Na-ekwusa Ozi Ọma n’Akwụsịghị Akwụsị
1 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike iche na a rụzuola ókèala anyị ugboro ugboro, nakwa na ọ dịchaghị ndị na-ege ntị. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ezi ihe ndị mere anyị kwesịrị iji nọgide na-ezi ozi ọma na ya.—Mat. 28:19, 20.
2 Iji Gbaa Àmà: Jizọs buru amụma na ikwusa ozi ọma Alaeze ga-eso n’ihe ịrịba ọtụtụ ihe mejupụtara nke “ọgwụgwụ usoro ihe a,” nakwa na a ga-ekwusa ya “ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” (Mat. 24:3, 14) Mgbe ndị mmadụ na-ahụ anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ, ọ na-agbara ha ezi àmà. Mgbe anyị hapụrụ ebe ahụ, ụfọdụ ndị ka nwere ike ịnọ na-ekwu banyere ọbịbịa anyị ruo ọtụtụ awa ma ọ bụ ọtụtụ ụbọchị, ma ọ bụrụgodị na ha egeghị ntị n’ozi anyị. Anyị ịghọta ihe ndị mere anyị ji ezi ozi ọma na-enyere anyị aka ịnọgide na-ezi ya. Anyị na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ n’ihi na anyị so na-emezu amụma Baịbụl site n’ịgbara ndị mmadụ àmà na ịdọ ha aka ná ntị.—2 Tesa. 1:6-9.
3 Ọ Dị Anyị Mkpa Ịnọgide Na-ezi Ozi Ọma: Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe ndị na-adọpụ uche ndị mmadụ na ọtụtụ ihe na-eri oge ha, ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-agaghachi na nke mmadụ mgbe anyị na-achọ ime ka o nwekwuo mmasị. Ndịàmà gara na nke otu nwaanyị kwa izu ruo otu afọ tupu ya ekwe ka ha bata ụlọ bịa zie ya ozi sitere na Baịbụl. Ihe ọ nụrụ tọrọ ya ụtọ nke na o kwere ka ha mụwara ya Baịbụl, n’oge na-adịghịkwa anya, o kwuru na ya chọrọ ka e mee ya baptizim.
4 Ọnọdụ ụwa na-agbanwe n’ike n’ike, otú ahụkwa ka ndị mmadụ na-agbanwe. Ọtụtụ ndị jụrụ ige anyị ntị n’oge gara aga nweziri ike ịnabata ozi anyị na-enye olileanya ugbu a. Ya bụrụgodị na ọ bụ naanị otu onye ṅara ntị n’ozi Alaeze anyị na-ezi, ọ pụtara na ndidi anyị arụpụtala ihe.
5 N’ụwa niile, ọnụ ọgụgụ ndị “na-eze ume ma na-asụ ude n’ihi ihe arụ niile a na-eme” na-arị elu n’ike n’ike. (Ezik. 9:4) Ihe ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa na-arụpụta na-egosi na ndị nwere ezi obi na-anabata ozi Alaeze ahụ. (Aịza. 2:2, 3) N’ihi ya, ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma n’akwụsịghị akwụsị site n’iji ịhụnanya “na-eweta ozi ọma nke ihe ka mma.”—Aịza. 52:7; Ọrụ 5:42.