Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/06 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 5/06 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, tinyere ndị bịara ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ, ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, lekwasị anya n’inyefe akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Nzube anyị kwesịrị ịbụ iji akwụkwọ ahụ malite ọmụmụ Bible. June: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ. July na August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Ịdị Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị Ebi!, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ́? Hà Dị Adị n’Ezie?, Nọrọ na Nche!, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.

◼ Ebe ọ bụ na July nwere ngwụsị izu ise zuru ezu, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.

◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ bụla ọ họpụtara kwesịrị inyocha ihe ndekọ ego ọgbakọ na June 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere mee. Ọ bụrụ na unu nwere ihe ndekọ ego dị iche, dị ka nke ego e ji elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ nke ego ihe owuwu, e kwesịrị ime ndokwa ka e nyochaa ya. Mgbe e mesịrị nke a, e kwesịrị ịmara ọgbakọ ọkwa ya mgbe a na-agụ akụkọ ndekọ ego ọzọ.

◼ Tupu ọgbakọ arụwa Ụlọ Nzukọ Alaeze—ma ọ bụ nke ọhụrụ ma ọ bụkwanụ nke a na-arụzigharị arụzigharị—ndị okenye kwesịrị ịkpọtụrụ ụmụnna ha na Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-arụkọ ọrụ n’ógbè ha. Nke a metụtakwara ịzụ ma ọ bụ ire ala. Ụmụnna ha na Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-arụkọ ọrụ pụrụ inyere ọgbakọ aka ná mkpebi ndị ha na-eme n’ihe gbasara ala, nyekwara ha aka, ma eleghị anya, iru eru inweta Ụlọ Nzukọ Alaeze.

◼ A na-atụ aro ka a na-ezitere alaka ụlọ ọrụ fọm ndị chọrọ ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ oge nile dejupụtara, ọ dịkarịa ala iri ụbọchị atọ tupu ụbọchị ha chọrọ ịmalite eruo. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịtụleghachi fọm ndị ahụ iji jide n’aka na e dejupụtara ha nke ọma. Ọ bụrụ na ndị dejupụtara ya apụghị icheta kpọmkwem ụbọchị e mere ha baptizim, ha kwesịrị ịhọrọ otu ụbọchị ma buru ya n’uche. Odeakwụkwọ kwesịrị idetu ụbọchị ahụ na Congregation’s Publisher Record (S-21).

◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:

New World Translation of the Holy Scriptures (bi12 nke mkpo ya dị fere fere)—Bekee

Watch Tower Publications Index 2003—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America

◼ Kaseti Ọhụrụ A Na-egere Egere E Nwere:

Kwanyere Ịbụisi Jehova Ùgwù—nke Dị na Kaseti A Na-egere Egere (Ihe nkiri, ọ dị otu kaseti)—Igbo

◼ DVD Ọhụrụ E Nwere:

Sing Praises to Jehovah—On DVD, Mpịakọta nke 3—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America

◼ Akwụkwọ Ndị E Nwere Ugbu A:

Hellfire—Is It Part of Divine Justice? (maka ndị Alakụba) (Traktị No. 74)—Bekee

Sing Praises to Jehovah (Akwụkwọ abụ ukwu)—Yoruba

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya