Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/06 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na July 10
  • Izu Na-amalite na July 17
  • Izu Na-amalite na July 24
  • Izu Na-amalite na July 31
  • Izu Na-amalite n’August 7
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 7/06 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na July 10

Abụ nke 4

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa July. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche July 15 na Teta! July-September. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi otú a ga-esi zaghachi mgbe onye nwe ụlọ kwuru, sị, “Anyị aghọworị Ndị Kraịst n’ebe a.”—Lee akwụkwọ bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, p. 11.

Minit 15: Otú E Si Hazie Ma Na-achịkwa Ọgbakọ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’isi nke 4 nke akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.

Minit 20: “Mee Ka Ha Ghọta Ma Nwee Ekele Maka Àgwà Jehova Ndị Na-enweghị Atụ.”a Mee ihe ngosi nke ebe e ji ajụjụ enyere onye a na-amụrụ Bible aka ịtụgharị uche n’isi ihe ndị dị n’igbe ntụleghachi nke dị ná ngwụsị isi nke 1 nke akwụkwọ Bible Na-akụzi.

Abụ nke 88 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na July 17

Abụ nke 99

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’ụzọ dị nkenke, tụlee ihe dị na peeji nke 32 nke Ụlọ Nche August 15, 2000. Mee ka ọ pụta ìhè uru ọ bara ịdị na-agụ Bible kwa ụbọchị, ọbụna n’oge ezumike ma ọ bụ n’oge ndị ọzọ anyị na-anọghị n’ọrụ.

Minit 15: Ịhụnanya na Umeala n’Obi—Àgwà Ndị Dị Oké Mkpa n’Ozi Anyị. Okwu dabeere n’Ụlọ Nche August 15, 2002, peeji nke 18-20, paragraf nke 13-20.

Minit 20: “Na-eṅomi Jehova Chineke Anyị, Bụ́ ‘Onye Obi Ụtọ.’ ”b Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe na-enyere ha aka ịnọgide na-enwe obi ụtọ mgbe ha na-ekwusa ozi ọma n’ókèala ha.

Abụ nke 189 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na July 24

Abụ nke 218

Minit 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche August 1 na Teta! July-September. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. Mgbe e mesịrị ihe ngosi nke ọ bụla, kwughachi okwu mmalite nke ihe ngosi ahụ, bụ́ nke e ji kpalie mmasị onye nwe ụlọ.

Minit 10: “Ha Esetịpụla Ihe Nlereanya Ma A Bịa n’Ikwesị Ntụkwasị Obi.” Okwu a ga-agụnye ịkọ ahụmahụ ole na ole e bipụtara ebipụta banyere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ma ọ bụ ịgba onye ọsụ ụzọ pụrụ iche ọ bụla na-eje ozi n’ọgbakọ unu ajụjụ ọnụ.—Lee Watch Tower Publications Index n’okpuru isiokwu bụ́ “Special Pioneers” (Ndị Ọsụ Ụzọ Pụrụ Iche).

Minit 20: Bụrụnụ Ndị Na-eguzosi Ike, Ndị A Na-apụghị Ịkwapụ Akwapụ. (1 Kọr. 15:58) Gbaa ndị nkwusa ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ abụọ ma ọ bụ atọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị jirila ikwesị ntụkwasị obi jee ozi ruo ọtụtụ afọ. Olee otú ha si nata eziokwu? Olee otú e si ekwusa ozi ọma mgbe ha malitere ime nkwusa? Olee ihe ịma aka ndị ha nwetarala? Olee ngọzi ndị ha nwetarala n’ihi ịnọgidesi ike n’ezi ofufe?

Abụ nke 12 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na July 31

Abụ nke 28

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa July. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa August.

Minit 15: Mkpa ọgbakọ.

Minit 20: “Jiri Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe, Nwetakwa Ọtụtụ Ngọzi.”c Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ mgbalị ndị ha merela iji malite ma nọgide na-eme ihe ndị metụtara ofufe Chineke na ngọzi ndị ha nwetarala n’ihi ime otú ahụ.

Abụ nke 130 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite n’August 7

Abụ nke 209

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. N’ụzọ dị nkenke, kwuo otú a pụrụ isi jiri aro ndị a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị banyere ụzọ a pụrụ isi nyefee akwụkwọ mee ihe n’ókèala unu dabere ná mkpa e nwere na ya.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke January 2005, p. 8.

Minit 15: Nzukọ Ndị Na-akpali Anyị Inwe Ịhụnanya na Ịrụ Ezi Ọrụ. Okwu dabeere n’Ụlọ Nche March 15, 2002, peeji nke 24-25. Gụnye ajụjụ ọnụ dị mkpirikpi. Onye nkwusa a na-agba ajụjụ ọnụ a ga-akọ mgbalị ọ na-eme iji na-agachi nzukọ anya, nakwa uru ndị o riterela site n’ime otú ahụ.

Minit 20: Na-enwe Ọganihu Ma Dị Njikere Ime Mgbanwe n’Ozi Anyị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke dabeere n’Ụlọ Nche December 1, 2005, peeji nke 28-30. Mgbe ị na-ekwu banyere ihe dị na paragraf nke 6-11, mee ka ọ pụta ìhè otú Pọl si lebara ihe ndị na-ege ya ntị kweere anya, otú o si mee ka okwu ya kwekọọ n’ọnọdụ e nwere, na otú o si chepụta ụzọ dị iche iche ọ ga-esi gwa ndị na-ege ya ntị okwu mgbe ọ na-ezi ha ozi ọma na mgbe ọ na-ezi ha ihe. Jụzie ndị na-ege ntị ajụjụ nke paragraf nke 12-14, kwuokwa otú a pụrụ isi jiri ihe dị na paragraf ndị ahụ mee ihe n’ókèala unu. Mee ihe ngosi nke ga-eme ka a hụ otú ndị nkwusa pụrụ isi gbanwee ụzọ ha si ezi ozi ọma dabere ná mkpa na ọnọdụ e nwere, nakwa n’omenala nke ndị bi n’ókèala unu.

Abụ nke 83 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya