Ajụjụ A Ga-eji Mụọ Akwụkwọ Bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Ntụziaka Banyere Otú A Ga-esi Mụọ Akwụkwọ Onye Ozizi
Iji mee ka ọmụmụ akwụkwọ a gaa werewere, denye nọmba na paragraf niile dị n’isiakwụkwọ nke ọ bụla, gụnyere paragraf ndị dị n’okwu mmalite ya. E kwesịrị ịgụkọta paragraf niile dị ná nkebi nke ọ bụla ọnụ. Mgbe a na-amụ ya, e nwere ike ịgụ amaokwu Baịbụl ndị dị ná ngwụsị ya mgbe ọ bụla ọ dị mkpa.
Mgbe a na-amụ akwụkwọ ahụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, e kwesịrị ịmụ isi abụọ kwa izu, nke pụtara na a ga-agụ okwu mmalite ya dị ka isi nke mbụ. A ga-amụcha akwụkwọ ahụ n’izu iri abụọ na ise, jiri izu nke ikpeazụ mụọ Isi nke 48 ma were nkeji ole na ole tụleghachi ihe ndị dị n’akwụkwọ ahụ dum.
Isi nke 16 Paragraf nke 1-6
1. Olee nsogbu otu nwoke nke kpesaara Jizọs banyere nwanne ya nwoke nwere?
2. Olee akụkọ Jizọs kọrọ iji gosi ihe dị njọ n’echiche nwoke ahụ? (Gụọ Luk 12:16-21)
Paragraf nke 7-13
3. Olee otú ọtụtụ ndị, ma ụmụaka ma ndị okenye, si dị ka ọgaranya ahụ?
4. Olee ihe dị mkpa karịa ihe onwunwe, ma olee otú ọtụtụ ndị taa—dị ka ọgaranya ahụ—si egosi ihe kasị ha mkpa?
5. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji dị ka ọgaranya ahụ Jizọs kọrọ akụkọ ya?
Paragraf nke 14-17
6. Gịnị ka mmadụ ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ pụtara?
7. Olee ezi ihe nlereanya Jizọs setịpụụrụ anyị?
8. Olee otú e si gọzie Jizọs maka ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ?
Isi nke 17 Paragraf nke 1-8
1. Olee isi ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ?
2. Olee ihe mere e ji kpọọ Jehova “Chineke bụ́ onye obi ụtọ”?
3. Olee ihe anyị nwere ike inye ndị ọzọ?
Paragraf nke 9-12
4. Olee ihe Jizọs na ndịozi ya nyere ndị ọzọ?
5. Olee ihe Pọl na Luk nyere ndị ọzọ, oleekwa ihe mere Lidia ji nwee obi ụtọ na o nwekwara ihe o nyere ha?
Paragraf nke 13-16
6. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele inye ndị ọzọ ihe anya, n’ihi gịnịkwa?
7. Olee ihe mere otu nwaanyị dara ogbenye ji nwee obi ụtọ inyecha ihe niile o nwere?
8. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi ‘na-enye ihe,’ oleekwa ihe anyị ga-atụ anya ya ma anyị mee otú ahụ?
Isi nke 18 Paragraf nke 1-5
1. Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe ndị ọzọ meere anyị ihe ọma?
2. Gịnị bụ ekpenta, oleekwa ihe mere e ji eze ndị ekpenta eze n’oge Jizọs?
3. Olee otú Jizọs si mesoo ndị ekpenta ihe?
Paragraf nke 6-12
4. Olee ihe Jizọs gwara ndị ekpenta ahụ rịọrọ ya ka ọ gwọọ ha, oleekwa ihe mere o ji sị ha otú ahụ?
5. Olee ihe gosiri na ndị ekpenta ahụ kweere na Jizọs ga-agwọli ha?
6. Olee ihe merenụ mgbe ndị ekpenta na-aga ịhụ ndị nchụàjà?
7. Olee otú nwoke onye Sameria ahụ si dị iche ná ndị nwoke itoolu ndị nke ọzọ?
Paragraf nke 13-18
8. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie nwoke ahụ lọghachiri ikele Jizọs?
9. Olee ihe mere o ji dị mkpa ikele ndị meere anyị ihe ọma?
Isi nke 19 Paragraf nke 1-5
1. Olee ihe Jizọs kwuru banyere ime udo, ma olee ihe mere o ji esi ike mgbe ụfọdụ?
2. Mgbe ndị Sameria kpasoro ndị na-eso ụzọ Jizọs àgwà ọjọọ, gịnị ka Jems na Jọn chọrọ ime?
Paragraf nke 6-12
3. Olee ihe Ilu 24:29 kwuru banyere imegwara ihe mmadụ mere gị?
4. Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta okwu Jizọs nke dị na Matiu 5:39?
5. Ọ bụrụ na anyị ahụ nsogbu, olee ihe kacha mma ka anyị mee, n’ihi gịnịkwa?
Paragraf nke 13-17
6. Olee ihe Ilu 26:17 kwuru, oleekwa otú o si metụta itinye aka n’ọgụ ndị ọzọ na-alụ?
7. Olee ihe ndị mmadụ na-emekarị mgbe ọgụ dara, ma olee ihe Onye Kraịst kwesịrị ime, n’ihi gịnịkwa?
Isi nke 20 Paragraf nke 1-7
1. Olee otú Jizọs si ele ndị na-achọ ịbụ ndị mbụ mgbe niile anya?
2. Olee akụkọ Jizọs kọrọ, oleekwa ihe mere o ji kọọ ya?
3. Olee ihe Jizọs ji akụkọ ahụ na-akụzi?
4. Mgbe mmadụ na-agbalị ịbụ onye mbụ, gịnị na-emekarị?
Paragraf nke 8-15
5. Olee otú ịchọ ịbụ onye mbụ si kpata nsogbu n’etiti ndịozi Jizọs mgbe ha na-aga Jeruselem?
6. Olee ihe Jizọs kwuru na onye chọrọ ịbụ onye mbụ kwesịrị ịdị na-eme?
7. Olee otú anyị nwere ike isi na-agbara ibe anyị ohu?
Isi nke 21 Paragraf nke 1-10
1. Olee ihe bụ́ itu ọnụ, oleekwa otú i si ele ndị na-etu ọnụ anya?
2. Olee akụkọ Jizọs kọrọ banyere onye Farisii na onye ọnaụtụ?
3. Olee ihe Jizọs ji akụkọ ahụ kụzie?
Paragraf nke 11-19
4. Olee mgbe Pita turu ọnụ, oleekwa otú ọtụtụ ndị si eme ka Pita taa?
5. Olee ihe mere onye ọ bụla na-ekwesịghị iji jiri onwe ya tuwe ọnụ?
6. Olee naanị onye anyị nwere iji tuo ọnụ, n’ihi gịnịkwa?
Isi nke 22 Paragraf nke 1-6
1. Gịnị ka Jizọs bu n’uche mgbe o kwuru ihe ahụ dị na Matiu 5:37?
2. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị mere obere oge ka Jizọs nwụsịrị?
Paragraf nke 7-13
3. Olee ihe ọjọọ Ananayas na Safaịra mere, oleekwa ihe mere ha?
4. Olee ihe akụkọ Ananayas na Safaịra kụziiri anyị?
Paragraf nke 14-18
5. Olee ihe mere o ji dị njọ ịgha ụgha?
6. Olee mgbe o nwere ike ịdị anyị ka ọ̀ bụ anyị ghaa ụgha?
7. Olee otú Baịbụl si dọọ anyị aka ná ntị ka ọ ghara ịdị mgbe anyị ga-agha ụgha?
Isi nke 23 Paragraf nke 1-8
1. Olee ebe Jizọs nọ mgbe e buteere ya otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ?
2. Olee ihe mere o ji siere nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ ike ịhụ Jizọs, oleekwa otú o mechara si hụ ya?
3. Olee ihe Jizọs meere nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ?
Paragraf nke 9-14
4. Olee ihe anyị mụtara n’ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ iji gwọọ nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ?
5. Olee otú mmadụ niile si ghọọ ndị mmehie?
Paragraf nke 15-18
6. Olee ihe mere ụfọdụ ndị ji arịa ọrịa karịa ndị ọzọ?
7. Olee naanị otú e nwere ike isi wepụ mmehie, oleekwa ụdị ahụ́ ike anyị ga-enwe mgbe e wepụchara mmehie anyị niile?
Isi nke 24 Paragraf nke 1-13
1. Olee ihe nwere ike ime ka mmadụ zuo ohi?
2. Olee onye mbụ zuru ohi, oleekwa ihe o zuru?
3. Olee ọchịchọ ọjọọ anyị na-ekwesịghị inwe?
4. Olee ihe ọjọọ ndị ọchịchọ ọjọọ Judas Iskarịọt dujere na ha?
Paragraf nke 14-21
5. Olee otú Ekan si ghọọ onye ohi?
6. Olee otú ma Devid ma nwa ya nwoke bụ́ Absalọm sicha zuo ihe na-abụghị nke ha?
7. Olee otú Chineke si ele ụdị ohi niile anya?
8. Olee ihe ga-enyere gị aka ka ọ ghara ịdị mgbe ị ga-aghọ onye ohi?
Isi nke 25 Paragraf nke 1-8
1. Olee ihe mere anyị niile ji eme ihe ọjọọ mgbe ụfọdụ?
2. Olee ihe ọjọọ Sọl mere, oleekwa ihe mere o ji mee ya?
Paragraf nke 9-15
3. Olee ihe mere Sọl mgbe ọ na-aga ịkpụrụ Ndị Kraịst?
4. Olee ihe Sọl ghọrọ, oleekwa ezigbo ihe ndị o mere?
5. Olee onye na-anwa ime ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ?
Paragraf nke 16-20
6. Olee ọgụ siri ike anyị niile na-alụ?
7. Olee ihe mere Jizọs ji hụ ndị meburu ihe ọjọọ n’anya?
8. Mgbe anyị hụrụ na Baịbụl kwuru na ihe anyị na-eme adịghị mma, gịnị ka anyị kwesịrị ime?
Isi nke 26 Paragraf nke 1-9
1. Mgbe Sọl ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs, olee otú ndị mmadụ si mesoo ya?
2. Olee eziokwu Baịbụl Jizọs kụziri nke kpasuru ndị mmadụ iwe?
3. Olee ihe ndị ahụ chọrọ ime Jizọs, ma nke a ò mere ka Jizọs kwụsị ikwusara ha ozi ọma?
Paragraf nke 10-14
4. Olee ọrụ ebube Jizọs rụrụ n’Ụbọchị Izu Ike?
5. Olee onye nwere obi ụtọ n’ihi ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ, olee ndị obi na-adịghị mma?
6. Olee mkpebi anyị niile ga-emerịrị?
7. Olee onye na-eme ka o siere anyị ike ime ihe ọma?
Paragraf nke 15-18
8. Olee ndị bụ́ ụwa nke kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs asị?
9. Olee ihe mere o ji sie nnọọ ike ime ihe ọma?
10. Olee nkwa nke kwesịrị ime ka anyị mee ihe Chineke chọrọ?
Isi nke 27 Paragraf nke 1-5
1. Olee ihe mere ndị mmadụ ji chọọ ife Pọl na Banabas ofufe, ma olee ihe Pọl na Banabas gwara ha?
2. Olee chi ndị ọtụtụ ndị na-efe?
3. Ònye bụ chi ụwa a, oleekwa ihe ọ na-anwa ime ka ndị mmadụ mee?
Paragraf nke 6-13
4. Olee ihe Eze Nebukadneza nyere mmadụ niile iwu ime, ma olee ihe mere ụmụ okorobịa Hibru atọ ji jụ ime ya?
5. Olee ọrụ ebube Jehova rụrụ, oleekwa ihe Eze Nebukadneza mere n’ihi ya?
Paragraf nke 14-15
6. Ì nwere ike ikwu ụfọdụ ihe oyiyi ma ọ bụ arụsị ndị mmadụ na-akpụ taa?
7. A sị na ụmụ okorobịa Hibru atọ ahụ dị ndụ taa, hà ga-efe arụsị ndị nke oge a?
Isi nke 28 Paragraf nke 1-5
1. Olee ihe mere o ji esi ike mgbe ụfọdụ ịmata onye anyị ga-erubere isi?
2. Olee ndụmọdụ Baịbụl nyere ụmụaka?
3. Olee ihe mere Shedrak, Mishak, na Abednego ji jụ ịkpọ isiala nye ihe oyiyi ahụ Eze Nebukadneza kpụrụ?
4. Mgbe ọ dị mkpa ka ndịozi Jizọs kpebie onye ha ga-erubere isi, olee ihe ha kpebiri?
Paragraf nke 6-10
5. Ònye bụ onyeisi ọchịchị n’oge Jizọs, oleekwa ezigbo ihe ndị gọọmentị na-emekarịrị ndị mmadụ?
6. Olee ihe Jizọs kwuru banyere ịtụ ụtụ isi, oleekwa ihe mere ntụziaka ahụ o nyere ji zie ezie?
Paragraf nke 11-18
7. Olee ihe mere ma ndị okenye ma ụmụaka kwesịrị iji na-erubere iwu gọọmentị na nke ndị na-anọchi anya ha isi?
8. Olee mgbe ezi Ndị Kraịst ga-ajụ irubere iwu ụfọdụ isi, n’ihi gịnịkwanụ?
Isi nke 29 Paragraf nke 1-10
1. Olee ihe gosiri na Chineke kwadoro inwe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, ma olee ụdị ndị ọ na-akwadoghị?
2. Olee ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ abụọ Baịbụl gwara anyị banyere ha?
3. Kọọ ihe mere n’ememme ndị a.
Paragraf nke 11-15
4. Olee ihe i chere Baịbụl na-agwa anyị banyere ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ?
5. Olee ụbọchị a họọrọ iji na-echeta ụbọchị ọmụmụ Jizọs, ma olee ihe mere ọ na-enweghị ike iji bụrụ na a mụrụ ya n’oge ahụ n’afọ?
Paragraf nke 16-17
6. Olee ihe mere ndị mmadụ ji agba Krismas?
7. Olee otú anyị nwere ike isi jide n’aka na Chineke kwadoro nnọkọ oriri na ọṅụṅụ anyị na-achọ ịga? (Jọn 17:16; 2 Ndị Kọrịnt 6:14; 1 Pita 4:3)
Isi nke 30 Paragraf nke 1-9
1. Olee ihe mere ụjọ ji jide Pita na ndịozi ndị ọzọ?
2. Olee ihe ndị merenụ tupu Pita agọnahụ Jizọs?
Paragraf nke 10-16
3. Ugboro ole ka Pita gọrọ na ya amaghị onye Jizọs bụ, oleekwa otú o si mee?
4. Olee otú anyị nwere ike isi nọrọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ Pita nọ na ya?
5. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka izere ụjọ ijide anyị na ịkwa ụdị arịrị ahụ Pita kwara?
Isi nke 31 Paragraf nke 1-7
1. Olee nkasi obi Baịbụl na-enye ndị na-enweghị obi ụtọ na ndị owu na-ama?
2. N’agbanyeghị na Jizọs tara ahụhụ, olee ihe ọ ma?
3. Olee otú anyị si yie atụrụ, oleekwa akụkọ Jizọs kọrọ banyere atụrụ furu efu?
Paragraf nke 8-12
4. Ònye dị ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ Jizọs kọrọ banyere ya, oleekwa ihe anyị na-ekwesịghị iji na-echegbu onwe anyị na anyị enweghị ike ịhụ Ya anya?
5. Olee otú Abụ Ọma nke 23 si gosi na Jehova hụrụ anyị n’anya?
Paragraf nke 13-15
6. Olee ihe mere ụjọ na-ekwesịghị iji tụọ atụrụ Chineke?
7. Olee otú Jehova si ele ndị kwesịrị ntụkwasị obi nye ya anya, oleekwa otú nke ahụ kwesịrị isi metụta otú anyị si ele ya anya?