Gịnị Mere A Ga-eji Nọgide Na-eme Nkwusa?
1 À rụwo ọrụ nkwusa Alaeze ahụ ruo ogologo oge n’ógbè gị? (Mat. 24:14) Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ iche na a rụwo ọrụ n’ókèala ọgbakọ gị nke ọma. Ugbu a, mgbe ị na-eme nkwusa, ikekwe ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị ị na-ezute yiri ka ha enweghị mmasị n’ozi Alaeze ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, rịba ama ihe e kwuru banyere ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs na peeji nke 141 nke akwụkwọ Amụma Aịsaịa II: “N’ebe ụfọdụ, ihe ndị ha na-arụpụta n’ozi ha pụrụ iyi ka ọ dị ntakịrị ma e jiri ya tụnyere ọrụ ha na mgbalị ha tinyere. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-atachi obi.” Ma gịnị mere a ga-eji nọgide na-eme nkwusa?
2 Cheta Jeremaịa: Anyị iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi n’ọrụ nkwusa ahụ ekwesịghị ịdabere na ma ndị mmadụ hà gere anyị ntị ma ọ bụ na na ha egeghị. Jeremaịa mere nkwusa ruo afọ 40 n’otu ókèala n’agbanyeghị na ọ bụ nnọọ mmadụ ole na ole gere ya ntị, ọtụtụ ndị megidekwara ozi ya. Gịnị mere Jeremaịa ji nọgidesie ike? Ọ bụ n’ihi na ọ nọ na-arụ ọrụ Chineke nyere ya iwu ka ọ rụọ, ya ịma ihe gaje ime n’ọdịnihu kpalikwara ya ịnọgide na-eji obi ike ekwu okwu.—Jer. 1:17; 20:9.
3 Ọnọdụ anyị yiri nke ahụ. Jizọs “nyere anyị iwu ime nkwusa nye ndị mmadụ na ịgba àmà nke ọma na onye a bụ Onye ahụ Chineke kpebiri na ọ ga-abụ onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.” (Ọrụ 10:42) Ozi anyị na-ezisa bụ nke metụtara ndụ na ọnwụ nye ndị na-anụ ya. A ga-ekpe ndị mmadụ ikpe dabere n’ụzọ ha si meghachi omume n’ebe ozi ọma ahụ dị. Ebe ọ dị otú ahụ, ibu ọrụ anyị bụ ime kpọmkwem ihe e nyere anyị n’iwu ime. Ọbụna mgbe ndị mmadụ jụrụ ige ntị, nke a na-enye anyị ohere igosipụta ókè ịhụnanya anyị nwere n’ebe ha nọ miruru emi, nakwa ókè nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova ruru site n’ịnọgide na-eme ihe anyị na-aghaghị ime. Ma, a ka nwere ihe ọzọ.
4 Anyị Na-erite Uru: Ime uche Chineke, n’agbanyeghị mmeghachi omume e nwere n’ókèala anyị, na-eme ka anyị nwee obi iru ala, afọ ojuju, na obi ụtọ, bụ́ nke a na-apụghị inweta n’ụzọ ọ bụla ọzọ. (Ọma 40:8) Ndụ anyị ga-enwe ezi nzube. Ka anyị na-ekerekwu òkè n’ozi, otú ahụ ka obi na uche anyị na-adịkwasịkwu n’olileanya na ọṅụ nke ịdị ndụ n’ụwa ọhụrụ Chineke. Ịtụgharị uche ná nkwa ndị a dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na-eme ka ọnọdụ ime mmụọ anyị ka mma ma mee ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike.
5 Ọ bụrụgodị na anyị ahụghị ihe ndị si n’ọrụ nkwusa anyị pụta ozugbo, a pụrụ ịkụnyewo mkpụrụ nke eziokwu n’obi mmadụ bụ́ nke ga-epu n’oge Jehova. (Jọn 6:44; 1 Kọr. 3:6) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị maara ọnụ ọgụgụ mmadụ ka ga-amụta banyere Alaeze ahụ site ná mgbalị nke ndị Jehova na-eme, n’ógbè anyị ma ọ bụ gburugburu ụwa.
6 Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, anyị kwesịrị ige ntị ná ntụziaka Jizọs bụ́: “Nọgidenụ na-ele anya, nọgidenụ na-amụ anya, n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ. Ma ihe m na-agwa unu ka m na-agwa mmadụ nile, Nọgidenụ na-eche nche.” (Mak 13:33, 37) Ya mere, ka anyị nile nọgidezie na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ, na-eme ka obi Jehova ṅụrịa ka anyị na-ekere òkè n’ido aha ukwu ya nsọ.