Ezinụlọ Gị Ọ̀ Na-akwado Ịlanahụ?
1 Amụma Baịbụl ndị mezurula emezu na-egosi nnọọ na ọgwụgwụ ụwa ọjọọ a na-eru nso n’ike n’ike. Anyị bizi n’oge tara akpụ nke yiri nnọọ nke ahụ e nwere tupu Iju Mmiri ahụ. (Mat. 24:37-39) Noa lanahụrụ mbibi nke ụwa oge ochie ahụ n’ihi na o “so ezi Chineke jee ije.” (Jen. 6:9) Ọ ga-abụrịrị na Noa kụziiri ezinụlọ ya ụzọ Jehova n’ihi na e chebekwara ha. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Noa ma kwadebe dị ka ezinụlọ ịlanahụ ọgwụgwụ nke ajọ ụwa a?
2 Onye Na-ekwusa Ezi Omume: Noa nọgidere na-ekwusa ozi Chineke ruo ihe dị ka afọ iri anọ ma ọ bụ iri ise dị ka “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Ọ ga-abụrịrị na ndị agbata obi ya chịrị ozi ya ọchị, ma ọ̀ bụ ndị mmụọ ozi nupụrụ isi kpaliri ha ma ọ bụ na ọ bụghị ha. Ka anyị nọ n’ozi anyị, anyị na-ezutekarị ndị na-akwa anyị emo na ndị na-enweghị mmasị na ya, bụ́ ihe na-egosi na ọgwụgwụ nke ụwa a na-eru nso. (2 Pita 3:3, 4) Otú ọ dị, n’adịghị ka ndị bi n’oge Noa, ọtụtụ ndị na-ege anyị ntị ma ‘na-enubata’ n’ofufe Jehova. (Aịza. 2:2) Naanị otú anyị ga-esi zọpụta ‘onwe anyị, zọpụtakwa ndị na-ege anyị ntị’ bụ ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. (1 Tim. 4:16) Ma n’okwu ma n’omume, ọ dị oké mkpa ka ndị mụrụ ụmụ kụziere ụmụ ha iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma!—2 Tim. 4:2.
3 O Mere “Nnọọ Otú Ahụ”: Ihe ga-eme ka a zọpụta Noa na ezinụlọ ya bụ ma ha jiri nlezianya mee ihe ndị Jehova gwara ha mee. (Jen. 6:22) Ọ dịkwa anyị mkpa taa ịdị “njikere irube isi” ná ntụziaka ndị sitere na Baịbụl nakwa n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. (Jems 3:17) Ụmụ torola eto n’otu ezinụlọ chetara otú nna ha si etinye aro ndị nzukọ Jehova tụrụ n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-eduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ kwa izu ma na-akpọ ezinụlọ ya aga ozi ọma n’ọgwụgwụ izu ọ bụla dị ka a tụrụ n’aro. Ọ na-agbalị ịhụ na ya na otu n’ime ụmụ ya so gaa ozi ọma n’izu ọ bụla. Otú o si nọgidesie ike na-eme “nnọọ otú ahụ” metụrụ ụmụ ya n’ahụ́, ha isii tolitekwara ghọọ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi.
4 Ọgwụgwụ nke ụwa a ga-abịa na mberede. (Luk 12:40) Ọ bụrụ na anyị eṅomie Noa ma nwee okwukwe maka nzọpụta, anyị na ezinụlọ anyị ga-adị nnọọ njikere!—Hib. 11:7.