Ajụjụ A Ga-eji Mụọ Akwụkwọ Bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Ntụziaka Banyere Otú A Ga-esi Mụọ Akwụkwọ Onye Ozizi
Iji mee ka ọmụmụ akwụkwọ a gaa werewere, denye nọmba na paragraf niile dị n’isiakwụkwọ nke ọ bụla, gụnyere paragraf ndị dị n’okwu mmalite ya. E kwesịrị ịgụkọta paragraf niile dị ná nkebi nke ọ bụla ọnụ. Mgbe a na-amụ ya, e nwere ike ịgụ amaokwu Baịbụl ndị dị ná ngwụsị ya mgbe ọ bụla ọ dị mkpa.
Mgbe a na-amụ akwụkwọ ahụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, e kwesịrị ịmụ isi abụọ kwa izu, a ga-agụkwa okwu mmalite ya dị ka isi nke mbụ. A ga-amụcha akwụkwọ ahụ n’izu iri abụọ na ise, jiri izu nke ikpeazụ mụọ Isi nke 48 ma were nkeji ole na ole tụleghachi ihe ndị dị n’akwụkwọ ahụ dum.
Isi nke 32 Paragraf nke 1-9
1. Olee otú Jehova na-esi ahụ na e chebere ụmụ nnụnụ?
2. Olee mgbe ọ dịrị mkpa ka e chebe Jizọs n’ụzọ pụrụ iche, ọ̀ bụkwa pụọ n’aka ònye?
3. Olee otú Jehova si chebe Ọkpara ya ka a ghara igbu ya?
Paragraf nke 10-13
4. Ole ndị taa yiri Jizọs mgbe ọ ka dị obere, oleekwa ihe mere o ji dị mkpa ka e chebe ha?
5. Olee otú Setan na ndị mmụọ ọjọọ si agbalị imerụ ụmụaka ahụ́?
6. Olee naanị ndị kwesịrị inwe mmekọahụ, oleekwa ụdị mmekọahụ ndị Chineke na-akwadoghị?
Paragraf nke 14-17
7. Olee ndị nwere ike ịnwa ime ka ha na ụmụaka nwee mmekọahụ, oleekwa otú ha na-esi eme ka ụmụaka kwenyere ha?
8. Olee otú ụmụaka nwere ike isi chebe onwe ha pụọ n’aka ndị chọrọ ime ihe ọjọọ?
9. Olee ihe ndị nne na nna nwere ike ime iji chebe ụmụ ha?
Isi nke 33 Paragraf nke 1-8
1. Olee otú ọtụtụ ndị taa si ewere Jizọs, ma olee ihe ọ bụ ugbu a?
2. Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụgbọ mmiri, olee otú o si gosi na ya nwere ike dị ukwuu?
3. N’ihi gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwesịdịghị iji tụwa ụjọ?
Paragraf nke 9-14
4. Olee ihe mere n’oge ọzọ e nwere oké ifufe?
5. Olee ihe mere Jizọs ji rụọ ọrụ ebube n’oge ahụ?
Paragraf nke 15-16
6. Olee ihe Jizọs ji ike ya eme taa?
7. Olee ọrụ ebube ndị anyị nwere ike ịtụ anya ha n’ọdịnihu?
Isi nke 34 Paragraf nke 1-4
1. Olee otú anyị nwere ike isi ghọta ihe na-eme mgbe mmadụ nwụrụ?
2. Olee ihe ihe Jizọs kwuru banyere ọnwụ Lazarọs gosiri banyere ọnwụ?
Paragraf nke 5-10
3. Olee ihe Jizọs mere mgbe o ruru n’ọgba ebe a dọwara ozu Lazarọs?
4. Olee ihe merenụ mgbe Jizọs tiri mkpu, sị: “Lazarọs, pụta!”?
Paragraf nke 11-16
5. Olee ihe na-eme mgbe mmadụ nwụrụ?
6. Olee otú anyị si mara na Lazarọs agaghị eluigwe?
7. Olee otú anyị si mara na mgbe mmadụ nwụrụ mkpụrụ obi anwụọla?
Paragraf nke 17-19
8. Olee ihe ndị bi n’ógbè unu kweere banyere ndị nwụrụ anwụ?
9. Olee otú akụkọ Lazarọs si enyere anyị aka ịghara ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu?
Isi nke 35 Paragraf nke 1-4
1. Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ nakwa na ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa Jizọs?
2. Olee otú e si kpọlite ụmụaka abụọ n’ọnwụ tupu a mụọ Jizọs?
3. Olee ihe mere anyị nwere ike iji jide n’aka na Jehova ga-echeta anyị ma anyị nwụọ?
Paragraf nke 5-11
4. Olee ihe mere ada Jeirọs, oleekwa ihe Jizọs meere nwata nwaanyị ahụ?
5. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ a dị na Baịbụl?
Paragraf nke 12-18
6. Olee otú mkpọlite Jizọs kpọlitere nwa nwoke nke otu nwaanyị di ya nwụrụ si gosi na Jizọs chọrọ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ?
7. Olee otú i chere obi dị nne nwata nwoke ahụ, olee mgbe obi ga-adịkwa ndị ọzọ otú ahụ?
Isi nke 36 Paragraf nke 1-6
1. Olee ihe mbilite n’ọnwụ ndị a kọwara na Baịbụl gosiri?
2. Olee ihe mere a ga-eji kpọlite ndị ajọ omume n’ọnwụ, oleekwa ebe ha ga-ebi?
3. Olee mgbe a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ n’ụwa, oleekwa ihe ga-eme mgbe ahụ?
Paragraf nke 7-11
4. Olee ihe anyị mụtara ná nkwa ahụ Jizọs kwere onye omekome ahụ na ya na ya ga-anọ na Paradaịs?
5. Olee otú Jizọs na onye omekome ahụ ga-esi nọọ na Paradaịs?
6. Olee ihe mere Jizọs ga-eji kwere ka onye bụ́bu onye omekome biri na Paradaịs?
Paragraf nke 12-17
7. Olee otú anyị si mara na ọ bụghị mmadụ niile a kpọlitere n’ọnwụ ga-ebi n’ụwa?
8. Mmadụ ole ka a ga-akpọlite ná “mbilite n’ọnwụ mbụ,” oleekwa ihe ga-abụ ọrụ ha?
9. Olee ihe mere ọ ga-eji magbuo onwe ya ibi na Paradaịs elu ala?
Isi nke 37 Paragraf nke 1-7
1. Olee onyinye magburu onwe ya Chineke nyere anyị?
2. Olee ihe mere o ji dị anyị niile mkpa inwe nna ọhụrụ?
3. Olee otú Jizọs si bụrụ nna anyị na Onye Nzọpụta anyị?
4. Gịnị bụ ihe mgbapụta, oleekwa ihe mere o ji dị anyị mkpa?
Paragraf nke 8-15
5. N’abalị ahụ tupu Jizọs anwụọ, olee ememme ya na ndị na-eso ụzọ ya zukọrọ mee?
6. Olee ihe Jizọs hiwere mgbe nke ahụ gasịrị iji dochie anya Ememme Ngabiga?
7. Olee ihe nnọchianya ndị Jizọs ji mee ihe ná ncheta ọhụrụ ahụ, oleekwa ihe ndị ha nọchiri anya ha?
8. Olee ihe nke ọhụrụ ahụ na-echetara anyị?
Paragraf nke 16-18
9. Olee ihe anyị kwesịrị ịdị na-eche mgbe anyị gara Ncheta Ọnwụ Jizọs?
10. Olee ndị kwesịrị ịta achịcha ahụ ma ṅụọ mmanya ahụ, n’ihi gịnịkwanụ?
11. Olee ihe mere ndị na-agaghị ata achịcha ahụ kwesịkwara iji bịa?
Isi nke 38 Paragraf nke 1-5
1. Gịnị ka Jizọs zọpụtara anyị na ya?
2. Olee ndị Jizọs nwụrụ maka ha?
3. Chineke ọ̀ hụrụ ndị nọ n’ụwa n’anya?
Paragraf nke 6-12
4. Olee ihe mere Jizọs n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ?
5. Kọọ ihe mere n’echi ya.
6. Olee otú Jizọs si dị iche n’Adam?
Paragraf nke 13-16
7. Olee otú Pọl si gosi na ya ji ịhụnanya Kraịst nwere n’ebe ya nọ kpọrọ ihe?
8. Olee ezi ihe kwesịrị ime ka anyị hụ Jizọs n’anya?
9. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-adị ndụ iji mee Kraịst obi ụtọ?
Isi nke 39 Paragraf nke 1-4
1. Olee otú i chere obi dị Jehova mgbe e gburu Jizọs?
2. Olee ihe Jizọs ji n’aka?
3. Olee ebe e si kpọlite Jizọs n’ọnwụ, abalị olekwa ka ọ nọrọ n’ebe ahụ?
Paragraf nke 5-13
4. Kọọ ihe merenụ na Friday ahụ Jizọs nwụrụ.
5. Olee ụdị ahụ́ e ji kpọlite Jizọs n’ọnwụ, oleekwa otú ndị mmadụ si mesịa nwee ike ịhụ ya?
6. Olee ihe ndị mere na Sunday ahụ a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ?
Paragraf nke 14-17
7. Ruo abalị ole ka Jizọs pụtara n’ụdị anụ ahụ́, oleekwa ihe mere mgbe nke ahụ gasịrị?
8. Olee otú ọtụtụ ndị si eme ememme ncheta mbilite n’ọnwụ Jizọs, ma olee otú anyị nwere ike isi dị ka Ndị Kraịst mbụ?
Isi nke 40 Paragraf nke 1-3
1. Olee ihe Chineke chọrọ n’aka anyị, ma olee ihe anyị nwere ike imere ya?
2. Olee ihe mere na Jehova emeghị anyị ka anyị dị ka ígwè ọrụ ga na-eme ihe ọ bụla ọ chọrọ ka anyị mee?
Paragraf nke 4-7
3. Olee otú obi na-adị Chineke mgbe anyị mere uche ya?
4. Olee ihe mere onye anyị họọrọ ife ji gbasa ma Jehova ma Setan?
Paragraf nke 8-15
5. Olee ihe Setan mere Job?
6. Olee otú i chere obi dị Jehova mgbe Job kwesịrị ntụkwasị obi?
7. Olee ihe nlereanya Jizọs setịpụụrụ anyị, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ya?
Isi nke 41 Paragraf nke 1-7
1. Olee otú Jizọs si mee ihe kpataara ndị mụrụ ya nchegbu n’otu oge?
2. Olee ihe Jizọs mere dị ka nwatakịrị mere ka nne na nna ya na Chineke nwee obi ụtọ?
Paragraf nke 8-12
3. Olee ihe nwatakịrị nwere ike ime taa iji mee ka Chineke nwee obi ụtọ?
4. Olee otú anyị nwere ike isi mata ndị bụ ndị Chineke?
Paragraf nke 13-18
5. Olee otú ihe nlereanya Timoti nwere ike isi nyere ụmụaka aka?
6. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya nke nwa agbọghọ nta ahụ́ bụ́ onye Izrel?
7. Olee ezi ihe mgbaru ọsọ ụmụaka kwesịrị inwe?
Isi nke 42 Paragraf nke 1-6
1. Olee otú anyị si mara na ọ dịghị njọ igwuri egwu?
2. Olee ọrụ Baịbụl kwuru na Jizọs mụtara, oleekwa ihe i chere mere o ji mara ya nke ọma?
3. Olee ihe mere ọrụ ji dị mma maka Jizọs, oleekwa ihe mere o ji dị mma maka anyị taa?
Paragraf nke 7-13
4. Olee ihe mere Jizọs ji bụrụ onye na-enwe obi ụtọ?
5. Olee ọrụ pụrụ iche Jizọs rụrụ n’ụwa, oleekwa otú o si lee ọrụ ahụ anya?
6. Olee ọrụ ụmụaka nwere ike ịrụ taa, oleekwa ihe mere ọrụ ha nwere ike iji baara ezinụlọ ha uru?
Paragraf nke 14-16
7. Olee ihe mere o ji dị mkpa ime ihe omume ụlọ akwụkwọ?
8. Olee ihe mere na anyị ekwesịghị ịdị na-agbara ọrụ ọsọ?
9. Olee ajụjụ dị mkpa anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị banyere ọrụ?
Isi nke 43 Paragraf nke 1-7
1. Olee ihe anyị maara banyere ụmụnne Jizọs ndị nwoke na ndị nwaanyị?
2. Olee ndị Jizọs kwuru na ha bụ nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke, oleekwa ihe ihe ahụ o kwuru pụtara?
3. Olee otú o nwere ike ịbụ na ndị ikwu Jizọs si mesoo ya ihe na mbụ?
Paragraf nke 8-14
4. Olee ihe atụ ndị e nwere na Baịbụl banyere ụmụnne ndị na-ahụghị ibe ha n’anya?
5. Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta n’akụkọ Ken na Ebel?
Paragraf nke 15-18
6. Gịnị bụ ịhụnanya, oleekwa otú ọ dịruru mkpa anyị igosi ya ndị ọzọ?
7. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị n’anya?
Isi nke 44 Paragraf nke 1-5
1. Olee otú anyị nwere ike isi ghọọ enyi Chineke dị ka Ebreham?
2. Olee ụdị ndị Jizọs ji mere ndị enyi?
3. Olee ndị so n’ezigbo ndị enyi Jizọs?
Paragraf nke 6-10
4. Olee ihe mere Jizọs ji leta ụdị mmadụ niile?
5. Ònye bụ Zakịọs, oleekwa otú o si ghọọ enyi Jizọs?
Paragraf nke 11-15
6. Olee ihe mere anyị ga-eji na-eleta ndị na-abụghị ndị enyi anyị?
7. Olee ndị anyị kwesịrị iji mere ezi ndị enyi?
8. Olee otú anyị ga-esi mata onye ga-abụ ezigbo enyi?
9. Olee otú ndị enyi anyị nwere ike isi metụta ndụ anyị?
Isi nke 45 Paragraf nke 1-8
1. Gịnị bụ Alaeze Chineke, oleekwa ihe anyị maara banyere Onye Ọchịchị ya?
2. Olee otú o si bụrụ na Alaeze ahụ eruwo nso n’oge Jizọs?
3. Olee ọrụ dị mkpa Jizọs rụrụ n’ụwa, oleekwa ndị nyeere ya aka n’ọrụ ahụ?
Paragraf nke 9-14
4. Olee ndị chọrọ ka Jizọs bụrụ Eze ha, ma olee ndị na-achọghị?
5. Olee ndị chọrọ igbu Jizọs, oleekwa ihe ha mere ka ndị mmadụ mee?
6. Olee otú ndị mmadụ dị taa?
Paragraf nke 15-20
7. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ Chineke n’anya?
8. Olee ihe Jizọs gosiri site n’ikwe ka e mee ya baptizim, oleekwa otú Chineke si gosi na ihe Jizọs dị Ya mma?
9. Olee ihe mere anyị kwesịkwara iji kwe ka e mee anyị baptizim, e mesịakwa anyị ya, olee ọrụ dị mkpa anyị kwesịrị ịnọgide na-arụ?
Isi nke 46 Paragraf nke 1-11
1. Mgbe Baịbụl kwuru na “ụwa na-agabiga,” gịnị ka ọ pụtara?
2. Olee ihe ndị mmadụ nọ na-eme tupu Iju Mmiri ahụ, oleekwa ihe mere Jizọs ji sị na anyị kwesịrị ịma banyere ya?
3. Olee ntụziaka ndị Chineke nyere Noa, oleekwa ihe mere mgbe Iju Mmiri ahụ bịara?
Paragraf nke 12-19
4. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta site n’ihe ndị mmadụ mere tupu Iju Mmiri ahụ?
5. Olee ihe Chineke ga-eji bibie ndị ajọ mmadụ, oleekwa ihe mere ọ ga-eji bibie ha?
6. Gịnị bụ Amagedọn, ònyekwa ga-edu ndị ga-alụ ya?
Isi nke 47 Paragraf nke 1-11
1. Olee otú ndị mmadụ ga-eji mara mgbe Jizọs lọghachiri ma malite ịchị n’eluigwe?
2. Olee ihe Jizọs na-akụzi mgbe o kwuru banyere osisi fig?
3. Olee ihe ndị so n’ihe ịrịba ama ahụ Jizọs nyere bụ́ nke na-emezu taa?
Paragraf nke 12-16
4. Olee ihe ihe ịrịba ama ahụ Jizọs nyere pụtara?
5. Mgbe Jizọs kwuru banyere mmadụ ịchọ ịgbapụ n’oge oyi, olee ihe ọ nọ na-akụziri anyị?
Isi nke 48 Paragraf nke 1-8
1. Olee ihe “eluigwe ọhụrụ” na “ụwa ọhụrụ” pụtara?
2. Jiri ihe osise na amaokwu Baịbụl ndị e depụtara ebe a kọwaa otú ndụ ga-adị n’ụwa ọhụrụ Chineke.
Paragraf nke 9-15
3. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị nweta ihe ọmụma Baịbụl ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi?
4. Olee ihe ọzọ dị anyị mkpa ma e wezụga ihe ọmụma ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ n’ụwa ọhụrụ Chineke?
5. Olee otú akwụkwọ a nwere ike isi nyere anyị aka ịdị ndụ ebighị ebi?