Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 45 p. 240-p. 243 para. 1
  • Ihe Atụ Ndị Na-ezi Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Atụ Ndị Na-ezi Ihe
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ na O Jighị Ihe Atụ”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • “Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ Na O Jighị Ihe Atụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ṅomie Onye Ozizi Ahụ Bụ́ Ọkà
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Jiri Nghọta Na Ime Ka Mmadụ Kwenye Na-ezi Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 45 p. 240-p. 243 para. 1

IHE ỌMỤMỤ NKE 45

Ihe Atụ Ndị Na-ezi Ihe

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Jiri atụmatụ okwu, akụkọ, ma ọ bụ ahụmahụ ndị mere eme n’ezie mee ihe n’ụzọ ndị ga-enyere gị aka imezu ebumnobi gị dị ka onye ozizi.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Iji ihe ndị a e ji ezi ihe eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị pụrụ ime ka okwu gị makwuo mma, nwee mmetụta ná ndụ ndị mmadụ, ma mee ka ntụziaka ị na-enye bụrụ nke a na-apụghị ichefu echefu. Mgbe e ji ha mee ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, ha pụrụ ịdọpụ uche ná ntụziaka bara uru a na-enye.

IHE atụ bụ ụzọ dị ike nke isi na-ezi ihe. Ha na-akpasukarị ma na-eme ka a nọgide na-enwe mmasị n’ụzọ dị irè nke ukwuu. Ha na-akpali iche echiche. Ha na-akpali mmetụta uche, ya mere, ha nwere ike imetụ akọ na uche na obi mmadụ. Mgbe ụfọdụ, a pụrụ iji ihe atụ merie ajọ mbunobi. Ha bụkwa ihe ndị dị irè, ndị na-enye aka icheta ihe. Ị̀ na-eji ha eme ihe mgbe ị na-ezi ihe?

Atụmatụ okwu bụ ihe atụ ndị na-achọkarị nanị okwu ole na ole; ma ha pụrụ ime ka e jiri uche see onyinyo ndị doro anya. Mgbe e ji nlezianya họrọ ha, ha adịghị achọkebe nkọwa iji ghọta ihe ha pụtara. Ma onye ozizi pụrụ imesikwu uru ha bara ike site n’inye nkọwa dị mkpirikpi. Bible jupụtara n’ọtụtụ ihe atụ ndị ị pụrụ isi na ha mụta ihe.

Malite n’Okwu Ndị Na-ekwu na Ihe Yiri Ihe Nakwa Ndị Na-ekwu na Otu Ihe Bụ Ihe Ọzọ. Okwu ndị na-ekwu na ihe yiri ihe bụ atụmatụ okwu ndị kasị mfe. Ọ bụrụ na ị ka na-amụ otú e si eji ihe atụ eme ihe amụ, ị pụrụ ịhụ na ọ na-enye aka iji ha amalite. A na-ejikarị okwu ndị dị ka “yiri” ma ọ bụ “dị ka” ewebata ha. Mgbe i ji otu ihe na-atụnyere ihe ọzọ dị nnọọ iche, okwu ndị na-ekwu na ihe yiri ihe na-eme ka ihe ha abụọ nwekọrọ ọnụ pụta ìhè. Bible jupụtara n’okwu ihe atụ ndị e si n’ihe ndị e kere eke were—ihe ọ̀kụ̀kụ̀, anụmanụ, na ihe ndị dị na mbara ígwé—tinyekwara ahụmahụ ụmụ mmadụ. N’Abụ Ọma 1:3, a gwara anyị na onye na-agụchi Okwu Chineke anya “ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi,” osisi nke na-amị mkpụrụ, nke na-adịghịkwa akpọnwụ akpọnwụ. E kwuru na onye ajọ omume “dị ka ọdụm” nke na-ede anụ. (Ọma 10:9) Jehova kwere Ebreham nkwa na mkpụrụ ya ga-aba ụba “dị ka kpakpando nke eluigwe” na “dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri.” (Jen. 22:17) Banyere mmekọrịta chiri anya nke Jehova mere ka ọ dị n’agbata ya na mba Izrel, Chineke kwuru, sị: “Dị ka ihe okike na-arapara n’úkwù mmadụ,” otú a ka O mere ka Izrel na Juda rapara n’ahụ́ Ya.—Jer. 13:11.

Okwu ndị na-ekwu na otu ihe bụ ihe ọzọ n’otu aka ahụ na-egosipụta otú ihe abụọ dị nnọọ iche si yie. Ma okwu na-ekwu na otu ihe bụ ihe ọzọ na-enwe mmetụta dị ike karị. Ọ na-ekwu okwu dị ka a ga-asị na otu ihe bụ nke ọzọ, n’ụzọ dịkwa otú a ọ na-ewere ọdịdị nke otu ihe nyefee ọzọ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu bụ ìhè nke ụwa.” (Mat. 5:14) N’ịkọwa mbibi nke okwu a na-achịkwaghị achịkwa pụrụ ịkpata, Jems bụ́ onye na-eso ụzọ dere, sị: “Ire bụ ọkụ.” (Jems 3:6) Devid bụkuru Jehova abụ, sị: “Nkume m dị elu na ebe m e wusiri ike ka Ị bụ.” (Ọma 31:3) Okwu na-ekwu na otu ihe bụ ihe ọzọ bụ́ nke e leziri anya họrọ adịghị achọkebe nkọwa. Ịdị nkenke ya na-eme ka ọ dịkwuo irè. Okwu na-ekwu na otu ihe bụ ihe ọzọ pụrụ inyere ndị na-ege gị ntị aka icheta otu isi ihe karịa otú nanị ikwu ihe mere eme ga-eme.

Egbe okwu bụ ikwufe okwu ókè banyere otú ihe dị, bụ́ nke a na-aghaghị iji mee ihe n’ụzọ akọ, ma ọ bụghị ya, a pụrụ ịghọtahie ya. Jizọs ji atụmatụ okwu a mee ihe iji nye nkọwa a na-apụghị ichefu echefu mgbe ọ jụrụ, sị: “Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa nke di n’anya nwanna gị, ma i chebaraghị ntụhie dị n’anya nke gị echiche?” (Mat. 7:3) Tupu ị nwaa iji atụmatụ okwu a ma ọ bụ ndị ọzọ eme ihe, mụta iji okwu ndị na-egosi na ihe yiri ihe na ndị na-ekwu na otu ihe bụ ihe ọzọ na-eme ihe n’ụzọ dị irè.

Jiri Ihe Atụ Na-eme Ihe. Kama iji atụmatụ okwu na-eme ihe, ị pụrụ ikpebi iji ihe atụ na-eme ihe dị ka ihe iji na-akụzi ihe, ma hà bụ akụkọ e chepụtara echepụta ma hà bụ ihe ndị mere eme. A na-emesibigakarị ya ike ókè, ya mere ọ dị mkpa ka e jiri ha mee ihe n’ụzọ ezi uche dị na ya. E kwesịrị iji ihe atụ ndị dị otú ahụ mee ihe nanị iji kwadoo isi ihe ndị dị mkpa n’ezie, e kwesịkwara ikwu ha n’ụzọ ga-eme ka a na-echeta isi ihe a kụziri, ọ bụghị nanị akụkọ ahụ.

Ọ bụ ezie na ọ bụghị ihe atụ nile ga-abụrịrị ihe ndị mere eme, ha kwesịrị igosipụta àgwà ma ọ bụ ọnọdụ ndị a na-enwe ná ndụ n’ezie. N’ihi ya, mgbe ọ na-akụzi otú e kwesịrị isi na-ele ndị mmehie nwere nchegharị anya, Jizọs mere ihe atụ iji kọwapụta ihe ọ na-ekwu site n’ịkọ banyere ọṅụ nke otu nwoke hụrụ atụrụ ya furu efu. (Luk 15:1-7) N’ịzaghachi otu nwoke nke na-aghọtachaghị ihe Iwu ahụ pụtara mgbe o kwuru ka mmadụ hụ onye agbata obi ya n’anya, Jizọs kọrọ akụkọ banyere onye Sameria nke nyeere otu nwoke e merụrụ ahụ́ aka mgbe onye nchụàjà na onye Livaị na-enyeghịrị ya aka. (Luk 10:30-37) Ọ bụrụ na ị mụta ịbụ onye na-arịba àgwà na omume ndị mmadụ ama nke ọma, ị pụrụ iji ụzọ a e ji ezi ihe mee ihe n’ụzọ dị irè.

Netan onye amụma kọrọ banyere otu ọnọdụ na-emeghị eme iji dọọ Eze Devid aka ná ntị. Akụkọ ahụ dị irè n’ihi na o mere ka a ghara inwe ọnọdụ gaara eme ka Devid gọpụwa onwe ya. Akụkọ ahụ bụ banyere otu ọgaranya nke nwere ọtụtụ atụrụ na otu nwoke dara ogbenye nke nwere nanị otu nne atụrụ ọ na-elekọta nke ọma. Devid n’onwe ya bụbu onye ọzụzụ atụrụ, ya mere ọ ghọtara otú ọ ga-adị onye nwe atụrụ ahụ. Devid were iwe n’ụzọ ziri ezi megide ọgaranya ahụ nke kpụụrụ atụrụ dị oké ọnụ ahịa nke ogbenye ahụ. Netan gwaziri Devid hoo haa, sị: “Gị onwe gị ka nwoke ahụ bụ”! O ruru Devid n’obi, o chegharịkwara n’eziokwu. (2 Sam. 12:1-14) Site n’ịdị na-amụ ya, ị pụrụ ịmụta ime ihe n’ụzọ dị mma n’okwu ndị na-akpali mmetụta uche.

A pụrụ inweta ọtụtụ ihe atụ bara uru iji zie ihe site n’ihe ndị merenụ e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. Jizọs ji okwu ole na ole mee ya mgbe ọ sịrị: “Chetanụ nwunye Lọt.” (Luk 17:32) Mgbe ọ na-akọwa ihe àmà nke ọnụnọ ya, Jizọs zoro aka ‘n’ụbọchị Noa.’ (Mat. 24:37-39) Ná Ndị Hibru isi 11, Pọl onyeozi kpọrọ aha ndị ikom na ndị inyom 16 dị ka ndị bụ́ ihe atụ nke okwukwe. Ka ị na-amụtakwu Bible nke ọma, ị ga-enwe ike inweta ihe atụ ndị dị ike site n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ihe ndị merenụ na ndị mmadụ a kpọrọ aha na ya.—Rom 15:4; 1 Kọr. 10:11.

Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ ịhụ na ọ bara uru iji otu ihe mere eme n’oge a mesie otu ihe mmụta ike. Otú ọ dị, mgbe ị na-eme nke a, lezie anya ka ọ bụrụ nanị ahụmahụ ndị a nwapụtara ịbụ eziokwu ha ka ị ga-eji mee ihe, zerekwa ndị nke nwere onye ha ga-emenye ihere n’ụzọ na-adịghị mkpa n’etiti ndị na-ege gị ntị ma ọ bụ ndị nke ga-abọlite arụmụka ọ na-abụghị ya ka a na-atụle. Chetakwa na ahụmahụ ahụ kwesịrị inwe ihe ọ ga-arụzu. Akọla ụmụ irighiri ihe na-adịghị mkpa bụ́ ndị na-adọpụ uche ná nzube nke okwu gị.

À Ga-aghọta Ya? Ihe atụ ọ bụla i ji mee ihe kwesịrị inwe otu ihe doro anya ọ ga-arụzu. Ọ̀ ga-arụzu ihe ahụ ma ọ bụrụ na i jighị ya mee ihe n’isiokwu ahụ a na-atụle?

Mgbe o zosiri aka n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ dị ka “ìhè nke ụwa,” Jizọs gbakwụnyere okwu ole na ole banyere otú e si eji oriọna eme ihe na ibu ọrụ nke a pụtaara ha. (Mat. 5:15, 16) Mgbe o nyesịrị ihe atụ ya banyere atụrụ furu efu, o kwuziri banyere ọṅụ na-adị n’eluigwe n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ. (Luk 15:7) Mgbe ọ kọsịkwara akụkọ banyere onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi, Jizọs jụrụ onye na-ege ya ntị ajụjụ a kapịrị ọnụ ma jiri ndụmọdụ doro anya sochie ya. (Luk 10:36, 37) N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ọ bụ nanị ndị dị umeala n’obi, ndị jụkwara ajụjụ, ka Jizọs kọwaara ihe atụ ya banyere ụdị ala dị iche iche nakwa banyere ata ndị dị n’ubi, ọ bụghị ìgwè mmadụ ahụ. (Mat. 13:1-30, 36-43) Ụbọchị atọ tupu ọ nwụọ, Jizọs nyere ihe atụ banyere ndị ọrụ ubi vaịn bụ́ ndị ogbu ọchụ. Ọ kọwaghị ya; ọ chọghị nkọwa. “Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii . . . matara na ọ na-ekwu banyere ha.” (Mat. 21:33-45) Ya mere ụdị ihe atụ ọ bụ, omume ndị na-ege ntị, na ebumnobi gị, ha nile ga-ekpebi ma ọ chọrọ nkọwa, ọ bụrụkwa na ọ chọrọ, ókè ọ ga-aha.

Ịzụlite nkà nke iji ihe atụ eme ihe n’ụzọ dị irè na-ewe oge, ma o kwesịrị mgbalị ya. Ihe atụ ndị e ji nlezianya họrọ na-akpali iche echiche ma na-emetụ n’ahụ́. Ihe ọ na-arụpụta bụ na a na-ezi ozi ahụ n’ụzọ dị ike nke na-adịghị ekwekebe omume nanị site n’ikwu ihe mere eme.

ỤZỌ ISI NWETA NDỊ NKE KWESỊRỊ EKWESỊ

  • Na-agụchi Bible anya; rịba ihe atụ dị iche iche dị na ya ama; tụgharịa uche n’uru ihe atụ ndị ahụ bara.

  • Ka ị na-ahụ ihe ndị gbara gị gburugburu, jiri uche na-ejikọta àgwà na omume ndị mmadụ na isiokwu ndị ị gaje ikwu okwu na ha.

  • Nwee ihe ndekọ nke ihe atụ ndị dị irè. Ha pụrụ isite n’ihe ndị ị na-agụ, n’okwu ndị ị na-anụ, ma ọ bụ ihe ndị ị na-ahụ n’onwe gị. Debe ha maka iji ha eme ihe n’ọdịnihu.

IHE OMUME: Nyochaa ihe atụ ndị dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ: Aịsaịa 44:9-20; Matiu 13:44; Matiu 18:21-35. Gịnị ka nke ọ bụla n’ime ha na-akụzi? Gịnị mere o ji dị irè?

Atụmatụ okwu ndị m chọrọ iji mee ihe mgbe m na-ezi ihe

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

Ihe atụ ndị mere eme, ndị m chọrọ icheta ma jiri ha mee ihe

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya