Aro Ndị A Tụrụ Banyere Ụzọ A Ga-esi Na-enyefe Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
Mgbe ị kọsịrị otu ọdachi a kọrọ banyere ya n’akụkọ ụwa, ị pụrụ ikwu, sị:
“Ọ̀ dịtụwo mgbe i chere banyere ihe mere Chineke ji kwere ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ma ọ bụrụ na ọ na-eche banyere anyị n’ezie? [Chere ka ọ zaa.] Broshuọ a zara ajụjụ ahụ n’ụzọ na-eju afọ ma gosi ihe Chineke ga-eme n’ọdịnihu dị nso. [Gosi ya ihe osise dị na peeji nke 27, ma gụọ Abụ Ọma 145:16 otú ahụ e si depụta ya na paragraf nke 22.] Olee otú Chineke ga-esi mee ka ihe a kpọrọ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ nile ha nọworo na-ata? Aga m enwe mmasị ịza ajụjụ a n’oge ọzọ m ga-abịa.” Nyefee ya broshuọ ahụ, ma mee ndokwa ịbịaghachi.
Mgbe ị gaghachiri, ị pụrụ ikwu, sị:
“N’oge mbụ m bịara, anyị gụrụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ a. [Gụọ ma ọ bụ hota Abụ Ọma 145:16.] Mgbe a gụsịrị ya, ajụrụ m gị, sị: Olee otú Chineke ga-esi mee ka ihe a kpọrọ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ nile ha nọworo na-ata?” Gwa ya ka o weta broshuọ nke ya. Mgbe ahụ, sapeta peeji nke 27-28, ma mụọnụ paragraf nke 23-25. Gwa ya na ọ ga-amasị gị iduziwere ya ọmụmụ Bible, ma ọ bụ mee ndokwa ka unu mụọ paragraf nke 26-27 n’oge ọzọ ị ga-abịa.
Onye nkwusa dị afọ iri na ụma pụrụ ikwu, sị:
“Ọtụtụ ndị ọgbọ m na-echegbu onwe ha banyere ihe ụwa ga-adị ka ya n’afọ 10 ma ọ bụ n’afọ 15 na-abịanụ. Olee ihe i chere ndụ ga-adị ka ya mgbe ahụ? [Chere ka ọ zaa.] Nsogbu ndị anyị na-ahụ taa na-egosi na anyị na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ. [Gụọ 2 Timoti 3:1-3.] Broshuọ a zara ajụjụ ndị na-esonụ. [Gụpụta ajụjụ ndị dị n’ihu broshuọ ahụ, ma nyefee ya.] N’oge ọzọ m ga-abịa, ọ bụrụ na i nwetụrụ oge, aga m eme ka ị mara banyere otú ọrịa na ịka nká ga-esi abịa ná njedebe.” Mee ndokwa ịbịaghachi.
Mgbe ị gaghachiri, ị pụrụ ikwu, sị:
“N’oge ikpeazụ anyị kwurịtara okwu, agwara m gị na aga m eme ka ị mara banyere otú ọrịa na ịka nká ga-esi abịa ná njedebe. A kọwara ya na broshuọ a.” Gwa ya ka o weta broshuọ nke ya. Mgbe ahụ, gụọ ma kọwaara ya paragraf nke 6-7, nke dị na peeji nke 23-24. Mee ndokwa ka unu mụọ paragraf nke 8-9 n’oge ọzọ ị ga-abịa.
Mgbe onye toro eto na nwatakịrị so na-eje ozi, onye ahụ toro eto pụrụ ikwu aha ya na nke nwatakịrị ahụ, ma kwuo, sị:
“Biko, ________ ga-enwe mmasị ịgụrụ gị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. [Nwa ahụ agụọ Abụ Ọma 37:29 ma kọwaa ya n’ụzọ dị nkenke.] Broshuọ a na-atụle otú Chineke ga-esi mezuo nzube ya banyere ihe a kpọrọ mmadụ na ụwa. [Gosi ya ihe osise ndị dị na peeji nke 24-27.] N’oge ọzọ anyị ga-abịa, obi ga-adị m ụtọ igosi gị nkwa magburu onwe ya e kwere na Bible banyere mbilite n’ọnwụ.” Nyefee broshuọ ahụ, ma mee ndokwa ịbịaghachi.
Mgbe unu gaghachiri, onye ahụ toro eto pụrụ ikwu, sị:
“N’oge ikpeazụ m bịara, anyị gụrụ Abụ Ọma 37:29. Agwakwara m gị na obi ga-adị m ụtọ igosi gị nkwa magburu onwe ya e kwere na Bible banyere mbilite n’ọnwụ. Lee ihe e kwuru ebe a.” Gwa ya ka o weta broshuọ nke ya. Mgbe ahụ, mụọrọ ya paragraf nke 12-14, nke dị na peeji nke 24-25. Gwa ya na ọ ga-amasị gị iduziwere ya ọmụmụ Bible, ma ọ bụ mee ndokwa ka unu mụọ paragraf nke 15-16, n’oge ọzọ ị ga-abịa.