Ihe Ọhụrụ E Wepụtara Iji Nyere Anyị Aka Izere Ọbara
Òtù Na-achị Isi akwadowo ijikọta akụkụ ndị dị oké mkpa nke fọm bụ́ durable power of attorney for health care (DPA) na kaadị Advance Medical Directive/Release n’otu akwụkwọ iwu, bụ́ nke anyị ga na-akpọ kaadị DPA.
Ọ dịghị mgbe kaadị DPA ga-akwụsị ịdị irè, ọ ga na-ekwupụta obi gị mgbe ị na-eme njem gaa ná mba ọzọ. N’ọdịnihu, ị ga-edejupụta kaadị DPA ọhụrụ (1) ma ọ bụrụ na ị chọọ ime mgbanwe ụfọdụ na kaadị DPA gị, dị ka ịgbanwe ọchịchọ gị, onye na-ahụ maka ahụ́ ike gị, adres gị, na nọmba telifon gị, ma ọ bụ (2) ma ọ bụrụ na kaadị DPA gị efuo ma ọ bụ mebie.
I kwesịrị ikpe ekpere tupu ị tụlee kaadị DPA ahụ ma jiri nlezianya dejupụta ya. Otú ọ dị, tupu ị bịanye aka na kaadị ahụ, ọ ga-adị mkpa imezu ihe nile iwu chọrọ ka i mee mgbe ị na-edejupụta ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na kaadị gị sịrị na a chọrọ ka ndị akaebe abụọ hụ mgbe ị na-abịanye aka na ya, ha kwesịrị ịnọ ya mgbe ị na-eme nke ahụ. Ndị nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ pụrụ ịjụ ndị na-edejupụtabeghị kaadị ọhụrụ ase iji hụ ma hà chọrọ enyemaka.
Tupu ị na-apịakọta kaadị DPA, jiri ígwè photocopier mepụtaghachi nke dị mma ị ga-enye onye na-ahụ maka ahụ́ ike gị, onye na-enyere onye na-ahụ maka ahụ́ ike gị aka, na dọkịta, nakwa otu nke ị ga-etinye na faịlụ. Ị pụkwara ịchọ inye ndị ezinụlọ gị ndị ọzọ na odeakwụkwọ ọgbakọ gị otu otu. E kwesịrị imepụtaghachi peeji nke mbụ n’otu mpempe akwụkwọ, mepụtakwa peeji nke abụọ ná mpempe akwụkwọ ọzọ. Jiri ụdị mpempe akwụkwọ hà ka nke anyị na-ejikarị edetara ọgbakọ akwụkwọ ozi mee ihe. I kwesịrị ịdị na-eji kaadị DPA nke a na-emepụtaghachighị emepụtaghachi na-aga ebe ọ bụla ị na-aga.
Nke e mere maka ụmụ a na-emebeghị baptizim nke nne na nna bụ́ Ndịàmà, bụ́ Identity Card nke nwere akara ụbọchị mbipụta bụ́ 3/99, agbanwebeghị. Ndị nne na nna kwesịrị ijide n’aka na e dejupụtara kaadị nke nwa ha ọ bụla na-etozubeghị ókè ma bịanye aka na ya nke ọma, nakwa na nwata ahụ na-eji ya n’oge ndị kwesịrịnụ.
Ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim pụrụ ilere kaadị DPA na Identity Card depụta ntụziaka metụtara nlekọta ahụ́ ike maka onwe ha na ụmụ ha. Odeakwụkwọ kwesịrị inye ndị nkwusa nile e mere baptizim ọhụrụ n’ime afọ ọ bụla kaadị DPA.