Broshuọ Maka Ndị Na-anọghị n’Okpukpe Ndị Kraịst
Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
Mgbe ị na-agbara onye na-ekpe okpukpe ọdịnala ndị Africa àmà, ị pụrụ ikwu, sị:
“Ọtụtụ mmadụ na-efe ndị nna nna ha ofufe. Ọtụtụ omenala olili ozu na-adabere n’ofufe ndị nna ochie. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji efe ndị nna nna ha ofufe ma ọ bụ na-akwanyere ha ùgwù? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ paragraf nke 1 na nke 2, bụ́ ndị dị na peeji nke 12 nke broshuọ ahụ.] Ndị nna nna anyị hà nwụrụ anwụ, hà ma ihe anyị na-eme? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ Eklisiastis 9:5, 10.] Ebe ọ bụ na ha amaghị ihe ọ bụla, ọ gaghị adị mma ife ha ofufe. Ị pụrụ ịgụkwu banyere ya n’ihe ọmụmụ nke 4 nke broshuọ a.”
The Guidance of God—Our Way to Paradise
Mgbe ị na-agwa onye Alakụba okwu, ị pụrụ ikwu, sị:
“Ana m eme mgbalị pụrụ iche iso ndị Alakụba kwurịta okwu. Aghọtara m na ndị Alakụba kweere n’otu ezi Chineke, kwerekwa ná ndị amụma nile. Ihe m kwuru ọ̀ bụ eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] Ọ ga-amasị m ịkọrọ gị banyere amụma e buru n’oge ochie nke kwuru banyere ịgbanwe ụwa ka ọ ghọọ paradaịs. Ọ̀ bụ m gụọrọ gị ihe onye amụma ahụ dere? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ Aịsaịa 11:6-9.] Amụma a na-echetara m otu ihe e si na Koran nweta bụ́ nke e dere na broshuọ a.” Sapeta peeji nke 9, ma gụọ ihe ahụ e dere n’aka akwụkwọ okpotokpo bụ́ nke e si na Koran nweta. Ọ bụrụ na o gosiri mmasị, gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ site n’ịtụle paragraf nke 7-9, bụ́ ndị dị na peeji nke ọzọ.