Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije ozi
Ihe ịrịba ama: Ozi Alaeze Anyị ga-enwe usoro ihe omume Nzukọ Ije Ozi maka izu ọ bụla n’oge mgbakọ distrikti. Ọgbakọ dị iche iche pụrụ ime mgbanwe dị ka o si dị mkpa iji nye ohere maka ịga Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!” N’ebe ọ dabara adaba, jirinụ minit 15 ná Nzukọ Ije Ozi ikpeazụ unu ga-enwe tupu unu agawa mgbakọ tụleghachi ndụmọdụ na ihe ncheta ndị sitere n’ihe ntinye nke ọnwa a, bụ́ ndị metụtara ọgbakọ unu. Otu ọnwa ma ọ bụ abụọ unu lọtasịrị mgbakọ a, wepụtanụ minit 15 ruo 20 ná Nzukọ Ije Ozi (ikekwe na-eji oge e nyere maka ịtụle mkpa ọgbakọ) iji tụleghachi isi ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ. Ihe e kwesịrị ime abụghị ịtụleghachi ihe nile e kwuru ná mgbakọ ahụ. Kama, ihe e kwesịrị ime bụ ime ka nanị akụkụ ndị metụtara ozi ubi kpọmkwem pụta ìhè. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha si na-etinye ihe ndị ahụ n’ọrụ n’ozi ubi.
Izu Na-amalite na September 11
Abụ nke 20
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa September. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? iji kwadebe maka ajụjụ ndị a ga-ajụ banyere ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke September 25. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche September 15 na Teta! July-September. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi otú a ga-esi zaghachi mgbe onye nwe ụlọ kwuru, sị, “Enwere m okpukpe nke m.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, p. 10.
Minit 20: Na-erite Uru ná Nzukọ Ije Ozi Nakwa n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, malite n’isiokwu nta dị na peeji nke 64 ruo n’isiokwu nta dị na peeji nke 69.
Minit 15: “Mgbanwe Ndị A Na-eme n’Otú A Ga-esi Na-eji Ụlọ Nzukọ Alaeze Agba Akwụkwọ na Nigeria.”a Paragraf nke 1-7. Gụpụta paragraf dum. E kwesịrị ịgwa nwanna nwoke ma agụ ihe nke ọma agwa tupu oge eruo, ka ọ gụpụta paragraf ndị ahụ.
Abụ nke 126 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na September 18
Abụ nke 213
Minit 5: Ịma ọkwa ọgbakọ.
Minit 10: “Mgbanwe Ndị A Na-eme n’Otú A Ga-esi Na-eji Ụlọ Nzukọ Alaeze Agba Akwụkwọ na Nigeria” b Paragraf nke 8-11. Gụpụta paragraf dum. E kwesịrị ịgwa nwanna nwoke ma agụ ihe nke ọma agwa tupu oge eruo, ka ọ gụpụta paragraf ndị ahụ.
Minit 30: “Na-echere Jehova.”c Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ya. Kwuo mgbakọ nke e kenyere ọgbakọ unu ịga. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú anyị iyi baajị mgbakọ anyị mgbe nile n’obodo anyị gara mgbakọ na ya pụrụ isi mee ka anyị nwee ohere ịgba àmà. Gbaa ndị na-ege ntị ume iji ohere ọ bụla dapụtaranụ n’oge anyị gara mgbakọ gbaa àmà. Gbaakwa ha ume iji fọm Please Follow Up (S-43) detuo ihe banyere onye ọ bụla gosiri mmasị n’ozi Alaeze ahụ.
Abụ nke 191 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na September 25
Abụ nke 94
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa September. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche October 1 na Teta! July-September mgbe a na-agba àmà okporo ámá. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.
Minit 25: “Vidio Ọ Dị Mkpa Ka E Chebara Echiche nke Ọma.”d Mgbe ị na-atụle paragraf nke 1, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu dị mkpirikpi banyere otú ha si hụ vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? Ha kwusịa ya, ị malite ozugbo jụwa nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị ahụ e depụtara na paragraf nke 2-7. Ná mmechi, gbaa ezinụlọ nile ume ka ha hụ na ha nọkọrọ ọnụ n’oge na-adịghị anya ma kirie vidio bụ́ Young People Ask—What Will I Do With My Life? Vidio a dị nanị n’ụdị DVD.
Minit 10: Akwụkwọ Ozi Si n’Alaka Ụlọ Ọrụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’akwụkwọ ozi ahụ dị n’ihu Ozi Alaeze Anyị a.
Abụ nke 183 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’October 2
Abụ nke 36
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.
Minit 15: “Jiri Akwụkwọ Anyị Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya.”e
Minit 20: “Ịgba Àmà Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ.”f Dị ka oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.
Abụ nke 127 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
f Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.