Chekwaa Ya
Ụzọ Ndị A Tụrụ Aro Ha Isi Na-enyefe Broshuọ
A tụrụ ọtụtụ aro n’ihe ntinye a iji nyere gị aka ịkwadebe ụzọ ị ga-esi nyefee broshuọ dị iche iche. Unu pụrụ ịgbanwetụ ha ka ha wee kwekọọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala unu. A pụkwara iji ụzọ ndị ọzọ e si enyefe broshuọ mee ihe. A pụrụ ilere anya n’aro ndị a tụrụ n’ihe ntinye a wee kwadebe ụzọ a ga-esi nyefee broshuọ ndị a na-edepụtaghị n’ebe a.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke January 2005, peeji nke 8.
Nke ọ bụla n’ime aro ndị a tụrụ na peeji a nwere (1) ajụjụ na-akpali echiche bụ́ nke a pụrụ iji malite nkwurịta okwu, (2) ebe ị ga-aga na broshuọ ndị ahụ iji nweta ihe ị ga-eji kwuo okwu, na (3) akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị ị pụrụ ịgụ mgbe ị na-enyefe broshuọ ahụ. Ị pụrụ iji aka gị chepụta ihe ndị ọzọ ị ga-ekwu mgbe ị na-enyefe broshuọ ndị ahụ, dabere n’otú onye nwe ụlọ si meghachi omume.
Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile
“Ì chere na Bible nwere ndụmọdụ ndị bara uru n’oge anyị a?”—peeji nke 22, okwu nkọwa; peeji nke 23, para. 3 nke igbe; Ilu 25:11.
Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi
“Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị maara ekpere ahụ e ji “Nna anyị Nke bi n’eluigwe, Ka e doo aha Gị nsọ,” ebido. (Mat. 6:9, Bible Nsọ nke Union Version) Ma, ị̀ ma na nzọpụta anyị dabeere n’ịmara aha ahụ?”—peeji nke 28, para. 1; Rom 10:13.
Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ
“Taa, anyị na-ekesa broshuọ a nke kasịworo ọtụtụ nde ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụworo obi ma mee ka ha nwee olileanya. Ì chetụwo echiche banyere ihe bụ́ olileanya nke ndị nwụrụ anwụ?”—peeji nke 27, para. 2; Jọn 5:28, 29.
“Ọ̀ dịtụla mgbe ị nọ na-eche otú ị ga-esi kasie onye onye ọ hụrụ n’anya nwụnahụrụ obi?”—peeji nke 20, para. 1; Ilu 17:17.
Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
“Mgbe ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ, ọ bụ ihe e bu pụta ụwa ịnọ na-eche ebe ha nọ nakwa ma ọ̀ dị mgbe anyị ga-ahụ ha ọzọ. Ì chetụwo echiche banyere ajụjụ ndị dị otú ahụ?”—Ajụjụ ndị dị n’azụ broshuọ a; Job 14:14, 15.
Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?
“Ndị mmadụ nwere echiche dị iche iche banyere onye Chineke bụ n’ezie. Ì chere na ihe anyị kweere dị ihe o mere?”—peeji nke 3, para. 3, 7-8; Jọn 17:3.
Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị Ebi!
“Ụfọdụ mmadụ chere na ha aghaghị ịga eluigwe tupu ha adị ndụ ebighị ebi. Ma, olee ihe i chere banyere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa?”—Ihe osise dị n’ihu broshuọ a; Mkpu. 21:4.
Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs
“Ọ na-agụsi ọtụtụ ndị agụụ ike ịhụ ihe ngwọta nke nsogbu ndị anyị na-enwe taa. Ì chere na ọ dị mgbe a ga-enwe ọchịchị nke ga-enwe ike imeri ihe ịma aka a?”—peeji nke 3, para. 1; Mat. 6:9, 10.
“Lee! Ana m Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ”
“Ikekwe ị na-echegbu onwe gị, dịkwa ka mụ onwe m na-echegbu, banyere echiche rụrụ arụ jupụtara ebe nile n’oge a nakwa mmetụta ọ na-enwe ebe ụmụ anyị nọ. Ị̀ ma na e buru nke a n’amụma n’otu akwụkwọ a malitere ide ogologo oge tupu eguzobe Alakuba, Iso Ụzọ Kraịst, na okpukpe Hindu?”—p. 25, para. 4; 2 Tim. 3:1-3.