Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite na February 13
Abụ nke 121
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa February. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke February 15 na Teta! nke January-March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe onye nkwusa na-eje ozi n’ebe ọhaneze na-anọkarị.
Minit 10: Ị̀ Na-esochi Nzukọ Jehova Anya? Okwu nke dabeere n’akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 7-10.
Minit 25: “Mee Ka Ndị Mmadụ Mara Banyere ‘Ìhè nke Ụwa.’”a Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Maa ọkwa aha ndị tinyere akwụkwọ maka ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Kwuo ndokwa ndị ọzọ e mere maka nzukọ ije ozi ubi. Kwuo okwu banyere ihe atụ nke usoro a ga-agbaso iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka bụ́ nke dị na peeji nke 5 nke ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke February 2005.
Abụ nke 224 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na February 20
Abụ nke 89
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
Minit 15: “Akwụkwọ Bible Na-akụzi—Akwụkwọ Bụ́ Isi Anyị Ga-eji Na-eduzi Ọmụmụ Bible.”b Mee ka ọ gụsiwe ndị na-ege ntị agụụ ike ịmalite jiri akwụkwọ ahụ e wepụtara ọhụrụ duziwe ọmụmụ Bible.
Minit 20: “Onye Dị Njikere Inye Aka Mgbe Nile.”c Ọ bụ okenye ga-eme ya. Kwuo okwu dị nkenke bụ́ nke ga-adabere n’Igbe Ajụjụ ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị nke November 1998 nakwa na nke November 2000.
Abụ nke 1 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na February 27
Abụ nke 20
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa February. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke March 1 ma ọ bụ Teta! nke January-March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.
Minit 10: Mkpa ọgbakọ.
Minit 25: Otú A Ga-esi Na-enyefe Akwụkwọ Bible Na-akụzi. N’ọnwa March, anyị ga-enyefe akwụkwọ ahụ e wepụtara ọhụrụ. Mee ọtụtụ ihe ngosi ndị a kwadebere nke ọma, bụ́ ndị dabara n’ókèala unu, banyere ụzọ a ga-esi nyefee ya. Malite site n’ikwu isi ihe ndị dị na peeji nke 4-5. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ egosi mmasị pụrụ iche n’otu n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ, gosi ya ihe Bible na-akụzi n’isiokwu ahụ site n’ịtụle paragraf ndị dị n’ime akwụkwọ ahụ, bụ́ ndị kọwara akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ. (Mkpu. 21:4, p. 27-28, para. 1-3; Aịsa. 33:24; 35:5, 6, p. 36, para. 22; Jọn 5:28, 29, p. 72-73, para. 17-19; Ọma 72:16, p. 34 para. 19) Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị bụ́ ịgba ha nwetarala site n’iji akwụkwọ ọhụrụ a mee ihe, karịsịa ọmụmụ Bible ndị ha jirila ya malite.
Abụ nke 148 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na March 6
Abụ nke 51
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ebe ọ bụ na traktị na-adị mfe iji n’aka ma na-enwe ihe osise ndị na-adọrọ mmasị, ọ bara uru iji ha malite nkwurịta okwu mgbe anyị na-aga ozi ụlọ n’ụlọ, mgbe anyị na-ezi ozi ọma n’ebe ọhaneze na-anọkarị, na mgbe anyị na-agba àmà n’oge anyị na-anọghị n’ozi. Mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi jiri traktị ọhụrụ bụ́ Ahụhụ Nile Ga-akwụsị n’Isi Nso! malite nkwurịta okwu. Kwuo okwu n’otu n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e hotara na peeji nke 2 nke traktị ahụ.
Minit 15: “Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ime Nkwadebe.”d Mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke ebe ndị nkwusa abụọ na-akwadebe otú ha ga-esi nyefee akwụkwọ Bible Na-akụzi, ha ga-elekwasị anya na peeji nke 82-84, ma gụọ paragraf nke 21. Ihe ngosi ahụ ga-abịa ná njedebe mgbe ha na-achọ iji olu dara ụda mụgharịa ụzọ ahụ ha kwadebere isi nyefee akwụkwọ ahụ.
Minit 20: “Jiri Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Na-akụzi Ihe.”e Ka ị na-ekwu okwu na nke ọ bụla n’ime vidio ndị a kpọtụrụ aha n’isiokwu a, gosi ndị na-ege ntị mkpo ya ma gụọ obere ihe e dere n’azụ ya nke na-akọwa ihe e gosiri na vidio ahụ. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetarala site n’iji vidio na-eme ihe n’ozi ubi.—Lee 1997 Yearbook, p. 54, na 1995 Yearbook, p. 50-51.
Abụ nke 68 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.