Aro Ndị A Tụrụ Banyere Ụzọ A Ga-esi Na-enyefe Gịnị Bụ Nzube Nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
Mgbe i kelesịrị onye nwe ụlọ, ị pụrụ ikwu, sị:
“Ndụ a na-adị taa jupụtara ná nsogbu na ihe agaghị ka e si chee ya. Ì chere na ọ bụ otú a ka e bu n’uche ka ndụ dịrị? [Chere ka ọ zaa.] Broshuọ a na-egosi na a ka ga-emezu nzube mbụ Chineke nwere maka ihe a kpọrọ mmadụ na ụwa a. [Kọwaa ihe osise dị na peeji nke 20-21. Mgbe ahụ, gụọ paragraf nke 9, na-eme ka Aịsaịa 14:24 na Aịsaịa 46:11 pụta ìhè.] N’oge ọzọ m ga-abịa, aga m enwe mmasị igosi gị ebe Bible kwuru na Chineke ga-eme ka ụwa bụrụghachi Paradaịs.” Nyefee ya broshuọ ahụ ma kwe ya nkwa na ị ga-abịaghachi.
Mgbe ị gaghachiri, ị pụrụ ikwu, sị:
“N’oge mbụ m bịara, ekwuru m na nzube Chineke bụ ka ụmụ mmadụ dị ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. [Gosighachi ya ihe osise dị na peeji nke 20-21.] Rịba ama na Jizọs, Pita, na Devid kwuru banyere Paradaịs.” Gwa ya ka o weta broshuọ nke ya. Mgbe ahụ sapeta peeji nke 21-22, ma tụlee paragraf nke 10-13. Gwa ya na ọ ga-amasị gị iduziwere ya ọmụmụ Bible, ma ọ bụ mee ndokwa ka unu tụlee otu n’ime isiokwu nta ndị dị na peeji nke 29-30 n’oge ọzọ ị ga-abịa.
Onye nkwusa dị afọ iri na ụma pụrụ ikwu sị:
“Ọtụtụ ndị ọgbọ m na-enwe obi abụọ banyere ọdịnihu. Ì chere na ndụ ọgbọ na-abịanụ ga-ebi ga-aka mma? [Chere ka ọ zaa.] Bible kwuru banyere ọdịnihu dị mma nye ihe nile a kpọrọ mmadụ. [Gosi ya ihe osise dị na peeji nke 31 nke broshuọ ahụ, ma gụọ ihe e dere iji kọwaa ya. Mgbe ahụ, gụọ 2 Pita 3:13.] Broshuọ a na-ekwu banyere ngọzi dị iche iche Chineke debeere ihe a kpọrọ mmadụ. [Mee ka isiokwu nta ndị ahụ e dere n’aka akwụkwọ okpotokpo, bụ́ ndị dị na peeji nke 29-30, pụta ìhè, ma nyefee broshuọ ahụ.] Aga m enwe mmasị ịbịa ọzọ iji kọọrọ gị nkwa Chineke kwere banyere ime ka agha nile kwụsị.” Mee ndokwa ịbịaghachi.
Mgbe ị gaghachiri, ị pụrụ ikwu, sị:
“N’oge mbụ m bịara, agwara m gị n’ụzọ dị nkenke banyere nzube Chineke ime ka ụwa bụrụghachi paradaịs. [Gosighachi ya ihe osise ahụ dị na peeji nke 31.] Ọ ga-amasị m ịma ihe i chere banyere nkwa Chineke na-ekwe ime ka agha nile kwụsị.” Gwa ya ka o weta broshuọ nke ya. Mgbe ahụ, gụọ ma kọwaa paragraf nke 3-6, bụ́ ndị dị na peeji nke 29. Mee ndokwa ka unu mụọ paragraf nke 7-8 n’oge ọzọ ị ga-abịa.
Mgbe onye toro eto na nwatakịrị so na-eje ozi, onye ahụ toro eto pụrụ ikwu aha ya na nke nwatakịrị ahụ ma kwuo, sị:
“Biko, ________ ga-enwe mmasị igosi gị otu ihe osise ma gụọrọ gị otu amaokwu Bible. [Nwa ahụ egosi onye nwe ụlọ ihe osise ahụ ma gụọ ihe e dere iji kọwaa ya, bụ́ nke dị na peeji nke 31, ma gụzie Mkpughe 21:4.] Broshuọ a na-akọwa ihe Chineke ga-eme banyere nsogbu ndị anyị na-enwe taa. [N’ụzọ dị nkenke, mee ka isiokwu nta ndị ahụ e dere n’aka akwụkwọ okpotokpo, bụ́ ndị dị na peeji nke 29-30 pụta ìhè, ma nyefee broshuọ ahụ.] Anyị bịa ọzọ, aga m egosi gị ihe Bible na-ekwu banyere otú ụdị ọrịa nile ga-esi abịa ná njedebe.”
Mgbe unu gaghachiri, onye ahụ toro eto pụrụ ikwu, sị:
“Ná mkparịta ụka ikpeazụ anyị nwere, agwara m gị na aga m egosi gị ihe Bible na-ekwu banyere otú ụdị ọrịa nile ga-esi abịa ná njedebe. Rịba ama ihe e kwuru ebe a.” Gwa ya ka o weta broshuọ nke ya. Mgbe ahụ, unu tụlee paragraf nke 9-14, bụ́ nke dị na peeji nke 29. Gwa ya na ọ ga-amasị gị iduziwere ya ọmụmụ Bible, ma ọ bụ mee ndokwa ka unu mụọ paragraf nke 15-17 n’oge ọzọ ị ga-abịa.