“Anyị Arụọla Ókèala Anyị Ọtụtụ Ugboro!”
1 Ọ̀ dịtụwo mgbe i chere na a na-arụkarị ọrụ n’ókèala unu nke na e nwekwaghị ndị yiri atụrụ fọdụrụ n’ime ya? Ma eleghị anya i chewo, sị: ‘Ama m otú ndị mmadụ ga-esi meghachi omume. Gịnị mere anyị ga-eji nọgide na-agaghachi na nke ndị na-enweghị mmasị?’ Ọ bụ eziokwu na a na-arụ ọrụ n’ọtụtụ ókèala ugboro ugboro. Otú ọ dị, e kwesịrị ile eziokwu a anya n’ụzọ ziri ezi, ọ bụghị n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ihi gịnị? Rịba ama ihe anọ e kwuru n’okpuru ebe a kpatara ya.
2 A Zawo Ekpere Anyị: Jisọs kwuru, sị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole: ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” (Luk 10:2) Anyị anọwo na-arịọ Jehova eri ọtụtụ iri afọ ka anyị nwetakwuo enyemaka. N’ọtụtụ ebe, anyị enwewo ugbu a ndị ọrụ ahụ anyị chọkwuru, anyị na-arụzukwa ókèala anyị ugboro ugboro karị. Ọ̀ bụ na eziokwu ahụ bụ́ na Jehova azawo ekpere anyị ekwesịghị ime ka anyị na-aṅụrị ọṅụ?
3 Nnọgidesi Ike Na-amịpụta Ezi Mkpụrụ: Ọbụna n’ókèala ndị a na-arụkarị ọrụ na ha, ndị mmadụ na-aṅa ntị n’ozi Alaeze ahụ, ha na-amụtakwa eziokwu ahụ. Ya mere, anyị kwesịrị ịnọgide na-aga ugboro ugboro n’olileanya nke ịchọta ndị nwere obi eziokwu. (Aịsa. 6:8-11) Dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs n’oge mbụ mere, nọgidenụ ‘na-ejekwuru’ ndị mmadụ nọ n’ókèala e kenyere unu, na-agbalịsi ike ịkpasu mmasị ha n’Alaeze Chineke.—Mat. 10:6, 7.
4 Na Portugal ọtụtụ ọgbakọ na-arụzu ókèala ha kwa izu, ma ha ka na-achọta ndị yiri atụrụ. Otu nwanna nwanyị kpọmkwem nwere nnọọ echiche ziri ezi. O kwuru, sị: “Tupu mụ agawa ozi kwa ụtụtụ, ana m ekpe ekpere gwa Jehova ka o nyere m aka ịchọta onye nwere mmasị ịmụ Bible.” Otu ụbọchị o mere ndokwa iso ndị na-arụ ọrụ n’ebe a na-edozi isi mụọ ihe. Otú ọ dị, ka e mesịrị, ọ bụ nanị otu onye bịara maka ọmụmụ ihe ahụ. Onye ahụ kwuru, sị: “Ndị nke ọzọ enweghị mmasị, ma enwere m.” Mgbe ọ na-erule otu ọnwa, ọ nọ na-eduzi ọmụmụ Bible abụọ ndị nke ya. N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, e mere ya baptism, o mesịkwara banye n’ozi ọsụ ụzọ!
5 A Na-arụzu Ọrụ Ahụ: A na-ekwusa ozi ọma ahụ dị nnọọ ka Jisọs buru n’amụma na a ga-ekwusa ya. (Mat. 24:14) Ọbụna n’ebe ndị mmadụ ‘na-achọghị ige anyị ntị,’ a na-adọ ha aka ná ntị site n’ọrụ nkwusa ahụ. Anyị na-atụ anya na ụfọdụ agaghị aṅa ntị ma ọ bụ ọbụna na ha ga-emegide eziokwu ahụ. Ma, a ghaghị ịdọ ndị dị otú ahụ aka ná ntị banyere ikpe na-abịanụ site n’aka Jehova.—Ezik. 2:4, 5; 3:7, 8, 19.
6 Anyị Arụsịbeghị Ọrụ Ahụ: Ọ dịghịrị anyị ikpebi mgbe anyị ga-akwụsị ọrụ nkwusa ahụ. Jehova maara kpọmkwem mgbe o kwesịrị ịkwụsị. Ọ maara ma e nwere ndị nọ n’ókèala anyị ndị ka pụrụ ịṅa ntị n’ozi ọma ahụ. Taa, ụfọdụ ndị na-ekwu na ha enweghị mmasị, ma oké mgbanwe weere ọnọdụ ná ndụ ha—ịchụ n’ọrụ, ọrịa siri ike, ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya—pụrụ ime ka ha nwee ọchịchọ ige ntị karị n’oge ọzọ. N’ihi ajọ mbunobi ma ọ bụ nanị n’ihi na ha enweghị ohere ige ntị, ọtụtụ anụtụbeghị n’ezie ihe anyị na-ekwusa. Ịgaghachi ugboro ugboro dị ka enyi pụrụ ime ka ha rịba ya ama ma gee ntị.
7 Ndị tolitere n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị nwekwara ezinụlọ nke ha ugbu a na-eji ndụ akpọrọ ihe karị ma na-ajụ ajụjụ ndị ọ bụ nanị Okwu Chineke pụrụ ịza. Otu nne na-akatabeghị ahụ kpọbatara Ndịàmà abụọ n’ụlọ ya ma kwuo, sị: “Mgbe m bụ nwata, enweghị m ike ịghọta ihe mere nne m ji achụpụ Ndịàmà ma na-agwa ha na ya enweghị mmasị, ebe ọ bụ na ihe ha chọrọ ime bụ nanị ikwu maka Bible. Ekpebiri m na mgbe m tolitere, lụọ di, nweekwa ebe obibi nke m, m ga-akpọ Ndịàmà Jehova ka ha bịa kọwaara m Bible.” Nke ahụ bụ ihe o mere, n’ụzọ nyere Ndịàmà ahụ kpọtụụrụ ya obi ụtọ.
8 Ị̀ Pụrụ Ịdị Irè Karị? O nwere ike ọ gaghị abụ ndị anyị na-akpọtụrụ na-eme mgbe nile ka o yie ihe siri ike ịrụ ọrụ n’ókèala ahụ ugboro ugboro. Mgbe ụfọdụ ọ bụ anyị onwe anyị. Ànyị na-eji echiche ndị na-ezighị ezi amalite? Nke ahụ pụrụ imetụta àgwà anyị nakwa ụda olu na ọdịdị ihu anyị ma eleghị anya. Nwee obi ike na ọdịdị ihu dị mma. Nwalee ụzọ njekwu ọhụrụ. Na-agbanwe ụzọ i si eche ihe n’ihu mmadụ, gbalịsiekwa ike imeziwanye ya. Ikekwe ị pụrụ itinye ajụjụ i ji amalite okwu gị n’ụzọ ọzọ ma ọ bụ webata akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche ná mkparịta ụka ahụ. Jụọ ụmụnna nwoke na nwanyị ndị ọzọ ihe ha chọpụtaworo na-adị irè n’ịrụ ọrụ n’ókèala ahụ. Soro ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ dị iche iche jee ozi, rịbakwa ama ihe na-eme ka ozi ha dị irè.
9 Jehova na-akwado ma na-agọzi ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, anyị ikerekwa òkè na ya na-egosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ nakwa n’ebe ndị agbata obi anyị nọ. (Mat. 22:37-39) Ya mere, ka anyị rụọ ọrụ anyị ruo ná njedebe, n’enweghị ike ọgwụgwụ n’ịrụ ókèala anyị ugboro ugboro.