Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/06 p. 2-3
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 8/06 p. 2-3

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Ịdị Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị Ebi!, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ́? Hà Dị Adị n’Ezie?, Nọrọ na Nche!, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. September: A ga-enyefe akwụkwọ Bible Na-akụzi. E kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche iji malite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible n’oge mbụ anyị nyefere ha akwụkwọ a. Anyị kwesịrị ịgaghachi ozugbo na nke ndị natara ya iji malitere ha ọmụmụ Bible ebe obibi. October: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! N’ebe e gosiri mmasị, biko webata broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche. November: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? ma ọ bụ traktị ọzọ dabara adaba.

◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị inyocha ihe ndekọ ego ọgbakọ na September 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe September 1 gasịrị. Ọ bụrụ na e nwere ihe ndekọ ego ndị dị iche, dị ka ihe ndekọ ego maka ilekọta ma ọ bụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, e kwesịrị ime ndokwa ka e nyochaa ihe ndekọ ego a. Mgbe e nyochasịrị ihe ndekọ ego (ndị) a, e kwesịrị ịmara ya ọgbakọ n’ọkwa mgbe ọzọ a ga-agụ akụkọ ndekọ ego.

◼ E ji ohere a na-echetara ndị okenye ka ha hụ na ha dejupụtara fọm bụ́ Kingdom Hall Maintenance Checklist (CN-14), bịanye aka na ya, ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ n’August 31 ma ọ bụ tupu ụbọchị ahụ. E kwesịkwara ime ndokwa ka e nyochaa Ụlọ Nzukọ Alaeze unu ná mmalite afọ ije ozi na-abịanụ. Ndị okenye kwesịrị ịgbaso ntụziaka e nyere na fọm ahụ nakwa nke e nyere n’akwụkwọ ozi e degaara òtù ndị okenye nile nke akara ụbọchị ya bụ May 13, 2004.

◼ Compact Disc Ọhụrụ Ndị E Nwere:

Beware of Losing Faith by Drawing Away From Jehovah (Ihe Nkiri, ọ dị disc abụọ)—French

Jehovah Delivers Those Calling Upon His Name (Ihe Nkiri, ọ dị otu disc)—French

Jehovah’s Name to Be Declared in All the Earth (Ihe Nkiri, ọ dị otu disc)—French

Watchtower Library—2005 Edition—Bekee

Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? (ọ dị disc abụọ)—French

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? (ọ dị disc asaa)—Bekee

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya