Akụkụ nke 6: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Mgbe Onye A Na-amụrụ Ihe Jụrụ Ajụjụ
1 Ozugbo onye a na-amụrụ Bible matawara ihe a na-akọ, ọ kasị mma ịdị na-amụrụ ya Bible n’ụzọ dị n’usoro kama ịdị na-eme a mụọ nke a taa, echi a mafere n’ọzọ. Nke a ga-enyere ya aka ịmalite inwe ezi ihe ọmụma, meekwa ka o nwee ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. (Kọl. 1:9, 10) Ma, ọtụtụ mgbe, ndị a na-amụrụ ihe na-ajụ ajụjụ dịgasị iche iche mgbe a na-amụrụ ha ihe. Olee otú e kwesịrị isi zaa ajụjụ ndị a?
2 Jiri Ezi Uche Mee Ihe: Ọtụtụ mgbe, a pụrụ ịza ajụjụ ndị metụtara ihe a na-amụ ozugbo ahụ a jụrụ ya. Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe jụrụ ajụjụ a zara n’akwụkwọ unu na-amụ, ma unu erubeghị ebe ahụ, ọ pụrụ ịdị mkpa nanị ịgwa ya na unu ka ga-amụru ebe azịza ya dị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ajụjụ ahụ emetụtaghị ihe a na-amụ ma ọ bụ na ajụjụ ahụ ga-achọ ka e mee nnyocha iji nwee ike ịza ya otú ọ ga-aghọta ya, ọ pụrụ ịka mma ịza ya mgbe unu mụchara ihe ma ọ bụ n’oge ọzọ. Ụfọdụ achọpụtawo na idetu ya edetu na-eme ka obi sie onye ha na-amụrụ ihe ike na ha weere ajụjụ ya dị ka ihe dị mkpa. Ọ na-enyekwa aka mee ka a ghara ịdọrọ uche gaa n’ihe ọzọ.
3 A tụlere ọtụtụ ozizi Bible nanị n’ụzọ dị nkenke n’akwụkwọ ndị bụ́ isi anyị ji eduziri ndị mmadụ ọmụmụ ihe. Ọ bụrụkwanụ na ọ na-esiri onye a na-amụrụ ihe ike ikwenye n’ozizi ụfọdụ nke Bible ma ọ bụ na ọ dị nkwenkwe ụgha ọ ka kwenyesiri ike na ya? Ọ pụrụ ịba uru ịtụle akwụkwọ ọzọ kọwara ihe Bible kwuru banyere isiokwu ahụ n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụrụ na nke ahụ emeghị ka o kwenye, hapụ ya ruo oge ọzọ ma gaa n’ihu n’ihe ị na-amụrụ ya. (Jọn 16:12) Ka ọ na-amụtakwu Bible ma na-enwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, ọ pụrụ imesị ghọta ozizi Bible ahụ.
4 Mara Ebe Ike Gị Ruru: Onye ị na-amụrụ ihe jụọ gị ajụjụ, ma azịza ya edoghị gị anya, guzogide ọnwụnwa nke ịza ihe i chere. (2 Tim. 2:15; 1 Pita 4:11) Gwa ya na ị ga-eme nnyocha ma lọghachi iji zaa ya. I nwedịrị ike iji ohere ahụ kụziere ya otú e si eme nnyocha. Jiri nke nta nke nta gosi ya otú e si eji akwụkwọ dịgasị iche iche nzukọ Jehova bipụtara eme nnyocha. N’ụzọ dị otú a, ọ ga-emesị nwee ike iji aka ya chọta azịza nye ajụjụ ndị o nwere.—Ọrụ 17:11.