Akụkụ nke 3: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Iji Akwụkwọ Nsọ Na-eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè
1. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ime ka ihe anyị na-atụle hiwe isi n’Akwụkwọ Nsọ mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Bible?
1 Nzube anyị n’iduzi ọmụmụ Bible bụ iji ‘mee ndị na-eso ụzọ’ site n’inyere ndị mmadụ aka ịghọta na ịnakwere ozizi nke Okwu Chineke ma tinye ya n’ọrụ ná ndụ ha. (Mat. 28:19, 20; 1 Tesa. 2:13) N’ihi ya, ọmụmụ ihe ahụ kwesịrị ihiwe isi n’Akwụkwọ Nsọ. Ná mmalite, ọ pụrụ inye aka igosi ndị a na-amụrụ ihe otú e si achọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ na Bible nke ha. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi jiri Akwụkwọ Nsọ nyere ndị dị otú ahụ aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ?
2. Olee otú anyị si ekpebi akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị ga-agụ ma kọwaa?
2 Họrọ Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Ndị A Ga-agụ: Mgbe ị na-eme nkwadebe, chọpụta otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ọ bụla e zoro aka na ya n’ihe ọmụmụ ahụ si metụta isi ihe a na-atụle, ma kpebie ndị unu ga-agụ ma tụlee mgbe ị na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ. Dị ka o kwesịrị, ọ ka mma ịgụ ndị na-egosi otú Akwụkwọ Nsọ si kwadoo ihe ndị anyị kweere. E nwere ike ọ gaghị adị mkpa ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-atụkwasị ihe n’ihe e kwurula ekwu. Buru n’uche mkpa na ọnọdụ nke onye nke ọ bụla a na-amụrụ ihe.
3. Gịnị bụ abamuru dị n’iji ajụjụ eme ihe, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee nke a?
3 Jiri Ajụjụ Na-eme Ihe: Kama ịkọwara onye ị na-amụrụ ihe akụkụ Bible, hapụ ya ka ọ kọwaa ha. Ị pụrụ ịkpali ya ime nke a site n’iji nkà eji ajụjụ eme ihe. Ọ bụrụ na otú otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ si metụta ihe a na-atụle doro anya, ị pụrụ nanị ịjụ banyere otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ si kwado ihe e kwuru na paragraf. N’ọnọdụ ndị ọzọ, ọ pụrụ ịdị mkpa iji ajụjụ ndị gara n’ihe kpọmkwem na-eme ihe iji mee ka onye ahụ a na-amụrụ ihe ruo ná nkwubi okwu kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka e nyekwuo nkọwa, a pụrụ ime nke a mgbe onye ahụ a na-amụrụ ihe zaghachisịrị.
4. Nkọwa ha aṅaa dị mkpa maka akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị gụrụ?
4 Mee Ka Ọ Dị Mfe: Mgbe mgbe, ọ bụ nanị otu akụ́ na-adị ọkà n’ịgba ụta mkpa iji gbata ihe ọ chọrọ ịgba. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ naghị adị onye nkụzi bụ́ ọkà mkpa ikwu ọtụtụ ihe iji mee ka ihe ọ na-ekwu doo anya. Ọ pụrụ inye ihe ọmụma n’ụzọ dị mfe, doo anya, ma bụrụ eziokwu. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ime nnyocha n’akwụkwọ Ndị Kraịst iji ghọta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma kọwaa ya n’ụzọ ziri ezi. (2 Tim. 2:15) Ma, zere ịnwa ịkọwa ihe nile akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọ bụla dị n’ihe ọmụmụ ahụ pụtara. Gbakwụnye nanị ihe ndị dị mkpa iji mee ka isi ihe a na-atụle pụta ìhè.
5, 6. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka itinye Okwu Chineke n’ọrụ ná ndụ ha, ma gịnị ka anyị kwesịrị izere?
5 Gosi Otú A Pụrụ Isi Tinye Ihe A Na-atụle n’Ọrụ: Mgbe o kwesịrị ekwesị, nyere onye ahụ ị na-amụrụ ihe aka ịhụ otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche si metụta ya. Dị ka ihe atụ, mgbe gị na onye ị na-amụrụ ihe nke na-amalitebeghị ịga nzukọ Ndị Kraịst na-atụle Ndị Hibru 10:24, 25, ị pụrụ ịkọwa otu n’ime nzukọ anyị ma kpọọ ya òkù ịbịa. Ma zere ịrụgide ya arụgide. Hapụ ka Okwu Chineke kpalie ya ime ihe ndị dị mkpa iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ.—Hib. 4:12.
6 Ka anyị na-arụ ọrụ e nyere anyị ime ndị na-eso ụzọ, ka anyị “kwalite nrubeisi site n’okwukwe” site n’iji Akwụkwọ Nsọ eme ihe n’ụzọ dị irè.—Rom. 16:26.