Ha Esetịpụla Ihe Nlereanya Ma A Bịa n’Ikwesị Ntụkwasị Obi
1 N’afọ 1937, a malitere ụdị ọhụrụ nke ozi oge nile—ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ndị ikom na ndị inyom ruru eru bụ́ ndị nwere ahụmahụ n’ozi Ndị Kraịst bịara dị njikere ije ozi ebe ọ bụla nzukọ a sịrị ha jee. Taa, ka ọtụtụ iri afọ gafecharala, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche anọgidela na-esetịpụ ezi ihe nlereanya ma a bịa n’ikwesị ntụkwasị obi.—Hib. 6:12.
2 Ha Butere Ụzọ: Ná mmalite, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche butere ụzọ n’ọrụ ime nkwusa site n’iji ihe a na-akpọ phonograph, nke bụ́ ígwè na-adịghị oké arụ nke e ji akpọ okwu ndị e tinyere na teepu, eme nkwusa n’ụlọ ndị mmadụ. Ha gaa nletaghachi, ha na-ejikwa okwu ndị e kwunyere na teepu eme ihe dị ka ihe ha na ndị nwe ụlọ ga-adabere na ya kwurịta banyere Bible. Ha na-eme nke a n’obodo ukwu ndị e nwerela ọtụtụ ọgbakọ na ha. Mgbe e mesịrị, a malitere iziga ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ha na-aga nletaghachi na nke ndị nile gosiri mmasị n’ozi Alaeze ahụ ma na-eduziri ha ọmụmụ Bible. N’ihi otú ha si tinyesie nnọọ mgbalị ike, e guzobere ọtụtụ narị ọgbakọ ọhụrụ. Nnọgide ha nọgidesiri ike n’ọrụ ikwusa ozi ọma so mee ka nzukọ a mụbaa mmụba a dị egwu anyị na-ahụ taa. (Aịsa. 60:22) Anyị nwere narị mmadụ asaa na iri ise na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na Nigeria, ha anọgidekwala na-ekere òkè dị mkpa n’ịgbasa ozi ọma ahụ “n’etiti ihe nile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”—Kọl. 1:23.
3 O Kwesịrị Ka E Ṅomie Ha: Ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche anọgidela n’ozi oge nile ruo ọtụtụ iri afọ. Kemgbe ọtụtụ afọ ugbu a, a nọwo na-anụcha okwukwe nke ndị ikom na ndị inyom a na-eguzosi ike n’ihe n’ọnọdụ dị iche iche. (1 Pita 1:6, 7) Ha anọgidela na-adị njikere ịchụ ihe onwunwe n’àjà iji jee ozi n’ebe e nwere mkpa pụrụ iche. Ụfọdụ n’ime ha ugbu a akatala ahụ́, ha na ọrịa ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ na-alụkwa. (2 Kọr. 4:16, 17) N’agbanyeghị nke ahụ, ha ‘anọgidela na-amị mkpụrụ n’isi awọ.’ (Ọma 92:14) Ha tụkwasịrị Jehova obi, na-enwetakwa ngọzi ya.—Ọma 34:8; Ilu 10:22.
4 O kwesịrị ekwesị n’ezie ka anyị na-aja ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche mma nke ọma. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere ihe ùgwù nke inwe ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, jiri ohere ahụ mee ihe nke ọma site n’iwepụta oge soro ha nọkọọ ma rite uru n’ahụmahụ ha. Gosi na i nwere ekele maka ụzọ ha si jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ. Kwe ka iguzosi ike n’ihe ha mee ka ị gbasie ike n’okwukwe. Ndị nile na-eṅomi okwukwe ha pụkwara inweta ihu ọma na ngọzi Jehova, n’ihi na “ndị ji eziokwu eme ihe bụ ndị ihe ha na-atọ Ya ụtọ.”—Ilu 12:22.