Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ zaa ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’August 28, 2006. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu July 3 ruo August 28, 2006. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee otú ile ndị anyị na-agwa okwu anya si enyere anyị aka ịghọ ndị nkụzi ka mma? (Mat. 19:25, 26; Ọrụ 14:9, 10) [be-IB p. 124 para. 3–p. 125 para. 3]
2. Gịnị mere o ji dị mkpa ikwu okwu otú i si ekwu okwu, gịnịkwa pụrụ inyere anyị aka ịdị na-eme ya mgbe anyị nọ n’ozi ubi? [be-IB p. 128 para. 1-5, igbe]
3. Gịnị mere anyị ji kwesị ịhụ na anyị na-adị ọcha mgbe nile? [be-IB p. 131 para. 1-3]
4. Olee otú “imeru ihe n’ókè na uche zuru okè” kwesịrị isi metụta uwe na ejiji anyị? (1 Tim. 2:9) [be-IB p. 131 para. 4–p. 132 para. 1]
5. Olee ụkpụrụ Bible ndị anyị kwesịrị itinye n’ọrụ iji hụ na ọdịdị anyị adịghị egosi na anyị hụrụ ụwa n’anya? [be-IB p. 133 para. 2-3]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee uru kasịnụ a na-erite n’ịgụ ihe? [be-IB p. 21 para. 3]
7. Gịnị na-ekpebi ma mmadụ ọ̀ bụ onye maara ihe ka ọ̀ bụ onye gbagọrọ agbagọ n’uche? (Ilu 14:2) [w04-IB 11/15 p. 26 para. 5]
8. Olee ihe mere “ihe ọmụma ji dịịrị onye nghọta mfe”? (Ilu 14:6) [w04-IB 11/15 p. 28 para. 4-5]
9. Gịnị bụ ịmụ ihe? [be-IB p. 27 para. 3]
10. Olee otú ịtụgharị uche n’ihe ndị Jehova kere eke kwesịrị isi metụta anyị? [w04-IB 11/15 p. 8 para. 4]
ỌGỤGỤ BIBLE DỊỊRỊ IZU
11. N’oge ochie, olee otú Jehova si ‘nye okwu’ nke mere ka e nwee ụsụụ bara ụba nke “ndị inyom ndị na-ezisa ozi [ọma] ahụ,” oleekwa otú nke a si kwekọọ taa? (Ọma 68:11)
12. Olee ihe fọrọ nke nta ka ọ kwụsị Esaf ime ezi ihe, ma e si aṅaa gbazigharịa echiche ya? (Ọma 73:2, 3, 17)
13. Olee ihe mere e ji kpọọ mana ahụ e nyere ụmụ Izrel, “ọka nke eluigwe” na “nri nke ndị dị ike”? (Ọma 78:24, 25)
14. Gịnị bụ “ebe nzuzo nke Onye Kasị Ihe Nile Elu,” oleekwa otú anyị pụrụ isi ‘biri’ ebe ahụ? (Ọma 91:1, 2)
15. Olee otú ọnwụ nke ndị ebere Jehova si adị oké ọnụ ahịa n’anya ya? (Ọma 116:15)