Nọgide Na-eme Nkwusa!
1 Ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) N’ihi nke a, o nyewo anyị ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ. (Mat. 24:14) Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe mere anyị kwesịrị iji nọgide na-eme nkwusa, nkụda aka ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla pụrụ ịkpata ndọpụ uche anyị zutere agaghị egbochi anyị.
2 N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nọgidesie Ike? E nwere ọtụtụ ihe ndọpụ uche dị n’ụwa bụ́ ndị na-eme ka ndị mmadụ chefuo ihe anyị na-agwa ha ma ọ bụ leghara ha anya. Ya mere anyị aghaghị ịnọgide na-echetara ha ozi nzọpụta nke Chineke. (Mat. 24:38, 39) Tụkwasị na nke a, ọnọdụ ndụ ndị mmadụ na-agbanwe mgbe nile. Ọbụna ọnọdụ ụwa pụrụ ịgbanwe kpam kpam na mberede. (1 Kọr. 7:31) Echi, n’izu ọzọ, ma ọ bụ n’ọnwa ọzọ, ndị anyị na-ezi ozi ọma pụrụ izute nsogbu ma ọ bụ nchegbu ndị ọhụrụ bụ́ ndị ga-eme ka ha chesie echiche ike banyere ozi ọma anyị na-ewetara ha. Ọ̀ bụ na i nweghị ekele na Onyeàmà nke wetaara gị eziokwu ahụ nọgidesiri ike na-abịa?
3 Iji Ṅomie Ebere Chineke: Jehova ejiriwo ndidi nye oge tupu ọ na-emezu ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ndị ajọ omume. Site n’aka anyị ọ nọgidewo na-arịọ ndị obi ha ziri ezi ichigharịkwute ya ma bụrụ ndị a zọpụtara. (2 Pita 3:9) Anyị ga-abụ ndị ikpe ọbara mara ma ọ bụrụ na anyị ekwusaghịrị ndị mmadụ ozi obi ebere Chineke ma dọọ ha aka ná ntị banyere mmezu na-abịanụ nke ikpe Chineke n’ahụ ndị nile na-echegharịghị site n’ụzọ ọjọọ ha. (Ezik. 33:1-11) Ọ bụ ezie na a dịghị anabata ozi anyị nke ọma mgbe nile, anyị agaghị ala azụ ma ọlị n’ime mgbalị nile anyị nwere ike ime iji nyere ndị obi ha ziri ezi aka inwe ekele maka oké ebere Chineke.—Ọrụ 20:26, 27; Rom 12:11.
4 Iji Gosipụta Ịhụnanya Anyị: Ọ bụ Jehova Chineke, site n’aka Jisọs Kraịst, nyere iwu na a ga-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụwa nile. (Mat. 28:19, 20) Ọbụna mgbe ndị mmadụ jụrụ ige ntị, anyị nwere ohere nke igosipụta ịhụnanya na nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke site n’ịnọgidesi ike n’ime ihe ziri ezi.—1 Jọn 5:3.
5 Ka anyị kpebisie ike ịnọgide na-eme nkwusa! Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eme otú ahụ mgbe ọ ka bụ “ụbọchị nzọpụta” Jehova.—2 Kọr. 6:2.