Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/04 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite November 8
  • Izu Na-amalite November 15
  • Izu Na-amalite November 22
  • Izu Na-amalite November 29
  • Izu Na-amalite December 6
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 11/04 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite November 8

Abụ nke 180

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Na November, anyị ga-enyefe Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ ma ọ bụ broshuọ Na-achọ. Tụleghachi n’ụzọ dị nkenke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a tụrụ aro ha n’Ozi Alaeze Anyị nke May 2004, peeji nke 7.

15 min: Rite Uru Zuru Ezu ná Nzukọ Ije Ozi. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’akwụkwọ Ozi Anyị, peeji nke 71-72. Ụzọ ise ndị dị aṅaa ka Nzukọ Ije Ozi si enyere anyị aka ịghọ Ndị Kraịst bụ́ ndị ozi ka mma? Nye ihe atụ ndị sitere n’usoro ihe omume nke ọnwa a. Uru ndị dị aṅaa dị n’ime nkwadebe tupu oge eruo? N’ihi gịnị ka e kwesịrị iji na-agachi ya anya? Ihe atụ Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa ka e nwere maka nzukọ a?

20 min: “Nọgide Na-enwe Echiche nke Ịdị Ngwa!”a Gbakwụnye okwu ndị sitere n’Ụlọ Nche nke January 15, 2000, peeji nke 12-13.

Abụ nke 19 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 15

Abụ nke 170

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa November. Ọ bụrụ na aro ndị dị na peeji nke 4 dabara adaba maka ókèala ọgbakọ unu, jiri ha mee ihe ngosi nke ụzọ isi chee Ụlọ Nche nke November 15 na Teta! nke December 8 n’ihu mmadụ. Mgbe a na-enyefe Teta! nke December 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ iche ihe n’ihu ndị ọzọ dabara adaba mee ihe.

15 min: Ị̀ Maara Obi Ụtọ A Na-enweta Site n’Inye Ihe? Okwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke November 1, 2004, peeji nke 19-23.

20 min: Dị Njikere Ịgba Àmà n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ, bụ́ nke dabeere n’Ozi Alaeze Anyị nke June 2003, peeji nke 3. Mee ndokwa tupu oge eruo ka mmadụ ole na ole kọọ ahụmahụ ndị ha nweworo ka ha na-agba àmà n’oge ha na-anọghị n’ozi. Mee ihe ngosi dị nkenke nke ụzọ a pụrụ isi jiri traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? na akwụkwọ nta bụ́ Good News for All Nations mee ihe mgbe a na-agba àmà n’oge a na-anọghị n’ozi.

Abụ nke 211 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 22

Abụ nke 199

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: “Ụzọ Isi Zụlite Ezi Ịhụnanya.” Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke July 1, 2003, peeji nke 4-7.

Abụ nke 115 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 29

Abụ nke 23

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa November. Mee ihe ngosi nke ụzọ isi chee Ụlọ Nche nke December 1 na Teta! nke December 8 n’ihu mmadụ. Mgbe a na-enyefe Teta! nke December 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe.

10 min: Igbe Ajụjụ. Okwu okenye ga-ekwu.

25 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 3.”b Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 3, mee ihe ngosi dị nkenke nke ọmụmụ Bible e ji broshuọ Na-achọ, ihe ọmụmụ nke 5, paragraf nke 1 na-enwe. A gụọlarị paragraf ahụ ma zaa ajụjụ ya. Onye nkwusa na onye ọ na-amụrụ ihe agụọ ma tụlee Aịsaịa 45:18 na Eklisiastis 1:4. Onye nkwusa ejiri ajụjụ ndị dị mfe mee ihe iji mee ka onye ọ na-amụrụ ihe kọwaa otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ọ bụla si metụta isi ihe a na-atụle.

Abụ nke 178 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 6

Abụ nke 96

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na December. Mee otu ma ọ bụ ihe ngosi abụọ nke ụzọ a pụrụ isi chee akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu n’ihu mmadụ.

20 min: “Ị̀ Pụrụ Inye Aka?”c Gbaa otu ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị nwere ekele maka enyemaka na agbamume ha nwetara n’aka ndị ọzọ.

15 min: Ahụmahụ ndị mere n’ókèala unu. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ha nwetara mgbe ha na-eleta onye ha nyere akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ ma ọ bụ broshuọ Na-achọ n’ọnwa November. Mee ndokwa tupu oge eruo ka e mee ihe ngosi nke ahụmahụ ndị dị ịrịba ama e nwere. Jaa mmadụ nile mma maka mgbalị ha mere.

Abụ nke 101 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya