Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ zaa ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite June 27, 2005. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu May 2, 2005 ruo June 27, 2005. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. N’ihi gịnị ka okwu ndị na-ekwu na ihe yiri ihe nakwa ndị na-ekwu na otu ihe bụ ihe ọzọ ji bụrụ ngwá ọrụ magburu onwe ha n’izi ihe? (Jen. 22:17; Ọma 1:3; Jems 3:6) [be-IB p. 240 para. 2-p. 241 para. 1 na igbe]
2. Olee ebe anyị pụrụ isi nweta ọtụtụ ihe atụ na-akụzi ihe ndị bara uru, ma olee ihe anyị kwesịrị ịkpachara anya ime banyere nke a? [be-IB p. 242 para. 2-3]
3. Gịnị ka ọ dị mkpa ka anyị buru n’uche mgbe anyị na-ahọrọ ihe atụ ndị ga-akasị dị irè? [be-IB p. 244 para. 1-2]
4. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iji ihe ndị a na-ahụ anya eme ihe mgbe anyị na-ezi ihe, oleekwa otú Jehova siworo mee nke a? [be-IB p. 247 para. 1-2 na igbe]
5. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ihe ndị a na-ahụ anya mee ihe n’ozi ubi? [be-IB p. 248 para. 1-p. 249 para. 2]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee ntụziaka dị n’Okwu Chineke banyere ịzụ ụmụaka n’akwụkwọ? [w03-IB 3/15 p. 12 para. 2; p. 14 para. 4]
7. Olee otú Jehova si gosi na ya nwere mmasị n’ebe Devid nọ mgbe ọ bụ onye na-eto eto, oleekwa otú Devid si gosi na ya nwere mmasị n’ebe Jehova nọ? [w03-IB 4/15 p. 29 para. 4; p. 30 para. 3]
8. N’ihi gịnị ka Jehova ji lee àjà Ebel anya ọma, oleekwa ihe nke a na-emesi anyị obi ike banyere ya? (Jen. 4:4) [w03-IB 5/1 p. 28 para. 4–p. 29 para. 1]
9. Gịnị bụ “ịdọ aka ná ntị nke Jehova” nke Ilu 3:11 na-adụ anyị ọdụ ka anyị ghara ịjụ? [w03-IB 10/1 p. 20 para. 2-4]
10. Gịnị ka “inwe afọ ojuju” dị ka e kwuru na 1 Timoti 6:6-8, pụtara? [w03-IB 6/1 p. 9 para. 1-2; p. 10 para. 1]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Gịnị ka ịhụnanya ahụ dị n’etiti Jonatan na Devid sere onyinyo ya? (2 Sam. 1:26) [w89-IB 1/1 p. 26 para. 13]
12. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta ná mgbalị mbụ Devid mere ibugote igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jeruselem? (2 Sam. 6:2-9)
13. Mgbe Devid na Batsheba mehiesịrị, gịnị mere nwa ha ji nwụọ, ebe ọ bụ na Deuterọnọmi 24:16 na Ezikiel 18:20 na-ekwu na nwa agaghị anwụ n’ihi ajọ omume nke nna ya? (2 Sam. 12:14; 22:31)
14. Olee otú anyị si mara na ihe Ziba kwuru banyere Mefiboshet abụghị eziokwu? (2 Sam. 16:1-4)
15. N’ihi gịnị ka otú Mefiboshet si meghachi omume n’ọnọdụ ya na Ziba ji bụrụ ezi ihe nlereanya nye anyị? (2 Sam. 19:24-30)