Ajụjụ A Ga-eji Mụọ Akwụkwọ Bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Ntụziaka Banyere Otú A Ga-esi Mụọ Akwụkwọ Onye Ozizi
Iji mee ka ọmụmụ akwụkwọ a gaa werewere, denye nọmba na paragraf niile dị n’isiakwụkwọ nke ọ bụla, gụnyere paragraf ndị dị n’okwu mmalite ya. E kwesịrị ịgụkọta paragraf niile dị ná nkebi nke ọ bụla ọnụ. Mgbe a na-amụ ya, e nwere ike ịgụ amaokwu Baịbụl ndị dị ná ngwụsị ya mgbe ọ bụla ọ dị mkpa.
Mgbe a na-amụ akwụkwọ ahụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, e kwesịrị ịmụ isi abụọ kwa izu, a ga-agụkwa okwu mmalite ya dị ka isi nke mbụ. A ga-amụcha akwụkwọ ahụ n’izu iri abụọ na ise, jiri izu nke ikpeazụ mụọ Isi nke 48 ma were nkeji ole na ole tụleghachi ihe ndị dị n’akwụkwọ ahụ dum.
Okwu Mmalite Paragraf nke 1-5
1. Olee ihe mere e ji asị na ịmụ nwa bụ ọrụ ebube?
2. Olee ụfọdụ ihe ụmụaka chọrọ n’aka ndị mụrụ ha?
3. N’ihi gịnị ka ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iji mee ka ihe ha na-ezi ụmụ ha dabere na Baịbụl kama ịdabere n’echiche ụmụ mmadụ ma ọ bụ n’omenala? (Ilu 3:5, 6; 14:12; Aịzaya 30:21)
Paragraf nke 6-10
4. Olee otú ajụjụ ndị dị n’akwụkwọ a si enyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha ihe, oleekwa ihe nne ma ọ bụ nna nwere ike ịmata site n’otú ụmụ ya si zaa ajụjụ ndị ahụ?
5. Olee otú ihe osise ndị dị n’akwụkwọ a si enye aka n’ịkụzi ihe?
6. Gịnị bụ olileanya nke ndị bipụtara akwụkwọ a?
Isi 1 Paragraf nke 1-6
1. Olee ụdị onye ozizi Jizọs bụ?
2. Olee otú Jizọs si ghọọ ezigbo Nwa na Onye Ozizi Ukwu?
3. Olee otú Jizọs si dị iche ná ndị mmadụ ndị ọzọ?
Paragraf nke 7-11
4. Olee otú ụmụaka si mata na Jizọs hụrụ ha n’anya?
5. Olee ihe mere Jizọs ji kụziere ụmụaka ihe, oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya ya?
6. Olee ihe Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru na ndị toro eto kwesịrị ịdị ka nwatakịrị?
Paragraf nke 12-16
7. Olee ihe Jizọs na-akụziri anyị mgbe o kwuru banyere nnụnụ na okooko osisi?
8. Olee otú ihe Jizọs kụziri nwere ike isi nyere mmadụ aka ikpebi ma ọ̀ ga-anara ọrụ ga-eme ka ya na ezinụlọ ya biri iche iche?
9. Olee ihe ị hụrụ n’Ozizi Elu Ugwu Jizọs nke gosiri mkpa ọ dị ibute Chineke ụzọ ná ndụ anyị?
Paragraf nke 17-21
10. Olee otú anyị nwere ike isi gee Jizọs ntị, oleekwa ihe ga-emenụ ma anyị mee otú ahụ?
11. Olee mgbe Chineke gwara ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha gee Jizọs ntị, oleekwa otú anyị nwere ike isi nweta ezi obi ụtọ?
Isi nke 2 Paragraf nke 1-7
1. Olee ihe mere Baịbụl ji bụrụ akwụkwọ dị mkpa karịa ndị ọzọ niile?
2. Olee otú Chineke si mee ka e dee Baịbụl, oleekwa ihe mere anyị kwesịrị iji kwere na Chineke nwere ike isi n’eluigwe zie ndị nọ n’ụwa ozi?
Paragraf nke 8-12
3. Olee onye mbụ dere Baịbụl, afọ olekwa ka ide Baịbụl were?
4. Kwuo aha ụfọdụ ndị so dee Baịbụl, gosikwa ebe ha nọ n’ihe osise dị na peeji nke 19.
5. Olee otú ndị dere Baịbụl si mara ihe ndị na-emebeghị eme?
Paragraf nke 13-18
6. Olee ihe mere mmadụ niile nwere ike iji mata ihe dị n’akwụkwọ ozi Chineke detaara ụmụ mmadụ?
7. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị dị mkpa Baịbụl na-agwa anyị?
8. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị maara ihe n’ezie, nakwa na anyị ji Okwu Chineke kpọrọ ihe?
Isi nke 3 Paragraf nke 1-10
1. Olee ihe na-atụ gị n’anya banyere otú e si kee anyị?
2. Olee onye mbụ Chineke kere, oleekwa otú anyị si mara?
3. Olee ihe mere Chineke ji kee ihe ndị dị ndụ?
4. Olee otú Chineke sirila gosi na ọ hụrụ anyị n’anya?
Paragraf nke 11-21
5. Olee ihe atụ ndị i nwere inye iji gosi na Chineke dị adị?
6. Olee ihe mere anyị na-ekwesịghị iji nwaa ime ihe oyiyi nke Chineke?
7. Olee otú anyị nwere ike isi kelee Chineke?
Isi nke 4 Paragraf nke 1-6
1. Olee ihe gosiri na aha dị ezigbo mkpa?
2. Gịnị bụ aha Chineke, oleekwa ihe mere anyị kwesịrị iji jiri ya na-eme ihe?
3. Olee otú Jizọs si jiri aha Chineke mee ihe ma kụziere ndị ọzọ imekwa otú ahụ?
Paragraf nke 7-14
4. Olee ihe Chineke gosiri Mozis banyere aha Ya?
5. Olee ihe Jehova gwara Fero banyere aha Ya?
6. Olee otú Jehova si mee ka a mara aha ya, oleekwa otú o si eme ya taa?
Paragraf nke 15-19
7. Olee ebe i nwere ike igosi mmadụ aha Chineke na Baịbụl gị?
8. Olee otú i nwere ike isi gosi na ị hụrụ Jehova n’anya?
Isi nke 5 Paragraf nke 1-8
1. Olee ihe mere e ji mụọ Ọkpara Chineke n’ụwa? (Luk 1:26-38)
2. Olee ezi ihe nlereanya ma Jizọs ma Meri setịpụrụ, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ha?
3. Olee otú otú e si mụọ Jizọs si dị iche n’otú e si mụọ ndị niile ọzọ?
Paragraf nke 9-17
4. Olee ihe ndị mere n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs?
5. Olee ebe Jizọs nọ tolite, oleekwa ihe o mechara mee bụ́ nke mere ka obi dị Chineke mma n’ebe ọ nọ? (Abụ Ọma 40:6-8)
6. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya Jizọs?
Isi nke 6 Paragraf nke 1-4
1. Gịnị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ na-achọ, oleekwa otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si gosi mgbe ụfọdụ na ọ na-agụkwa ha?
2. Olee ihe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya nke ha na-amụtaghị na mbụ?
Paragraf nke 5-11
3. Olee ihe Jizọs mere n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, oleekwa ihe nke ahụ kụziiri anyị?
4. Ọ bụrụ na anyị agbasoo ihe nlereanya Jizọs, olee ezi ihe ndị ga-emenụ?
Paragraf nke 12-17
5. Olee otú i nwere ike isi jeere ndị ezinụlọ unu ozi?
6. Olee otú anyị nwere ike isi jeere ndị ọzọ ozi n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe ndị ọzọ?
7. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji na-ejere ndị ọzọ ozi ma a sịgodị na ha anaghị ekele anyị mgbe niile?
Isi nke 7 Paragraf nke 1-9
1. Olee ihe mere o ji dị mma ige ndị okenye ntị?
2. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ekpere Jizọs nke dị na Luk 22:42?
3. Olee ihe anyị na-egosi mgbe anyị na-erubere Chineke isi?
Paragraf nke 10-15
4. Olee otú ụmụaka nwere ike isi mee ihe dị ná Ndị Efesọs 6:1-3, oleekwa ihe mere ha kwesịrị iji mee otú ahụ?
5. Olee otú nrubeisi si chebe ndị mmadụ ndụ ogologo oge gara aga?
Paragraf nke 16-19
6. Olee otú nrubeisi nwere ike isi chebe ụmụaka taa?
7. Olee otú mmadụ niile na-esi erite uru site n’irubere Chineke isi?
Isi nke 8 Paragraf nke 1-5
1. Olee ndị dị elu ma dị ike karịa ụmụ mmadụ?
2. Olee ọrụ ebube Chineke rụrụ ka e wee nwee ike ịmụ Jizọs?
3. Olee otú Jizọs si gosi na ya dịrịla ndụ tupu ya aghọọ mmadụ?
Paragraf nke 6-11
4. Olee ụdị ọdịnihu Adam na Iv gaara enwe ma a sị na ha rubeere Chineke isi?
5. Olee ihe dị mkpa anyị nwere ike ịmụta na Jenesis 2:17?
Paragraf nke 12-19
6. Olee otú mmụọ ozi Chineke kere si duhie Iv?
7. Olee ihe merenụ n’ihi na Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi?
8. Olee ihe mere otu ezigbo mmụọ ozi ji ghọọ onye ọjọọ?
9. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs ma gosi na Ekwensu bụ onye ụgha?
Isi nke 9 Paragraf nke 1-4
1. Mgbe a nwara anyị ọnwụnwa ime ihe na-adịghị mma, olee ihe mere anyị na-ekwesịghị iji daba na ya?
2. Mgbe Baịbụl kwuru na “eluigwe meghere” mgbe e mere Jizọs baptizim, gịnị ka ọ pụtara?
Paragraf nke 5-13
3. Olee ọnwụnwa mbụ Setan nwara Jizọs, oleekwa otú Jizọs si merie ya?
4. Olee ọnwụnwa nke abụọ Setan nwara Jizọs, oleekwa ihe Jizọs gwara ya?
5. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ọnwụnwa nke atọ a nwara Jizọs?
Paragraf nke 14-20
6. Olee otú e nwere ike isi nwaa anyị ọnwụnwa imejụ agụụ anụ ahụ́ anyị ma ọ bụ ime ihe nzuzu?
7. Olee mgbe ọ na-esi ezigbo ike ime ihe ziri ezi, ma olee ihe ga-enyere anyị aka ime ihe ziri ezi mgbe niile?
Isi nke 10 Paragraf nke 1-6
1. Olee ihe mere otu n’ime ndị mmụọ ozi ji ghọọ onye na-emegide Chineke?
2. Olee ihe ụfọdụ ndị mmụọ ozi ndị ọzọ mere, oleekwa ihe mere o ji bụrụ ihe ọjọọ?
3. Olee otú ụmụ ndị mmụọ ozi ahụ dị, oleekwa ihe Chineke mere banyere nsogbu ahụ dị n’ụwa?
Paragraf nke 7-11
4. Olee ihe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eme ugbu a, oleekwa otú nke a nwere ike isi metụta anyị?
5. Olee ihe ọjọọ ndị ajọ ndị mmụọ ozi ahụ na-achọ ime ka ụmụaka mee?
Paragraf nke 12-17
6. Olee ihe ọjọọ ndị na-amasị ajọ ndị mmụọ ozi, oleekwa ebe ndị mmadụ na-amụta ihe ndị a?
7. Ọ bụ ezie na ndị mmụọ ọjọọ siri ajọ ike, olee ihe mere anyị na-ekwesịghị iji na-atụ ha ụjọ?
Isi nke 11 Paragraf nke 1-11
1. Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwere ihe ndị anyị na-enweghị ike ịhụ anya?
2. Olee ihe ndị anyị mụtarala banyere ezi ndị mmụọ ozi na ajọ ndị mmụọ ozi?
3. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị mmụọ ozi na-ekwurịta, oleekwa ihe mere i ji kwere na ndị mmụọ ozi nwere mmasị n’ebe anyị nọ?
4. N’oge ochie, olee otú ndị mmụọ ozi si nyere ndị hụrụ Chineke n’anya aka?
Paragraf nke 12-17
5. Olee ọrụ pụrụ iche ndị mmụọ ozi Chineke na-arụrụ ndị na-ejere Chineke ozi n’ụwa?
6. Olee ọrụ ndị mmụọ ozi Chineke nyeere Pọl aka ịrụ?
7. Olee nnukwu ọrụ ndị mmụọ ozi ga-enyere Chineke aka rụọ n’oge na-adịghị anya?
Isi nke 12 Paragraf nke 1-7
1. Gịnị bụ ekpere, oleekwa otú anyị si mara na ekpere mmadụ kpere n’onwe ya na nke e kpere n’ihu ọha dịcha mma?
2. Olee ihe mere o ji dị mma ikwu “Amen” mgbe e kpechara ekpere, oleekwa ihe ọ pụtara?
3. Mgbe a na-ekpe ekpere n’ọmụmụ ihe, olee ihe mere o ji dị mkpa ịnọ nwayọọ ma gee ntị, ghara ịdị na-elegharị anya ma ọ bụ na-eme ụzụ?
4. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ekpere Nehemaya?
Paragraf nke 8-10
5. Olee ihe dị mkpa anyị kwesịrị icheta banyere ekpere?
6. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị anyị nwere ike ikpegara Chineke ekpere banyere ha?
Paragraf nke 11-17
7. Olee ihe atọ kasị mkpa Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere banyere ha?
8. Olee ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ikpe ekpere banyere ha?
Isi nke 13 Paragraf nke 1-7
1. Olee ihe ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs pụtara?
2. Olee mmadụ isii mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, oleekwa ihe ị maara banyere onye nke ọ bụla n’ime ha?
3. Olee mmadụ anọ bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ́ ndị laghachiri n’ọrụ ịkụ azụ ha, ma olee ihe ha mere mgbe Jizọs mesịrị kpọọ ha ka ha soro ya?
Paragraf nke 8-12
4. Mgbe ndị ahụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, olee ihe ha kwesịrị ịdị njikere ime?
5. Olee ndị jụrụ iso Jizọs mgbe ọ kpọrọ ha, oleekwa ihe mere ha ji jụ?
6. Olee ndị Jizọs họọrọ ịbụ ndịozi iri na abụọ ya?
7. Ònye n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ ghọrọ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ònyekwa nọchiri ya?
8. Oleekwa ndị ikom ọzọ ghọrọ ndịozi?
Paragraf nke 13-16
9. Olee otú anyị si mara na ụmụ nwaanyị nwere ike ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs?
10. Olee otú ezi onye na-eso ụzọ Jizọs ga-esi na-akpa àgwà, oleekwa ebe ọ ga na-akpa ya?
Isi nke 14 Paragraf nke 1-5
1. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị mere anyị ihe ọjọọ?
2. Olee ihe Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị: ‘Ị ga-agbaghara mmadụ mmehie ya ugboro iri asaa na asaa’?
3. Mgbe Jizọs zasịrị Pita ajụjụ ya, olee ihe Jizọs mere?
Paragraf nke 6-13
4. Olee otú eze ahụ si mesoo ohu ya nke ji ya nnukwu ụgwọ?
5. Olee otú ohu ahụ si mesoo ohu ibe ya nke ji ya naanị obere ego?
6. Olee ihe eze ahụ mere mgbe ọ nụrụ ihe ohu ahụ na-anaghị agbaghara mmadụ mere?
Paragraf nke 14-18
7. Olee onye dị ka eze ahụ Jizọs kọrọ akụkọ ya?
8. Olee ihe Jizọs ji akụkọ ahụ na-akụzi?
9. Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ arịọ gị ka ị gbaghara ya, ma ọ bụrụgodị na ị gbagharala ya ọtụtụ ugboro tupu mgbe ahụ?
Isi nke 15 Paragraf nke 1-7
1. Gịnị bụ ajọ mbunobi, oleekwa ihe mere i ji chee na ọ dịghị mma inwe ya?
2. Mgbe otu nwoke nwere ajọ mbunobi jụrụ Jizọs ihe ọ na-aghaghị ime iji dị ndụ ebighị ebi, olee ihe Jizọs buru ụzọ kwuo?
3. Olee otú nwoke ahụ si chọọ ịgọpụrụ onwe ya maka ajọ mbunobi ahụ o nwere?
Paragraf nke 8-15
4. Olee akụkọ Jizọs kọọrọ nwoke ahụ iji nyere ya aka?
5. Olee ajụjụ Jizọs jụrụ nwoke ahụ mgbe ọ kọchaara ya akụkọ ahụ, oleekwa ihe nwoke ahụ zara?
Paragraf nke 16-19
6. Olee otú akụkọ ahụ Jizọs kọrọ si gosi onye bụ onye agbata obi anyị?
7. Olee otú anyị si mara na Jehova enweghị ajọ mbunobi?
8. Olee otú anyị nwere ike isi bụrụ ezi onye agbata obi?