Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/07 p. 4
  • Ihe Mere Anyị Ji Agaghachi Ugboro Ugboro

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Anyị Ji Agaghachi Ugboro Ugboro
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Anyị Arụọla Ókèala Anyị Ọtụtụ Ugboro!”
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Gịnị Mere A Ga-eji Nọgide Na-eme Nkwusa?
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Anọgide Na-alaghachi?
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Adakwala Mbà n’Ozi Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 7/07 p. 4

Ihe Mere Anyị Ji Agaghachi Ugboro Ugboro

1. Olee ajụjụ a na-ajụ banyere otú anyị si arụ ọrụ nkwusa anyị?

1 N’ọtụtụ ebe, anyị na-arụzu nnọọ ókèala anyị ugboro ugboro. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị anyị gaburu na nke ha agwala anyị na ha enweghị mmasị, anyị anaghị akwụsị ịga na nke ha. Gịnị mere anyị ji anọgide na-aga na nke ndị anyị gaburula na nke ha, bụ́ ndị na-achọghị ige ntị n’ozi anyị?

2. Olee isi ihe mere anyị ji anọgidesi ike n’ozi anyị?

2 Anyị Hụrụ Jehova na Ndị Mmadụ n’Anya: Isi ihe mere anyị ji anọgidesi ike n’ozi anyị bụ n’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya. Obi anyị na-akwali anyị ịnọgide na-agwa ndị ọzọ banyere Chineke anyị dị ukwuu. (Luk 6:45) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-akpali anyị irube isi n’iwu ya, ọ na-akpalikwa anyị inyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ. (Ilu 27:11; 1 Jọn 5:3) Ihe mere anyị ji anọgide na-ekwusa ozi ọma abụghị n’ihi na ndị mmadụ gere anyị ntị ma ọ bụkwanụ n’ihi na ha egeghị anyị ntị. Ọbụna mgbe a kpagburu Ndị Kraịst narị afọ mbụ, ha nọgidere na-ekwusa ozi ọma “n’esepụghị aka.” (Ọrụ 5:42) Anyị agaghị eselata aka n’ikwusa ozi ọma n’ihi na ndị mmadụ jụrụ ige anyị ntị, kama nke ahụ, anyị ga-anọgidesi ike na-egosipụta na anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu nakwa na ọ bụ ya ka anyị na-efe ofufe.

3. Olee otú ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ ga-esi nyere anyị aka ịnọgide na-ekwusara ha ozi ọma?

3 Ihe ọzọ mere anyị ji anọgidesi ike n’ozi anyị bụ n’ihi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya. (Luk 10:27) Jehova achọghị ka e bibie onye ọ bụla. (2 Pita 3:9) Ọbụna n’ókèala anyị na-arụkarị ọrụ na ya, anyị ka na-achọtakwa ndị chọrọ ijere Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, n’agwaetiti Guadeloupe, bụ́ ebe otu onye n’ime mmadụ 56 ọ bụla bi na ya bụ Onyeàmà Jehova, e mere narị mmadụ abụọ na iri na anọ baptizim n’afọ gara aga. N’afọ ahụkwa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri puku mmadụ abụọ bịara n’anyasị a na-echeta ọnwụ Jizọs. Nke a pụtara na ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ 22 ọ bụla bi n’agwaetiti ahụ, bịara!

4. Olee mgbanwe ndị a na-enwe n’ókèala anyị?

4 Mgbanwe Ndị A Na-enwe n’Ókèala Anyị: Ọ bụghị otu ndị ka anyị na-ezute n’ókèala anyị mgbe nile. Mgbe ọzọ anyị gaghachiri n’ebe a na-egeghị anyị ntị, onye òtù ezinụlọ ahụ—ma eleghị anya, onye na-anụtụbeghị ozi anyị—nwere ike ịnabata anyị ma gee anyị ntị. Ma ọ bụkwanụ, anyị nwere ike ịhụ ndị kwabatara ọhụrụ, bụ́ ndị ga-achọ ige anyị ntị. Ụmụaka ndị ndị mụrụ ha na-adịghị ekwe ege anyị ntị na-emecha tolite ma kwaga ebe ọzọ. Ndị dị otú ahụ nwere ike ịchọ ịnụ ozi Alaeze ahụ.

5. Olee ihe ndị nwere ike ime ka ndị na-adịbughị ege anyị ntị gewezie anyị ntị?

5 Àgwà ndị mmadụ na-agbanwekwa. Pọl onyeozi bụbu “onye nkwulu na onye mkpagbu na onye na-akparị mmadụ.” (1 Tim. 1:13) N’otu aka ahụkwa, ọtụtụ ndị na-ejere Jehova ozi taa enwebughị mmasị n’eziokwu ahụ. O nwedịrị ike ya abụrụ na ụfọdụ n’ime ha nwere mgbe ha megidere ndị bịara izi ha ozi ọma. Ka ọnọdụ ụwa na-agbanwe, ụfọdụ ndị na-emegide anyị ma ọ bụ ndị na-adịghị ege anyị ntị nwere ike mechaa gewe anyị ntị. Ndị ọzọ nwere ike bịa nwewe mmasị n’ozi anyị n’ihi ọdachi dakwasịrị ha, dị ka ọnwụ nke onye òtù ezinụlọ ha, ịbụ onye a chụrụ n’ọrụ, ụkọ ego, ma ọ bụ ọrịa.

6. Gịnị mere anyị kwesịrị iji hụ na anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?

6 Ụwa ochie a na-abịa ná ngwụsị ya, ma ọrụ ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ Bible na-aga n’ike n’ike. (Aịsa. 60:22) Ya mere, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, ma na-agbalịsi ike ịdị na-ele ndị anyị na-ekwusara ya anya dị ka ndị ga-anabata ya. Ọ bụrụ na onye mbụ ajụ ozi anyị, onye nke ọzọ nwere ike ige anyị ntị. Ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-ekwusa ozi ọma! ‘Site n’ime nke a, anyị ga-azọpụta ma onwe anyị ma ndị na-ege anyị ntị.’—1 Tim. 4:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya