Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/07 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na February 12
  • Izu Na-amalite na February 19
  • Izu Na-amalite na February 26
  • Izu Na-amalite na March 5
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 2/07 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na February 12

Abụ nke 52

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa February. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche February 15 na Teta! January–March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi otú a ga-esi zaghachi mgbe onye nwe ụlọ kwuru, sị, “Enweghị m mmasị n’okpukpe.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 9.

Minit 15: “Ndị E Nyere Akụ̀ Ka Ha Lekọta.”a Ruo ókè oge kwere mee, mee ka otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ kọọ ahụmahụ ha nwetara n’onwe ha.

Minit 20: Kwadebe Maka Ikesa Akụkọ Alaeze nke 37. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Tụleghachi ndokwa ndị e mere maka ikesa Akụkọ Alaeze ahụ dị ka e kwuru ya n’Ozi Alaeze Anyị nke January. Gbaa mmadụ nile ume iji ịnụ ọkụ n’obi kesaa ya. Gbaa ndị nwere ndị ha na-amụrụ ihe, bụ́ ndị ọmụmụ ihe ha na-aga nke ọma, ume ka ha lee ma ndị ha na-amụrụ ihe hà ruru eru iso kesaa Akụkọ Alaeze a dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ndị mụrụ ụmụ nwekwara ike ịtụle ma ụmụ ha hà ruru eru iso. N’ụzọ dị mkpirikpi, kwuo ihe ndị a chọrọ n’aka mmadụ tupu ya eruo eruo ịbụ onye nkwusa, bụ́ nke dị na peeji nke 79-82 nke akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.

Abụ nke 104 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na February 19

Abụ nke 198

Minit 5: Ịma ọkwa ọgbakọ.

Minit 20: “Ṅomie Onye Ozizi Ukwu ahụ Mgbe Ị Na-eji Akwụkwọ Bible Na-akụzi Ezi Ihe.”b Mgbe a na-atụle paragraf nke 6, mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke ebe onye nkwusa ji igbe dị ná ngwụsị isi nke 6 nke akwụkwọ Bible Na-akụzi soro onye ọ na-amụrụ ihe na-atụleghachi ihe e kwuru n’isiakwụkwọ ahụ.

Minit 20: “Na-agbaso Ihe Nlereanya Kraịst Setịpụrụ n’Ihe Banyere Ikwusa Ozi Ọma.”c Ruo ókè oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha ma kọwaa ha.

Abụ nke 220 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na February 26

Abụ nke 29

Minit 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche March 1 na Teta! January–March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe onye nkwusa na-eje ozi n’ógbè a na-azụ ahịa. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa February.

Minit 15: “Echefula Ndị Na-adịghị Ejekwa Ozi.”d Gụnye ihe dị n’Ụlọ Nche May 1, 2004, peeji nke 21-22, paragraf nke 13-16.

Minit 15: Ikwusa Ozi Ọma n’Ụzọ Dị n’Usoro. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere n’akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, malite n’isiokwu nta dị na peeji nke 102 ruo ná ngwụsị nke isiakwụkwọ ahụ.

Abụ nke 18 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na March 5

Abụ nke 32

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Nye ndị nile na-ege ntị otu akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche maka Ememe Ncheta ma tụleghachi ndokwa ọgbakọ unu mere maka ikesa ya n’ókèala unu. Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè zuru ezu na ya. Mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke otú a pụrụ isi nye mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ.

Minit 35: “Kpọsaa Ịdị Mma Jehova n’Ebe Nile.”e Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. N’oge dabara adaba mgbe ihe omume a na-aga n’ihu, maa ọkwa oge na ebe a ga-eme Ememe Ncheta, ndokwa ndị e mere maka inwekwu nzukọ ije ozi ubi n’oge ndị ọzọ na-abụghị oge a na-enwebu ha, nakwa ndị ọsụ ụzọ inyeaka ole ọgbakọ unu na-atụ anya inweta n’ọnwa April. Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 3, mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke ebe onye nkwusa na-akpọ onye ọ na-aga nletaghachi na nke ya òkù ịbịa Ememe Ncheta.

Abụ nke 147 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya