N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Anọgide Na-alaghachi?
1 Ị̀ jụtụwo onwe gị ajụjụ ahụ, ikekwe ka ị na-akwadebe maka ụbọchị ije ozi? N’ógbè ụfọdụ ebe a na-arụzu ókèala anyị ugboro ugboro, ndị nwe ụlọ pụrụ ịmata ndị anyị bụ, ha na-achụpụkwa anyị ngwa ngwa. Nanị ole na ole pụrụ ịzaghachi n’ụzọ dị mma. Ma e nwere ọtụtụ ihe ndị siri ike mere anyị ji anọgide na-alaghachi.
2 Nke mbụ, e nyere anyị iwu ịnọgide na-ekwusa ozi Alaeze ahụ ruo mgbe ọgwụgwụ ga-abịa. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Aịsaịa onye amụma jụrụ ogologo oge ọ ga-anọgide n’ọrụ nkwusa ya. E dekọrọ azịza o nwetara n’Aịsaịa 6:11. Ihe ịrụ ụka adịghị ya—a gwara ya ka ọ nọgide jiri ozi Chineke alaghachikwuru ndị ahụ. N’otu aka ahụ taa, ọ bụ ezie na ha pụrụ ịchụpụ anyị, Jehova na-atụ anya ka anyị nọgide na-akpọtụrụ ndị bi n’ókèala anyị. (Ezik. 3:10, 11) Nke a bụ ibu ọrụ dị nsọ nke e nyefeworo anyị.—1 Kọr. 9:17.
3 Ihe ọzọ mere anyị ga-eji nọgide na-alaghachi bụ na nke a na-enye anyị ohere igosi ịdị omimi nke nsọpụrụ anyị nye Jehova. (1 Jọn 5:3) E wezụga nke ahụ, mgbe anyị na-atụgharị uche n’ihe ọdịnihu ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ, olee otú anyị pụrụ isi jighachi onwe anyị pụọ n’iji ịhụnanya na-agbalị ịdọ ndị agbata obi anyị aka ná ntị? (2 Tim. 4:2; Jes. 2:8) Anyị ikwesị ntụkwasị obi n’ịrụzu ọrụ anyị na-enye ọtụtụ ohere ka ha zaghachi n’ozi Chineke nke nzọpụta, ka ha wee ghara inwe ike ikwu na a dọghị ha aka ná ntị.—Ezik. 5:13.
4 Ọzọkwa, anyị adịghị ama mgbe mmadụ ụfọdụ ga-enwe mgbanwe obi. Ọ pụrụ ịbụ nke mgbanwe n’ọnọdụ ha, ọdachi n’ime ezinụlọ ha, ma ọ bụ ọnọdụ ụwa, nke na-eme ka ha chesie echiche ike banyere ọdịnihu ha, kpalitere. N’aka nke ọzọ, ihe anyị kwuru n’ọnụ ụzọ ha pụrụ ịkpalite mmeghachi omume dị mma. (Ekli. 9:11; 1 Kọr. 7:31) Ọzọ, ndị mmadụ na-akwagharị. Anyị pụrụ ịchọta ndị ọhụrụ bi n’ókèala anyị bụ́ ndị ga-azaghachi n’ozi ọma ahụ—ikekwe ndị ntorobịa bụ́ ndị biiri onwe ha ugbu a ma na-echesi echiche ike banyere nzube ha ná ndụ.
5 Ànyị ga-anọgide na-alaghachi? Ee! Akwụkwọ Nsọ na-enye anyị ihe mkpali bara ụba iji laghachikwuru ndị mmadụ ugboro ugboro. N’ikpeazụ, mgbe a rụzuru ọrụ nkwusa ahụ, Jehova ga-agọzi anyị n’ihi mgbalị anyị nọgidere na-etinye n’ozi ahụ, ọ ga-agọzikwa ndị ahụ ji obi ekele zaghachi n’ozi ọma Alaeze ahụ.—1 Tim. 4:16.