Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na November: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee broshuọ Na-achọ. Lekwasị anya n’iji broshuọ ahụ amalite ọmụmụ Bible ebe obibi. December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Akwụkwọ ndị ọzọ e nwere ike inyefe bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. January: Amụma Aịsaịa-Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke I. Amụma Aịsaịa-Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke II, ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla dị peeji 192 e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-agbanwe ụcha ha ma ọ bụ nke ọ bụla e bipụtara tupu 1990. February: A ga-enyefe Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, a pụrụ inyefe Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, Ị pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ime Paradaịs n’Elu Ala, na Mkpughe-Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na December 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe December 1 gasịrị. Ọ bụrụ na e nwere ihe ndekọ ego ndị dịrịtara iche, dị ka maka ilekọta ma ọ bụ iwu ụlọ nzukọ, e kwesịrị ime ndokwa ka a gụzigharịa ihe ndekọ ego a. Mgbe e meworo ngụzigharị ego ndị a, e kwesịrị ịmara ya ọgbakọ n’ọkwa mgbe a na-agụ ihe ndekọ ego ọzọ.
◼ Ọ dị mkpa ka alaka ụlọ ọrụ na-enwe ihe ndekọ kasị ọhụrụ nke adres na nọmba telifon nke ndị isi oche ndị nlekọta na ndị odeakwụkwọ nile. Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe n’oge ọ bụla, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị idejupụta fọm bụ́ Presiding Overseer/Secretary Change of Address (S-29), bịanye aka na ya, ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ ozugbo. Nke a na-agụnye mgbanwe ọ bụla e nwere na nọmba ndị a na-apị tupu a kpọọ ógbè nke ọ bụla.