Onye Ndị Nọ n’Afọ Ndụ Nile Kwesịrị Iṅomi
Ya na Chineke nwere mmekọrịta chiri anya. O tinyere ndụ ya nile n’ime uche Jehova. Ya na “Chineke yịkọrọ na-ejegharị,” a gọzikwara ya n’ihi ime otú ahụ. Ọ bụ Noa ka a na-ekwu banyere ya. O setịpụrụ ihe nlereanya ma okenye ma nwata kwesịrị iṅomi. (Jen. 6:9) Vidio bụ́ Noah—He Walked With God ga-enyere gị aka ịhụ ụdị ndụ Noa biri, ihe mere o ji ruo eruo inweta ngọzi Jehova, na otú ị pụrụ isi ṅomie àgwà ọma ya.
Kirie vidio ahụ, ma jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: (1) Olee ihe ọjọọ ndị mmụọ ozi ụfọdụ mere, oleekwa ndị bụ́ ndị Nefilim? (Jen. 6:1, 2, 4) (2) Gịnị mere àgwà ndị mmadụ ji jọgbuo onwe ya, oleekwa otú nke a mere ka obi dị Chineke? (Jen. 6:4-6) (3) Olee ihe mere Noa ji dị iche? (Jen. 6:22) (4) Olee otú e si bibie ndị ọjọọ ahụ? (Jen. 6:17) (5) Olee otú ụgbọ ahụ há? (Jen. 6:15) (6) Gịnị ọzọ ka Noa mere, oleekwa otú ndị mmadụ si meghachi omume banyere ya? (Mat. 24:38, 39; 2 Pita 2:5) (7) Ole ole ka e tinyere ụdị anụmanụ nke ọ bụla n’ime ụgbọ ahụ? (Jen. 7:2, 3, 8, 9) (8) Ụbọchị ole ka mmiri ahụ zoro, ụbọchị ole ka mmiri ahụ nọkwara tupu ya ataa? (Jen. 7:11, 12; 8:3, 4) (9) Gịnị mere na Noa na ezinụlọ ya esoghị ná ndị iju mmiri ahụ gburu? (Jen. 6:18, 22; 7:5) (10) Olee ebe ụgbọ ahụ kwụsịrị? (Jen. 8:4) (11) Olee otú Noa si mara na ha nweziri ike isi n’ụgbọ ahụ pụta? (Jen. 8:6-12) (12) Olee ihe Noa mere mgbe o si n’ụgbọ ahụ pụta? (Jen. 8:20-22) (13) Olee ihe eke na egwurugwu ahụ nọchiri anya ya? (Jen. 9:8-16) (14) Gịnị ka mmadụ ‘na Chineke ịyịkọ na-ejegharị’ pụtara? (Jen. 6:9, 22; 7:5) (15) Gịnị ka a chọrọ anyị n’aka iji hụ Noa na Paradaịs? (Mat. 28:19, 20; 1 Pita 2:21)
Gịnị ka ihe e dekọrọ na Bible banyere Noa, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị ma na-erube isi, kụziiri gị banyere otú gị onwe gị na Chineke pụrụ isi ‘yịrị na-ejegharị’ nakwa otú ị pụrụ isi nwee obi ike na Jehova nwere ike nke ịnapụta ndị ya n’oge anyị a?—Jen. 7:1; Ilu 10:16; Hib. 11:7; 2 Pita 2:9.