Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa June: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee broshuọ Na-achọ. Gbalịa ịmalite iduziri ha ọmụmụ Bible ebe obibi. July na August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana m Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. September: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe akwụkwọ Amụma Daniel ma ọ bụ broshuọ Nọrọ na Nche.
◼ E kwesịrị inwe akwụkwọ ahụ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova n’ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ị pụrụ inwetakwu ihe ọmụma banyere ọ́bá akwụkwọ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ozi Alaeze Anyị nke February 2003, peeji nke 5, nakwa n’Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke April 1997.
◼ Odeakwụkwọ kwesịrị ịhụ na a na-eme ka alaka ụlọ ọrụ mara banyere ọnọdụ nke ndị nkwusa nile e mere baptizim, bụ́ ndị ziteworo fọm Application for Kingdom Hall Construction Volunteer Program (A-25). Mgbe e nwere mgbanwe n’ọnọdụ nke onye ọrụ afọ ofufo, dị ka mgbe ọ kwagara ebe ọzọ ma ọ bụ mgbe a họpụtara ya dị ka ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye, o kwesịrị idejupụta fọm ọhụrụ ozugbo ma zite ya. Ọ bụrụ na adres ma ọ bụ nọmba fon nke onye ọrụ afọ ofufo agbanwee, ma ọ bụkwanụ na o nwere nsogbu n’ọgbakọ, ndị okenye kwesịrị ime ka alaka ụlọ ọrụ mara ozugbo.
◼ Compact Disc Ndị Ọhụrụ A Na-egere Egere E Nwere:
Doing God’s Will With Zeal—Bekee
Families—Make Daily Bible Reading Your Way of Life—Bekee
Keep Your Eye Simple—Bekee
Learn From the Great Teacher (disc asaa dị n’otu ọ́bọ́)—Bekee
Why Respect Theocratic Arrangements?—Bekee
◼ DVD Ndị Ọhụrụ E Nwere:
Noah Walked With God—David Trusted in God—Bekee
Young People Ask—What Will I Do With My Life?—Bekee
IHE ỊRỊBA AMA: Ị pụrụ ịtụ ọda maka DVD abụọ ahụ ma ọ bụrụ na i nwere ngwá e ji akpọ DVD. Nke a na ngwá e ji akpọ CD ma ọ bụ VCD abụghị otu.