Ndokwa Ndị E Mere Iji Nyere Anyị Aka Izere Ọbara
Ọ gaghị adị mkpa ka ndị nkwusa e mere baptizim dejupụtaghachi kaadị Advance Medical Directive/Release ma ọ bụ Identity Card n’afọ a ma ọ bụrụ na ha dejupụtaburu nke na-ebughị akara ụbọchị e biri ya ma ọ bụ nke akara ụbọchị e biri ya bụ 3/99. Maka Nzukọ Ije Ozi nke izu December 29, odeakwụkwọ kwesịrị inwe kaadị zuru ezu maka ndị nkwusa e mere baptizim, maka ụmụ ha, na maka ndị chọrọ idejupụtaghachi nke ha. E zigaworo ọgbakọ nile kaadị ndị a. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị kaadị zuru ezu, odeakwụkwọ pụrụ ịchọpụta ma ọgbakọ ndị dị ha nso hà nwere ya ma ọ bụ kwuo ka e zitekwuoro ha ya n’ọda ọzọ ha ga-atụ.
E kwesịrị iji nlezianya dejupụta kaadị ndị ahụ n’ụlọ ma A GAGHỊ abịanye aka na ha. N’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-esonụ, onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị inye aka ruo n’ókè kwesịrị ekwesị iji hụ na a bịanyere aka na kaadị ndị ahụ, gbaa akaebe, ma denye akara ụbọchị na ha. Ndị akaebe kwesịrị ịhụ mgbe onye nwe kaadị ahụ na-abịanye aka na ya.
Ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim pụrụ idepụtara onwe ha na ụmụ ha ntụziaka ndị dị na kaadị Advance Medical Directive/Release na Identity Card n’okwu nke ha.