Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije ozi
Izu Na-amalite n’August 14
Abụ nke 163
Minit 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa August. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche July 15 na Teta! July-September. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi otú a ga-esi azaghachi mgbe onye nwe ụlọ kwuru, sị, “Enweghị m mmasị ná Ndịàmà Jehova.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, p. 9.
Minit 15: Mkpa ọgbakọ.
Minit 15: “Jiri Ohere Ọ Bụla Dapụtaranụ Na-ekwusa Ozi Ọma.”a Gwa onye nkwusa ihe na-esiri ike ka o kwuo otú o sirila nwee ike iji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ekwusa ozi ọma.
Abụ nke 84 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’August 21
Abụ nke 62
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ na Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
Minit 15: Irite Uru n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche Nakwa n’Okwu Ihu Ọha. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 59 ruo n’isiokwu nta dị na peeji nke 64.
Minit 20: Bido Ugbu A Mewe Ndokwa Maka Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka! Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Gbaa ụmụnna ume isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, ọ dịkarịa ala, otu ọnwa n’ime afọ ije ozi ọhụrụ a. (1 Kọr. 9:26) Ụfọdụ pụrụ ịhọrọ ọnwa e nwere ihe omume pụrụ iche ma ọ bụ ọnwa manyere n’oge ezumike ha ma ọ bụkwanụ ọnwa nwere Saturday na Sunday ise. Jụọ ndị na-ege ntị, sị: “Olee otú i sirila merie ihe isi ike n’oge gara aga iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka? Olee ngọzi ndị i nwetara n’ihi ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka? Ọ bụrụ na ị chọrọ ịrụ ya, ma ị mabeghị ma ị̀ ga-arụ ya, gịnị mere i ji kwesị itinye ya n’ekpere? (Ọrụ 4:29; 2 Kọr. 4:7; Jems 1:5) Gịnị mere o jikwa dị mma iso ezinụlọ gị na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ, nke ka nke ndị ọ dị otú ọ dị gị, kwurịta maka ya? (Ilu 15:22) Olee mgbe ị na-eme atụmatụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka?”
Abụ nke 216 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’August 28
Abụ nke 17
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa August. Jiri aro a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche September 1 na Teta! July-September mgbe a gara na nke onye a na-ewegara magazin mgbe dum. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.
Minit 15: “Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme n’Ụwa Nile Maka Mgbakọ Distrikti ‘Nnapụta Dị Nso!’”b Hụ na a gụpụtara paragraf dum.
Minit 20: Ị̀ Pụrụ Inweta Onye Ị Ga Na-eduziri Ọmụmụ Bible n’Ọnwa September? Okwu a ga-eme ihe ngosi na ya. N’ọnwa September, anyị ga-eme mgbalị pụrụ iche iji akwụkwọ Bible Na-akụzi malite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible n’oge mbụ anyị gara na nke ha. Nke a pụtara na ozugbo anyị nyefere mmadụ akwụkwọ ahụ, anyị ga-agbalịsi ike ịmụrụ ya paragraf ole na ole. Jiri aro ndị dabara adaba n’ókèala unu mee ihe ngosi abụọ. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi otú e si eme ndokwa doro anya maka ịlọghachi ma gaa n’ihu n’ihe ọmụmụ ahụ.
Abụ nke 37 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na September 4
Abụ nke 90
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.
Minit 20: Ị Pụrụ Ịbụ Onye Na-enye Agbamume. (Rom 1:11, 12) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Kwuo mmadụ ole na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile n’ọgbakọ unu. Kwuo ụzọ ndị anyị pụrụ isi na-agba ha ume, dị ka site n’ịja ha mma, ikwu okwu ọma banyere ọrụ ọsụ ụzọ, iso ha na-aga ozi ọma, ịkpọ ha ka bịa soro anyị rie nri, na ịchọrọ ha ego ụgbọ mgbe ụfọdụ. Gwa ndị ọsụ ụzọ oge nile ka ha kwuo otú ndị ọzọ sirila gbaa ha ume. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu enweghị ndị ọsụ ụzọ oge nile, kwuo otú anyị pụrụ isi gbaa ndị ọsụ ụzọ inyeaka ume.
Minit 15: “Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ikwusara Ụdị Mmadụ Nile Ozi Ọma.”c Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 3, kọwaa ụzọ ihe atọ e kwuru na peeji nke 2 nke akwụkwọ nta bụ́ Good News for People of All Nations, bụ́ ihe ndị e kwesịrị ime mgbe e zutere onye na-asụ asụsụ ala ọzọ. Meekwa ihe ngosi nke ụzọ a ga-esi jiri akwụkwọ nta a mee ihe mgbe e zutere ndị na-asụ asụsụ ala ọzọ n’ókèala unu.
Abụ nke 225 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.