Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa July na August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Ịdị Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị Ebi!, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ́? Hà Dị Adị n’Ezie?, Nọrọ na Nche!, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. September: A ga-enyefe akwụkwọ Bible Na-akụzi. E kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche iji malite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible n’oge mbụ anyị nyefere ha akwụkwọ a. Anyị kwesịrị ịgaghachi ozugbo na nke ndị natara ya iji malitere ha ọmụmụ Bible ebe obibi. October: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! N’ebe e gosiri mmasị, biko webata broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche.
◼ Malite na September, ndị nlekọta sekit ga-ekwu okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “Gịnị Bụ Ọnọdụ Gị n’Ebe Chineke Nọ?”
◼ Malite n’izu January 8, 2007, anyị ga-amụ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ọgbakọ nile kwesịrị ịhụ na ha nwere ole ga-ezuru ha tupu oge a ga-amalite ịmụ akwụkwọ ahụ eruo.
◼ A na-atụ aro ka a na-ezitere alaka ụlọ ọrụ fọm ndị chọrọ ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ oge nile dejupụtara, ọ dịkarịa ala iri ụbọchị atọ tupu ụbọchị ha chọrọ ịmalite eruo. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ileba anya na fọm ndị ahụ iji jide n’aka na e dejupụtara ha nke ọma. Ọ bụrụ na ndị dejupụtara ya apụghị icheta kpọmkwem ụbọchị e mere ha baptizim, ha kwesịrị ịhọrọ otu ụbọchị ma buru ya n’uche. Odeakwụkwọ kwesịrị idetu ụbọchị ahụ na kaadị Congregation’s Publisher Record (S-21) nke onye ahụ.
◼ Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịhụ na e nwere Pioneer Appointment Letter (Akwụkwọ Ozi E Ji Ahọpụta Ndị Ọsụ Ụzọ) (S-202) maka onye ọsụ ụzọ oge nile ọ bụla nọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na unu enweghị ya, unu kwesịrị idetara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ maka ya.
◼ Dị ka a na-eme kwa afọ, e kwesịrị ịgụkọ akwụkwọ na magazin nile e nwere n’ọgbakọ n’August 31, 2006, ma ọ bụ n’ụbọchị dị ya nso, dị ka o kwere mee. Ngụkọ a yiri ọgụgụ onye nlekọta akwụkwọ nke ọgbakọ nhazi dị n’aka na-agụ akwụkwọ ole e nwere kwa ọnwa, e kwesịkwara idebanye ọnụ ọgụgụ ha na fọm Literature Inventory (S-18). E kwesịrị ịjụta onye ma ọ bụ ndị na-elekọta magazin, magazin ole e nwere. Odeakwụkwọ nke ọgbakọ nhazi dị n’aka kwesịrị ịhụ maka ngụkọ ahụ. Ya na onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ nhazi dị n’aka ga-abịanye aka na fọm ahụ. Ọgbakọ ọ bụla nhazi dị n’aka ga-enweta fọm Literature Inventory atọ. Mgbe unu dejupụtasịrị fọm ahụ, biko ziterenụ alaka ụlọ ọrụ otu tupu September 6 agafee. Debenụ otu na faịlụ unu. Unu pụrụ iji fọm nke fọdụrụnụ mee mgbakọ na mwepụ unu ga-eme na ya.
◼ A na-ezigara ọgbakọ ọ bụla fọm Literacy Report abụọ. Mgbe unu dejupụtasịrị ha, biko zighachirinụ alaka ụlọ ọrụ otu n’August 1. Tinyenụ nke ọzọ na faịlụ ọgbakọ.