Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite na June 9
Abụ nke 121
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche nke June 1 na Teta! nke April-June.
Nkeji 20: Otú Anyị Nwere Ike Isi Kwadebe Iduzi Ọmụmụ Baịbụl. Okwu dabeere n’Ozi Alaeze Anyị nke August 2004, peeji nke 1. Mgbe a tụlesịrị isiokwu ahụ, mee ihe ngosi ebe onye nkwusa nọ na-akwado ọkụ ọkụ otú ọ ga-esi eduzi ọmụmụ Baịbụl. Mezie ihe ngosi ọzọ ebe onye nkwusa nọ na-echebara aro ụfọdụ a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị echiche ka ọ na-akwado.
Nkeji 15: “Na-ekwusa Ozi Ọma n’Akwụsịghị Akwụsị.”a Dabere n’oge e nwere, jụọ ndị na-ege ntị ihe ndị dị n’amaokwu Baịbụl ndị a kpọtụrụ uche.
Abụ nke 201
Izu Na-amalite na June 16
Abụ nke 90
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa June. Chetara ndị na-ege ntị ka ha jiri Ụlọ Nche nke July 1 na Teta! nke April-June bịa Nzukọ Ije Ozi nke izu na-abịa abịa ma dị njikere ikwu otú e nwere ike isi nyefee ha n’ókèala unu.
Nkeji 15: Mee Ka Uru Ozi Ọma Bara Doo Anya. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke dabeere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 159. Jụọ ndị na-ege ntị ihe ndị na-enye ndị bi n’ókèala unu nsogbu n’obi ugbu a. Gwa ha ka ha tụọ aro ihe anyị nwere ike ikwu n’ozi ọma iji mee ka obi ruo ndị ụdị ihe a na-echegbu ala.
Nkeji 20: “Ezinụlọ Gị Ọ̀ Na-akwado Ịlanahụ?”b Dabere n’oge e nwere, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa ihe dị n’amaokwu Baịbụl ndị e zoro aka na ha.
Abụ nke 54
Izu Na-amalite na June 23
Abụ nke 140
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na July, ma mee otu ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee ya.
Nkeji 20: Ndị Ọrụ Ọsụ Ụzọ Oge Niile Mere Ka Ndụ Ha Na-atọkwu Ha Ụtọ! Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke January 15, 2008, peeji nke 17-19. Gbaa ndị ọsụ ụzọ oge niile abụọ ajụjụ ọnụ, otu ga-abụ onye ọsụ ụzọ ọhụrụ nke ọzọ abụrụ onye sụrụla ụzọ ruo ọtụtụ afọ, ma ọ bụrụ na unu nwere ndị dị otú ahụ. Jụọ ha otú ọrụ ọsụ ụzọ oge niile sirila mee ka ha nwee obi ụtọ ná ndụ.
Nkeji 15: Jikere Inyefe Magazin Ndị Ọhụrụ. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Mgbe ị kọwatụchara isi ihe ndị dị n’Ụlọ Nche nke July 1 na Teta! nke April-June, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo isiokwu ndị nke nwere ike ịmasị ndị bi n’ókèala unu, na ihe mere ha ji chee otú ahụ. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo kpọmkwem isi ihe ụfọdụ dị n’isiokwu ndị ahụ ha chọrọ iji enyefe magazin ndị ahụ. Olee ajụjụ e nwere ike iji malite nkwurịta okwu? Olee amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu ahụ bụ́ nke e nweziri ike ịgụ? Jiri aro ndị a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị, ma ọ bụ ndị nke ndị na-ege ntị tụrụ, mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla.
Abụ nke 82
Izu Na-amalite na June 30
Abụ nke 97
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ niile ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa June. Gwa ndị nkwusa ka ha jiri ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke March 2008, bụ́ “Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi,” bịa Nzukọ Ije Ozi nke izu na-abịa abịa.
Nkeji 20: Ụzọ Isi Mee Ka Nkà Inwe Mkparịta Ụka Anyị Ka Mma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke dabeere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 62, paragraf nke 4 ruo n’ọgwụgwụ peeji nke 64. Kwuo otú e nwere ike isi mee ya n’ókèala unu. Jiri nkeji ole na ole gbaa otu onye nkwusa ajụjụ ọnụ, bụ́ onye a maara na ọ na-enwe ike ime ka ndị mmadụ soro ya kparịta ụka mgbe ọ nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ mgbe ọ na-agba àmà n’oge ọ na-anọghị n’ozi.
Nkeji 15: Ì Chetara? Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle nke ga-adabere n’Ụlọ Nche April 15, 2008, peeji 29.
Abụ nke 179
Izu Na-amalite na July 7
Abụ nke 125
Nkeji 5: Ịma ọkwa ọgbakọ.
Nkeji 20: Jiri Akwụkwọ Yearbook 2008 Mee Ihe Nke Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Tụlee “Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi,” bụ́ ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke March, 2008. Gwa mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ n’ime ndị na-ege ntị ka onye nke ọ bụla n’ime ha kọọ otu ahụmahụ sitere na Yearbook, bụ́ nke kasị gbaa ha ume. Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ kwuo ndokwa ha merela n’onwe ha iji gụọ Yearbook. Mechie site n’ịgba mmadụ niile ume ịgụcha akwụkwọ ahụ.
Nkeji 20: “Ihe Ị Ga-eme Mgbe Onye Nwe Ụlọ Na-asụ Asụsụ Ọzọ.”c Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Mgbe a na-atụle paragraf nke 2, gwa ọgbakọ unu ọgbakọ ndị na-asụ asụsụ ọzọ na-ekwusakwa ozi ọma n’ógbè unu. Kwuo ndokwa ọ bụla e mere iji hụ na ìgwè ma ọ bụ ọgbakọ ndị na-asụ asụsụ dị iche iche n’ógbè unu na-arụkọ ọrụ ọnụ.
Abụ nke 188
[Ihe odide ala ala peeji]
a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.