Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ tụlee ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite na December 27, 2004. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu November 1 ruo December 27, 2004. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi kpalie mmasị ndị na-ege gị ntị n’otu isiokwu? [be-IB p. 218 para. 3]
2. Kwuo ihe ise e ji ama okwu mmechi dị irè. [be-IB p. 220 para. 4–p. 221 para. 4]
3. Olee otú anyị pụrụ isi hụ na ihe ndị anyị kwuru ziri ezi? [be-IB p. 224 igbe]
4. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ihe omume anyị ná nzukọ na-egosipụta oké nkwanye ùgwù maka ọrụ ọgbakọ na-arụ dị ka “ogidi na ihe nkwado nke eziokwu”? (1 Tim. 3:15) [be-IB p. 224 para. 1-4]
5. A bịa n’ihe metụtara okwu ndị a kpụ n’ọnụ, ihe ndị ọzọ kwuru, na ahụmahụ, olee otú anyị pụrụ isi tinye Ilu 14:15, n’ọrụ? [be-IB p. 225 para. 1]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee “ụwa” Pọl onyeozi bu n’uche ná Ndị Efesọs 1:4? [w02-IB 6/15 p. 5 para. 4]
7. Olee ụzọ atọ Setan na-achọ mgbe nile isi mebie iguzosi ike n’ezi ihe anyị, n’ihi gịnịkwa ka o ji ejikarị ndụmọdụ hiere ụzọ ma ọ bụ okwu a na-echeghị eche kwuo bụ́ ndị na-esi n’ọnụ ndị enyi ma ọ bụ ndị kwere ekwe ibe anyị, eme ihe? [w02-IB 8/15 p. 26 para. 2; p. 28 para. 4]
8. Ụkpụrụ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịmụta ná 1 Ndị Kọrint 6:7? [w02-IB 11/1 p. 6 para. 2]
9. Gịnị ka iji ezi obi rịọ mgbaghara nke ga-eme ka anyị na ‘nwanna anyị dị n’udo’ gụnyere? (Mat. 5:23, 24) [w02-IB 11/1 p. 6 para. 1, 5]
10. Gịnị ka 2 Ndị Eze 13:18, 19 na-akụziri anyị banyere ịrụzu ọrụ Chineke nyere anyị? [w02-IB 12/1 p. 31 para. 1-2]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. N’ihi gịnị ka ụmụ Izrel pụrụ iji nye onye ọbịa ma ọ bụ renye onye ala ọzọ anụ nwụrụ anwụ a na-egbupụghị ọbara bụ́ nke ha onwe ha na-agaghị eri? (Deut. 14:21)
12. Ihe mmụta dị aṅaa dịịrị anyị na Deuterọnọmi 20:5-7?
13. N’ihi gịnị ka e ji jiri iwere “nkume igwe nri ma ọ bụ aka nkume n’ihe ibe” tụnyere iwere “ndụ mmadụ” n’ihe ibe? (Deut. 24:6)
14. Ebe ọ bụ na a machibidoro ụmụ Izrel iwu iri abụba ọ bụla, gịnị ka ha iri “abụba ụmụ atụrụ” pụtara? (Deut. 32:13, 14)
15. Gịnị bụ myirịta e nwere n’oge a banyere mmehie Ekan? (Josh. 7:1-26) [w86-IB 12/15 p. 20 para. 20]