahụ pụta ìhè. Mee ka ndị na-ege ntị kwuo ihe ndị na-amasị ha banyere ya. Tụlee ụzọ iche ihe n’ihu ndị a tụrụ aro ha. Kwuo ụzọ a pụrụ isi jiri ihe osise ndị dị na ya mee ihe mgbe a na-enyefe akwụkwọ ahụ. Mee ka onye na-eto eto jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ ahụ mee ihe ngosi, onye toworo eto ejirikwa otu n’ime ndị ọzọ ahụ mee ihe ngosi. Ọ bụrụ na ụzọ iche ihe n’ihu dị iche ga-ekwekọ ekwekọ karị n’ókèala ọgbakọ unu, a pụrụ ịtụle ya ma jiri ya mee ihe ngosi n’ọnọdụ nke otu n’ime ndị ọzọ ahụ.

Abụ nke 24 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 7

Abụ nke 136

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee isi ihe ndị a na-ekwu n’isiokwu bụ́ “Ụzọ Isi Nyere Ha Aka.” Kwuo asụsụ ụfọdụ ndị a na-enweta n’ókèala ọgbakọ unu.

15 min: Lebakwuo Anya n’Iduzi Ọmụmụ Bible Ebe Obibi. Okwu nke okenye ruru eru ga-ekwu bụ́ nke dabeere n’akwụkwọ ozi nye òtù ndị okenye nile na Nigeria nke akara ụbọchị ya bụ June 10, 2003.

20 min: Jiri Ihe Atụ Ndị Dị Irè Na-eme Ihe n’Ozizi Gị. Okwu na mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, nke dabeere n’Ụlọ Nche nke September 1, 2002, peeji nke 22-24. Olee isi ihe anọ ndị na-eme ka ihe atụ dị irè? N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe bara uru ime ka ihe atụ dịrị mfe? Olee ebe anyị pụrụ ịchọta ihe atụ ndị dị mma? Tụlee ihe atụ ụfọdụ dị n’igbe dị na peeji nke 23, tụleekwa ihe mere ihe atụ nke ọ bụla ji dị irè.

Abụ nke 133 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya